Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa
Ngagharịiwe enweghị isi n’Ebonyi steeti
E nweghị
onye pụtara n’Ebonyi steeti maka ngagharịiwe #EndBadGovernance kama ebe niile
kpọchiri akpọchi.
Onye ntaakụkọ
BBC kpagharịrị n’isi obodo steeti ahụ bụ Abakaliki ma chọpụta na ụlọorụ dị iche
iche, ụlọakụ na ahịa tọgbọrọ chakoo ebe ọ bụ naanị ụlọahịa ole na ole mepere.
Ọ kọọrọ anyị
na ndị mmadụ na-agara mkpa ha dịka ụgbọala na-agbakwa n’okporoụzọ.
Ihe Adeyanju kwuru maka ngagharịiwe a na-eme n'Abuja
Aha onyonyo, Adeyanju gwara ndị uweojii ka ha hapụ ndị mmadụ ha mee ngagharịiwe n'udo.
Ebe ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe n'Abụja, Ọkaiwu Deji Adeyanju kọwara ihe ụlọikpe kwuru maka atụmatụ ngagharịiwe.
Igwe mmadụ pụtara n'Abụja ebe e mere ngagharịiwe. Ha gbakọrọ n'ọdọ egwuruegwu Moshood Abiola stadium. Ha mere ngagharịiwe maka ọchịchị ọjọọ na ihe isiike. Ha gụrụ egwu ma si ebe ahụ gaa Eagle's Square ebe ndị uweojii Abụja bidoro gbawa ha ikuku na-afụ ose.
A nwụchiri onye ntaakụkọ n'Abụja mana ndị uweojii kwuru na ọ bụghị nnwụchi kama a kpọrọ ya bịa zaa oku.
Ndị Enugu esoghị eme ngagharịiwe
Ngagharịiwe
na-aga n’ihu ugbua n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche erughị Enugwu steeti.
Onye ntaakụkọ
BBC chọpụtara nke a oge ọ kpagharịrị n’akụkụ Enugwu dị iche iche malite n’Ọkpara
Square ruo Ogui Road, New Haven na Agbani Road.
Ọ kọorọ anyị
na ebe niile ọ kpagharịrị dị ka ebe a gbara ọsọ n’ihi na e nweghị ndị pụtara
isonye na ngagharịiwe a kpọrọ “#EndBadGovernance”.
Oge o ruru
n’ahịa Main Market Enugwu, ọ chọpụtara na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole bịara ahịa
dịka ha ji nwaayọ ebupụta ngwaahịa ha.
Dịka o siri
kwuo, ụfọdụ mmadụ na-eche na ọ bụ n’ihi ịdọ aka na ntị otu dị iche iche gụnyere
Ọhanaeze Ndị Igbo mere ndị Enugwu ji kewapụ onwe ha na ngagharịiwe ahụ.
Ngalaba ndị
ntorobịa Ọhanaeze Ndị Igbo kwuru na ndị Igbo achọghị ngagharịiwe ọbụla kama ihe
ha chọrọ bụ ntọhapụ onyendu IPOB bụ Nnamdi Kanu, ikewapụtakwu steeti na
mpaghara ọwụwa anyanwụ, ikepụtara ndị ntorobịa ohere ọrụ na ikenye ndị Igbo ọkwa
ọchịchị.
Onyendu Enugu
Youths Movement bụ Maazị Okoh gwara BBC na ndị ntorobịa Enugwu agaghị esonye na
ngagharịiwe ahụ.
Ọ sịrị na
ihe mere ha ji nwee mkpebi ahụ bụ n’ihi na ndị ọrụ nchekwa agbagbuola ndị mere
ngaghrịiwe na mgbe gara aga tinyere na ndị omekoome na-eweghara ngagharịiwe oge
ụfọdụ ma were ohere ahụ zukọrọ ngwongwo na akụnaụba ndị mmadụ.
Enweghị ndị pụtara maka ngagharịiwe n’Imo steeti
Ala Imo
steeti tọgbọrọ chakoo ka ebe a gbara ọsọ dịka onye niile jụrụ isonye na ngagharịiwe
na-aga n’ihu ugbua gburugburu Naịjirịa.
Ụlọọrụ na ụlọahịa
niile mechiri emechi dịka okporoụzọ tọgbọrọ chakoo.
Cheta na ndị
ekperima a nọrọla n’ime mkpụrụ ụbọchị atọ gara aga kpaa mkpamkpa ọjọọ na steeti
ahụ dịka ha gburu ndị uweojii anọ na mmadụ nkiti abụọ.
Ngagharịiwe aghọrọla ọgbaghara na Kano
Ọgbaghara adapụtala ugbua na ngagharịiwe ndị mmadụ pụtara ime na Kano dịka amalitere iwakpo ogige ebe a na-akwado ikuziri ụmụaka maka Teknụzụ na steeti ahụ.
Minista na-ahụ maka Mgbasaozi na akụnaụba Teknuzu bụ Bosun Tijani akwaala arịrị maka ihe na-eme.
O dere nke a n'akara X ya na ọ bụ ebe ha na-akwado ịgbape n'izuụka ọzọ na-abịa ka ndị ahụ gbara ọkụ ma zupu ngwa ndị akwagara n'ime.
E jirila anwụrụ anya mmiri chụsasịa ndị mmadụ na Kano
Akụkọ si Kano apụta ugbua na-ekwu na ndị uweojii ejirila anwụrụ anya mmiri chụsaa ndị mmadụ na Kano.
Cheta na Kano bụ otu ebe ndị mmadụ pụtara ịme ngagharịiwe megide agụụ na ihe isi ike na Naịjirịa.
Mana ugbua akụkọ na-ekwu na achụsaala ndị ahụ gbakọrọ n'ebe akpọrọ 'state road' dị na Kano.
Anyị hụkwara foto ebe aka mmadụ na-agba ọbara dịka a sị na mgbọ tụrụ ya mgbe ndị uweojii gbapụrụ egbe iji maja ndị ahụ.
Ndị kwụnyeere gọọmentị apụtala igosi nkwado ha n'Alausa Legọs
Ndị na-akwụnyeere gọọmentị apụtala igosi nkwado ha.
Otu ahụ kpọrọ onwe ha Civil society Strategists pụtara jiri ọkọlọtọ dị ịcheiche e dere "mkparịtaụka ka ọgbaghara " na ihe ndị ọzọ.
BBC hụrụ ha n'akụkụ Alausa bụ obi gọọmentị Legọs steeti.
Enugu tọgbọ chakoo n'ụtụtụ taa
Enugu bụ ebe a na-atụ anya na ndị ntorọbịa ga-apụta sonye na ngosi iwe tọgbọ chakoo n'ụtụtụ taa.
Onye ntaakụkọ BBC gagharịrị n'ụfọdụ ebe ọ kachasị n'Okpara Square hụrụ na o nweghi ka otu onye pụtara ebe ahụ mana ụfọdụ mmadụ pụtara ịga mkpa ha.
Cheta na Ohaneze ndị Igbo nakwa ndị Igbo ọzọ dọrọ ndị ntorọbịa Igbo aka na ntị sị ha apụtala sonye na ngosi iwe a maka ikpe ihe ha amaghị maka ya ịma ha.
O dobeghi anya ihe mere ndị mmadụ ejighi pụta n'Enugwu dịka ngosi iwe na-ebiri na Legọs nakwa Abuja.
Ndị uweojii ekeela nkwụcha n'Ojota dị na Legos
BBC nọ n'okporoụzọ niile n'ụtụtụ a iji mara etu o si akpọtụ.
Anyị hụrụ ndị uweojii ebe ha dị njikere ma kwụrụ na-eche ihe ga-eme. Cheta na mgbe e mere ngagharịiwe End SARS n'afọ 2020, Ojoto bụ otu ebe anọchiri ụzọ ma jụụ ndị mmadụ ịgafe.
Ndewo nu
Ị bọọla chi?
Anyị na-ekwu ka ọnwa ọhụrụ a mitara gị mkpụrụ ọma
Soro anyị maka ihe niile gbasara ngagharịiwe ndị ntorọbịa kwadoro ime taa bụ End Bad Governance.