Aka akparala otu n'ime ndị a sị gburu onye uweojii n'Oguta, Imo Steetị
Ndị uweojii Imo Steeti sị na ha nwuchiela otu n'ime ndị gburu Chistian Kpatuma bụbu onye uweojii n'obodo Agwa dị n'Oguta, Imo Steeti.
Michael Abattam bụ ọnụ na-ekwuru sị na onye e jidere bụ onyeisi ndị otu nzuzo a sị gburu Kpatuma.
Ọ sị na ha wuchiri obodo Mgbala ma malite ime nyocha nke mere e ji nwuchie otu nwokoroọbịa bụkwa onye obodo Mgbala dịka ọ chọrọ ịgba ọsọ.
Abattam sị na nyocha gosiri na nwokoroọbịa ahụ si na mkpọrọ gbaa ọsọ mgbe ahụ awakporo ụlọọrụ dị n'Owerri n'afọ 2021.
Na ọ lọtara obodo, kpokọta ndị otu ya ma malite izu oh, ịtọrọ mmadụ, ịwakpo na igbu ndị ọrụ nchekwa nakwa mpụ ndị ọzọ.
Abattam gara n'ihu kwuo na ọ na-enyere ndị uweojii aka ugbua ịchọta ndị otu ya a ka na-achọ achọ.
Blessing Kpatuma bụ nwunye Kpatuma gwara arịrị maka ogbugbu e gburu di ya n'ike.
Akụkọ si Oguta, Imo steeti pụta kwuru na e gburu nwoke a bụbu onye uweojii larala ezumike nka n’Oguta Imo steeti.
Nwunye sị na ọ dị afọ 57 ma rụọ ọrụ ruo ogogo “Chief Superintendent” tupu ọ laa ezumike nka n’afọ 2019 ma banyezie n'ọrụ ndị ọkaiwu.
Nwunye ya ji akwa kọwara BBC Igbo na di ya ji obi ya niile fee ala Naịjirịa dịka onye uweojii ma rụọ ọrụ nchekwa ruo afọ 35.
Ọ kọwara na di ya hụrụ ya n’anya nke ukwu ma bụrụkwa onye udo.
O kwuru na ọ ruru ọrụ ikpe udo na mba Sudan nakwa n’okpuru ọrụ nchekwa udo ndị “Economic Community of West African States Monitoring Group” (Ecomog).
Ka o sị kwuo, ọ sị na ọtụtụ ndị mmadụ wakporo di ya ma gbukasịa ya ahụ.
A malitere chọwa ya bụ nwoke dịka ọ pụrụ ụlọ ya ma hapụ ilọta.
Cheta na Imo steeti so na steeti n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ebe nchekwa na-enye nsogbu na nso nso a.
Ọtụtụ nwakpoo na ọgbaghara dapụtara na steeti a nke gụnyere mwakpoo ụlọọrụ ndị uweojii, mwakpoo ụlọ nga,
mwakpoo ụlọọrụ ngalaba na na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ “Independent National Electoral Commission” (Inec), ogbugbu na ntọrọ ndị mmadụ, ntọrọ ndị Eze odinala, mwakpoo na ịgba be ndị mmadụ ọkụ wdgz.
Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma nakwa Onyeisiala Muhammdu Buhari agbala mbọ kwalite ọrụ nchekwa na steeti a dịka ha jịkọrọ aka ọnụ dọnyere ndị ọrụ nchekwa ukwu, ịhụ na-achụpụrụ ma nwụchịe ndị omekome na-akpa ike na steeti ahụ.
Kirie ihe onyonyo a ka ịnụrụ ihe nwaanyị a gwara BBC Igbo maka ọnọdụ ya ugbua.