Igbo Presidency 2023: Anyị jikọta ọnụ o nweghị ihe anyị agaghị emenwu na ndọrọndọrọ ọchịchị - Kenneth Okonkwo

Aha onyonyo, Igbo Presidency 2023: Ọ bụrụ na anyị jikoo ọnụ enweghị onye ga-akpagbu anyị
Mgbe e biputara ya

Kenneth Okonkwo bụ onye na-eme ihe ejije ama ama ma bụrụ kwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuola uche ya maka ọnọdụ ndị Igbo na Naijirịa.

Okonkwo kwuru na ebe ndị Igbo siri ike bụ mgbe ha dị n'otu were ofu obi na-eme ihe ọbụla.

O kwuru na nke a ga-eme ka ndị ọzọ ghara ị na-akpagbu ha.

Ọ sị na, Ihe na-enye mmadụ ike karịa ihe ndị ọzọ bụ udo na ijikọta ọnụ, maka na ọ bụ mmadụ ka e ji aka na ndọrọndọrọ ọchịchị".

Agbanyeghị nka, ọ bụrụ na nkewa dị n'etiti ya bụ mmadụ e ji aka, ndị ahụ agaghị enweike imeri ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla.

Okonkwu kụwara akịoyibo nsugbe sị na ị kwụ na "Igbo siri na mmadụ ma abịa n'ihe ana eme ofu ofu, mana abịa n'ihe a ga-eejikọ ọnụ, ị nwete ọdịda ha".

O chetere ihe ụfọdụ ndị igbo na-ekwu sị na anaghị akwụ n'ahịri akpata ego.

Ọ sị na ya bụ okwu abụghị eziokwu na Ndọrọndọro ọchịchị maka na ọ bụ na ahịri ka e ji azọta ike na ndọrọndọrọ ọchịchị.

O kwuru na nkewa Igbo na-ekewa bụ ya bụ isi sekpụ ntị n'ebe Igbo nọ.

Na ọ bụru na Igbo e jikọta ọnụ, na ọnweghị onye pụrụ imegbu ha.

Mana ọ bụrụ na ha ejikọtaghị onụ, "a ga-anara ụnụ nke ruuru unu nye ndị jikọtara ọnụ".

O sị na ọ bụ Igbo ji onwe ha, o nweghị onye ji ha.

Ọ kwụrụ na ọbụghị Igbo kacha nta na Naịjirịa, mana na e werela ihe Igbo nye ndị ahụ kacha nta maka na ha jikọtara ọnụ.

O kwukwara na Chineke ga-enye ndị Igbo ndị ga-aghọta uru ijikọọnụ bara bụ ndị ga-enye aka mee ka Igbo dị n'otu.

Ọ sị, "ọ bụ ya mere m ji apụta ndọrọndọrọ ọchịchị".

Kedụ ndị bụ ndị Igbo?

Igbo bụ agbụrụ bị na ọdịda ọnwụnwa anyanwụ Naịjirịa na West Afrịca.

Asụsụ ha bụ Igbo.

Ha sọ na agbụrụ kacha ibu na Naịjirịa.

Ha nọkarị na steeti Abia, Anambra Ebonyi, Enugu na Imo.

Ụfọdụ n'ime ha nọkwa na Delta nakwa River steeti, mana ha gbasara ụwa niile.

Ọtụtu n'ime bụ ndị na-azụ ahịa.

Ha nwekwara ndị ọrụ ugbo na ndị ọrụaka dị iche iche.

Kemgbe alụcharra agha Naịjirịa na Biafra na Jenụwarị 15 1970, ọnwebeghị onye Igbo chịrị Naịjirịa agbanyeghị mba ha na agba.

Maka nke a ndị igbo na-ekwu na a na-akpagbu na Naịjirịa nke mere ụmụntorobịa jikwere malite ịkpọ oku ka Igbo si Naịjirịa pụọ.

Ọnwekwere otu ndị ọzọ na-achọkwa mnwere ọnwe ndị Igbo dịka ndị Lower Niger Congress LNC, Nigerian Indigenous Nationalities Alliance for Self-Determination, NINAS, Biafra Defacto Government na ndị ọzọ.

Ugbua, ọtụtụ ndi achọghị otu ndị otu abụọ a sị achụ nwereonwe, sị na chọrọ ka Igbo nọro na Naịjirịa mana ka e nye ha ohere iche mba ahụ.

Dịka ndọrọndọrọ Onyeisiala Naịjirịa na-abịa nsọ na 2023, onu ndị di otu a na-arị elụ kwa ụbọchị.

Ndị chọrọ mwereonwe ekwuola ugboro ugboro na ha achọghị ka ndị Igbo soro na ndọrọndọro ọchịc Naịjirịa.

Mana ndị ọzọ chena ọ bụrụ na Naijrịa nwe ndi Igbo ohere ị bụ onyeisiala Naịjirịa na mkpụ ụfọdụ na-eti maka mkpagbu ga-ebelata.

Onye bụ Kenneth Arinzechukwu Okonkwu?

Kenneth Arinzechukwu Okonkwo bụ nwafọ Igbo, onye Nsukka dị n'Enugu steeti.

Ọ bụ onye na-eme ihe onyonyo nke eji echetakarị ya bụ nke ọ mere na Living in Bondage ebe ọ zara Andy Okeke na 1992.

Ọ gara akwụkwọ na University of Nigeria Nsukka ebe ọ gụrụ Business Administration.

Mechaa gụọ Master Degree na International Law and Diplomacy na University of Lagos.

Ọ nwetere ọtụtụ nturuugo n'ọrụ ejije.

Ọ nwetakwara nturuụgọ gọọmentị Naịjirịa nke a kpọrọ Member of the Order of the Federal Republic (MFR).

Okonkwo banyere ndọrondọrọ ọchịchị na 2014 mgbe o ji ọkọlọtọ People's Democratic Party, PDP, zọọ ọkwa nnọchite anya ndị Nsukka/Igboeze South Federal Constituency.

Lee ihe ndị ọzọ o kwuru n'onyonyo a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: