Trump ga-ezute Eze Charles na Windsor Castle

Akụkọ banyere ngagharịiwe ndị ntoroọbịa Naịjirịa na-eme n'ụbọchị mbụ ruo ụbọchị 10 nke ọnwa Ọgọst.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa

  1. A gwala ndị ngagharịwe na Legọs lawa na Onyeisiala agwala ha okwu

    Ndị uweojii na ndị na-eme ngagharịiwe na Legọs

    Ndị uweojii na Legọs agwala ndị na-eme ngagharịiwe na Legọs steeti ka ha lawa maka na onyeisiala Bola Tinubu agwala ha okwu.

    Osote kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Paul Okafor kwuputara nke a oge ọ na-agwa ndị ngagharịiwe na mpaghara Ojota okwu taa Sọnde 4 Ọgọst.

    O kwuru na 'Ebe ọ bụ ndị na-eme ngagharịiwe ahụ na-akpọ oku ka onyeisiala gwa ha okwu, ọ dị mma ka onye ọbụla lawa be ya ma chere ka onyeisiala mmezu ihe niile o kwuru na ozi ọ gwara ndị Naịjirịa n'ụtụtụ taa'.

  2. Onyeisiala Tibubu agwala ụmụ Naịjirịa ka ha butuo na ofe dị ọkụ ga-ajụ oyi

    Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, Presidency

    Onyeisiala Bola Tinubu agwala ụmụafọ Naịjirịa na-eme ngagharịiwe ka ha medata obi ala ma nwee ndidi na gọọmentị na-agbasi mbọ ike ịhụ na ihe ga-adị mma.

    O kwuru nke a na mgbasaozi o mere n’ụbọchị Sọnde 4 Ọgọst, 2024 n’ihi ngagharịiwe nke a na-eme megide ‘ọchịchị ọjọọ, agụụ, ọnụahịa dị elu, mwepu ego enyemaka na mmanụ ụgbọala’ dgz.

    Onyeisiala Tinubu gwara ndị a na-eme ngagharịiwe ka ha kwụsị ya ngwa ngwa ma nye gọọmentị ohere ka ha rụọ ọrụ.

    N’okwu ya “Ana m agwa ndị na-eme ngagharịiwe ka ha kwụsị ya ugbua.

    “Ụmụ Naịjirịa ibe m, ọkachasị ndị ntoroọbịa anụla m mkpu akwa unu ma na-arịọ ka unu metuo obi ala ka anyị rụkọọ maka ọdịmma obodo anyị.

    “Anyị na-arụsi ọrụ ike n’oge na-adịghị anya mpụtara ya ga-apụta ihe.”

    Onyeisiala Tinubu kwusiri ike na ọ bụ n’ihi ego enyemaka mmanụ ụgbọala gọọmentị na-akwụ bụ ke e wepurula ugbua butere ọnọdụ ọjọọ a ma kọwaa na ọ dị mkpa na e mere ya maka na ụfọdụ ndị mmadụ ji ya na-afọju akpa.

    Ọ gara n’ihu gụpụta ọtụtụ ihe ọchịchị ya merela nakwa nke ọ ka ga-eme iji belata nsogbu na ọnọdụ ihe isiike nke a butere.

    Ihe ndị a gụnyere; ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ opekatampe 70,000, ibinye ụmụakwụkwọ ego, ikesara ọtụtụ ezinaụlọ ego enyemaka, ibinye ndị na-arụpụta ihe ego, iwepụ ụtụisi n’ụfọdụ ngwa nri na ọgwụ a na-ebubata na Naịjirịa ruo ọnwa isii, iwepụta ụgbọala mmanụ gaasị ga na-ebu ndị ọrụ Bekee n’efu nakwa ihe ndị ọzọ.

    Onyeisiala Tinubu gakwara n’ihu katọọ mwakpo na mmebi ọtụtụ ụlọọrụ gọọmentị nakwa ihe ndị e ji ebi ndụ ndị na-eme ngagharịiwe mebiri,

    N’otu aka ahụ ọ katọrọ ogbugbu ọtụtụ ndị a na-eme ngagharịiwe, ọkachasị na mpaghara Ugwu nke Naịjirịa ma tie ezinaụlọ ha aka n’obi.

    Ọ katọkwara ụfọdụ ndị na-akpọ oku oke agbụrụ na soshal midia nke nwereike ibute ọgbaghara ma kwuo ka ndị dị etu a kwụsị ya.

    Mgbasaozi Onyeisiala Tinubu a na-abịa n’ime ụbọchị anọ ndị ntoroọbịa Naịjirịa malitere ime ngagharịiwe a kpọrọ #EndBadGovernance maka ihe isiike nakwa ihe ndị ọzọ.

  3. Igbo ndị ọma unu abọọla chi?

    Nọọ n'ọgbakọ anyị bụ ebe a na-ewetere unu akụkọ banyere ngagharịiwe ụmụafọ Naịjirịa na-eme megide 'ọchịchị ọjọọ, agụụ na ihe isiike'

  4. Ngagharịiwe agaala n'ihu na Lagos steeti

    Ndị na-eme ngaghariiwe n'Ojota

    Dịka ngagharịiwe ụmụafọ Naịjirịa na-eme n’ihi ọchịchị ọjọọ, agụụ na ihe isiike banyere n’ụbọchị nke atọ, ndị mmadụ apụtala n’igwe n’Ojota dị na Legọs steeti iji sonye na ya.

    Ndị ntaakụkọ BBC chọpụtara na igwe mmadụ pụtara maka ya bụ ngagharịiwe n’ụbọchị Satọde 3 Ọgọst 2024 ebe ndị ọrụ nchekwa nọkwa nso ịhụ na ihe niile gara n’udo.

    Ndị ọrụ nchekwa na ndị na-eme ngagharịiwe

    Ụmụ mmadụ tụmadị ndị ntorobịa Naịjirịa agaala n’ihu na-eme ngagharịiwe kemgbe abalị mbụ nke ọnwa Ọgọst n’agbanyeghị iwu onyeisi ndị uweojii nyere ka a kwụsị ngagharaịiwe ahụ n’ihi na ndị ekperima esonyela na ya iji bute ọgbaagbara.

  5. Ọ bụghị eziokwu na m na-akwado ndị na-eme ngagharịiwe n’Abuja – Sinetọ Ireti Kingibe

    Sinetọ Ireti Kingibe

    Ebe foto si, Senator Kingibe Facebook

    Sinetọ na-anọchiteanya FCT n’ụlọ omeiwu Sineti Naịjirịa bụ Sinetọ Ireti Kingibe ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ọ bụ ya na-akwado ndị na-eme ngagharịiwe n’Abuja.

    Cheta na mịnịsta na-ahụ maka FCT bụ Nyesom Wike kwuru na ndị ọrụ nchekwa achọpụtala Sinetọ na-akwado ndị ngagharịiwe ahụ.

    N’ozi Sinetọ Kingibe wepụtara n’akara mgbasaozi Facebook ya, o mere ka a mata na aka ya, aka Peter Obi maọbụ Labour Pati adighị na ebubo ahụ kwuru na ọ na-akwado ndị na-eme ngagharịiwe n’Abụja.

    O kwuru na enweghị oge ọ gara kesaa nri ebe ahụ a na-eme ngagharịiwe n’ihi na ya nọ n’ụlọ ya na-anata nleta maka ahụike ya kemgbe Wenezde Julaị 31.

    Akwụkwọ ozi Sinetọ Kingibe wepụtara

    Ebe foto si, Senator Kingibe Facebook

  6. Unu abọọla chi?

    Ngagharịiwe ndị ntorọbịa

    Taa bụ ụbọchị atọ ndị ntorọbịa na-eme ngagharịiwe hibere ha ga-apụta gosi iwe ha mana o dobeghi anya ma ha a ga-agbakọ ebe ọbụla.

    N'otu aka ahụ, o nwere ụfọdụ steeti ma n'ọwụwa anyanwụ ma n'ebe ọzọ esonyeghi na ya bụ ngagharịiwe ha gụnyere:

    • Imo
    • Abia
    • Enugu
    • Anambra
    • Kwara
    • Akwa Ibom
    • Ekiti
    • Niger
    • Ondo
  7. Kwụsịnụ ime ngagharịiwe ugbua - Ọkaiwu otu 'Take It Back Movement'

    Ebun-Olu Adegboruwa na ndị na-eme ngagharịiwe

    Ebe foto si, Ebun-Olu Adegboruwa Facebook/Getty Images

    Okaịwu Ebun-Olu Adegboruwa (SAN) akpọọla oku ka ụmụntorobịa kwusi ngagharịiwe ahụ na-aga n’ihu ugbua n’Naịjirịa.

    N’ozi Adebgoruwa onye bụ ọkaiwu otu ‘Take It Back Now’ wepụtara n’akara mgbasaozi soshal midia ya taa, ọ gwara ndị na-eme ngagharịiwe ahụ ka ha kwusị iji nye ohere maka ezi mkparịtaụka n’etiti ha na gọọmenti etiti.

    N’okwu ya, ‘E nwere ndị ọrụ ha bụ inweta ọgbaghara na ngagharịiwe ahụ, ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị kwusị ya’.

    Ọ gara n’ihu kelee igurube ndị mmadụ sonyere na ngagharịiwe ahụ ma kwuo na ọ dị mmwute na ọtụtụ mmadụ nwụrụ n'oge ngagharịiwe ahụ malitere ụbọchị Tozde 1 Ọgọst 2024.

  8. Peter Obi, Atiku Abubakar akwadoola ngagharịiwe maka oke agụụ na ọchịchị ọjọọ

    Peter Obi na Atiku Abubakar

    Ebe foto si, Pater Obi and Atiku Abubakar/X

    Onye bụbu Gọvanọ Anambra steeti ma zọọkwa ọkwa onyeisiala Naịjirịa bụ Peter Obi na ogbo ya bụ Atiku Abubakar ekwuola na ha kwadoro ngagharịiwe n'usoro ụdọ na-enweghị ọgbaaghara.

    Obi na Atiku mere ka a mata nke a n’akara soshal midịa ha.

    Peter Obi ji ohere ahụ kwuo na enweghị oge ya gara nọnyere ndị na-eme ngagharịiwe na Abụja.

    Obi kọwara na ihe onyoonyo na-efegharị na soshal midịa maka ịkpọ oku ka a lụọ agha bụ okwu ụgha ma kọwaa na ihe onyonyoo nke ọzọ bụ nke ha kwuru na ọ gara nọnyere ndị na-eme ngagharịiwe bụkwa akaọrụ ndị okwu ụgha.

    N’okwu Peter Obi "ha gara hazigharịa ihe onyoonyo m oge m zutere ndi ndọrọndọrọ ọchịchị Labour na otu jikọrọ ndị ọrụ n’Abụja ma were ya na-efeghari okwu ụgha na soshal midịa".

    Obi kwukwara na a kwụrụ ndị na-ebughari okwu ụgha ahụ ego ka ha metọọ aha ya na soshal midịa.

    N’aka nke ọzọ, Atiku Abubakar kwupụtara na ya kwadoro ngagharịiwe maka oke agụụ na gọọmenti ọjọọ ma kpọọ oku ka ụmụ Naịjirịa kwadoo ngagharịiwe ahụ ma dọnyere ndị na-eme ngagharịiwe ugwu

    O mere ka a mata nke a n’akara ọbaozi X ya bụ ebe ọ nọ gwa gọọmenti etiti ka ha tụọ ntị n’ala gee ndị mmadụ ntị.

    O kelere ndị na-eme ngaharịiwe ahụ maka iji usoro udo ma rịọ ha ka ha gbaa mbọ mee ka ngagharịiwe niile ha ga-eme bụrụ n'ụzọ udo.

    Ọ gwara ndị uweojii ka ha weta ndị mara ihe ekwe na-akụ gbasara ngagharịiwe ma tinyekwa ọnụ na mpaghara Naịjirịa ebe e nwere ọgbaaghara.

  9. Gọọmenti Borno, Kano Steeti agbanweela awa ha tinyere mmachi ngagharị mmadụ

    Abba Kabir Yusuf and Babagana Zulum

    Ebe foto si, Abba Kabir Yusuf and Babagana Zulum/X

    Gọọmenti Borno Steeti agbanweela awa ole ha tinyere iwu machịrị ndị mmadụ ịgaghari na steeti ahụ.

    Borno steeti wedatara awa ahụ ka ọ bụrụ site n’elekere iri na abụọ nke ehihe elekele atọ nke mgbede.

    N'ụbọchị Satọde, ọ ga amalite n’elekere isii nke ụtụtụ.

    Ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ndị mmadụ nwereike ị na-aga mkpa ha, ma ha gbanarị ime ihe na-adịghị n’iwu.

    Ozi a na-abịa oge na-erubeghị awa iri abụọ na anọ gọọmenti Borno steeti machichara ngagharị mmadụ maka ọgbaaghara sotere ngagharịiwe ụmụntorobia na-eme maka oke agụụ na ọchịchị ọjọọ.

    Police statement on X

    Ebe foto si, Borno state police/X

    Na Kano Steeti, gọọmenti ha gbanwekwara awa ha tinyere mmachi ngagharị ndị mmadụ.

    Ugbua, ndi bi na Kano nwere ohere ịgagharị bido n’elekere iri na abụọ nke ehihe taa bụ Fraịde ruo elekere ise nke mgbede.

    Nke a ga-enyere ndị okpukperechi alakụba aka ịga okpukperechi ha taa bụ Fraịde.

  10. Mmadụ 13 nwụrụ n’ụbọchị mbụ e mere ngagharịiwe na Naịjirịa – Amnesty International

    Amnesty International

    Ụlọorụ na-ahụ maka ikikere mmadụ bụ Amnesty International akatọọla etu ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa siri gbagbuo ndị na-eme ngagharịiwe maka ọchịchị ọjọọ.

    N’ozi o bipụtara n’ụbọchị Fraịde 2 Ọgọst 2024, onyeisi otu Amnesty na Naịjirịa bụ Isa Sanusi kwupụtara na mmadụ iri na atọ (13) nwụrụ n’oge ngagharịiwe ahụ ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ.

    O kwuru na mmadụ isii nwụrụ na Suleja dị na Naịja steeti nke dị nso n’isi obodo Naịjirịa bụ Abụja, mmadụ anọ anwụọ na Maiduguri ebe atọ ndị nke ọzọ nwụrụ na Kadụna.

    Ebe ndị ọzọ otu ahụ kwuru na mmadụ nwụrụ bụ na Kano, Kebbi na Jigawa steeti.

    Ka o siladị, ụlọọrụ ndị uweojii Jigawa gwara BBC na e nweghị onye nwụrụ na steeti ahụ.

    Amnesty kpọrọ oku ka ndị ọchịchị Naịjirịa nyochaa ọnọdụ ndị ahụ iji hụ na ndị ọrụ nchekwa aka ha dị na ya nwetara ntaramaahụhụ kwesịịrị ha.

  11. Ndị uweojii anwụchiela mmadụ 269 maka izu ohi na Kano

    Ndị mmadụ wakporo ogige NCC ma kwara ngwa nri dị ebe ahụ na Kano steeti ụnyaahụ

    Ndị uweojii na Kano steeti ekwuputala na ha anwụchiela mmadụ 269 maka ebubo ịkpalite ọgbaghara nakwa ịzu ohi na ngagharịiwe mere n'ụbọchị Tọzde.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Haruna Kiyawa kwuru na ha anapụla ndị ahụ igbe kwuru igbe mmanụ ahụkere, ngwa nri, akwụkwo nakwa ihe ndị ọzo dị oke ọnụ.

    Ọ sị na ha ga-enyefe okwu ahụ n'aka akụkụu ndị uweojii na-enyocha ndị ekperima ma kpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma ha mechaa nyocha.

    BBC hụrụ ebe ọtụtụ mmadụ bucha igbe mmanụ, akwa ndina nakwa ihe ndịọzo n'isi agbapụ ọsọ nke mere ka amanye mmachi ngagharị n'ebe ahụ.

    Kọmịshọna ndị uweojii nke steeti ahụ bụ Salman Dogo Garba kwuru na ndị ọrụ nchekwa ga na-aga n'ihu n'ikpuchi ndụ na ngwa ndị mmadụ ma na-agwakwa ndị bi na steeti ahụ ja kwenye na mmachi ngagharị nke gọomentị steeti ahụ hibere.

  12. Gọọmenti enyeghị ntụziaka ka achabịe ikuku nzikọrịtaozi – Bosun Tijani

    Bosun Tijani

    Ebe foto si, Bosun Tijani/X

    Mịnịsta na-ahụ maka nziritaozi na akụnaụba dijitaalụ bụ Bosun Tijani ekwuola na gọọmenti enyeghị ụlọorụ ndị na-arọpụta ikuku nzikọrịtaozi ntụziaka ọbụla ka ha belata ogogo ịntaneeti ndị Naịjirịa ji eme ihe.

    Ụfọdụ ozi a hụrụ n’ịntaneeti na-ebo gọọmenti Naịjirịa ebubo ịgwa ụlọorụ ndị na-arọpụta ikuku nzikọrịtaozi ka ha belata ogogo ịntaneeti ndị na-eme ngagharịiwe.

    N’oge ọ wụchiri n’ihe omume ụlọmgbasaozi Channels TV, mịnịsta ahụ kọwara na ogogo ikuku nzikọrịtaozi gbaturu ala n’ụbọchị Tọzde nwereike ị bụ n’ihi ọtụtụ ndị chọrọ iji ya eme ihe n’otu mgbe n’ụbọchị ahụ.

    Ka osiladị, o kwuru na Naịjirịa chọrọ akụrụngwa buru ibu iji nwee ike nweta ezi ikuku nzikọrịtaozi na ịntaneeti.

  13. Lee etu ahịa Ogbete Enugu dị taa bụ n'ụbọchị abụọ ngagharịiwe

    Ahịa Ogbete Enugu

    Ndị ahịa amalitela azụmahịa n'ahịa Ogbete main market dị n'Enugu.

    Nke na-abịa ka ahịa Ogbete mechiri ụnyaa n'ihi ngagharịiwe nke na-aga n'ihu ugbua n'Naịjirịa.

    Ka BBC Igbo gara n'ogige ahịa Ogbete taa, anyị hụrụ ndị na-ere na ndị na-azụ ahịa n;ime ahịa ahụ.

    Ahịa Ogbete Enugu
    Ahịa Ogbete Enugu
  14. Gọvanọ Uzodimma na Nwifuru ekeleela ndị ọwụwa anyanwụ maka esonyeghi na ngagharịiwe

    Francis Nwifuru na-achị Ebonyi ebe Hope Uzodimma na-achị Imo steeti

    Ebe foto si, Francis Ogbonna Nwifuru/Hope Uzodimma/Facebook

    Gọvanọ abụọ ndị owụwa anyanwụ ekeleela ndị mpaghara ahụ maka etu ha sị gbahapụ isonye na ngagharịiwe bụ nke ndị mmadụ mere na steeti dị icheiche na Naịjirịa.

    Uzodimma n'ozi ya kọwara na nsogbu nke Naịjirịa na-agabiga ugbua abụghị taa ka ọ malitere ma kpọọ oku ka ndị mmadụ nwee ndidi na ọ bụghị ihe ga-ebi n'otu ọnwa.

    Ọ rụtụkwara aka na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ewere gọọmentị iwe bụ ndị hibere ma na-akwanye ndị ngosi iwe aja n'ukwu.

    N'aka nke ya, Francis Nwifuru bụ aka na-achị Ebonyi steeti kwuru na obi dị ya ụtọ maka etu ndị ntorọbịa ọwụwa anyanwụ ji gee nti n'okwu ndụmọdụ ma jụ ịpụta soro mee ngagharịiwe

    N'ihi nke a, gọọmentị ya kwere nkwa na ha ga-aga n'ihu wụlite iwu nakwa atụmatụ ndị ga-ahụ na ọdịmma ndị steeti ahụ bịara na mmezu.

    "Gọọmentị Ebonyi chọrọ iji ohere ichetara ndị Ebonyi na otu ụzọ a ga-eji lụsọ agụụ agha bụ ịlaghachi ebe anyị si, Ebonyi steeti bụ ndị ọrụ ugbo e ji ịkọ ihe mara" ka o kwuru n'ozi ahụ o weputara

  15. Porthacourt: Etu ụbọchị abụọ ngagharịiwe si a ga

    Ndị Pitakwa

    Ndị gbakọrọ igosi iwe ha na Port Hacourt esirila Pleasure Park zọrọ gawa Fedral Secretariat complex.

    Cheta na ụnyaahụ ha gbakọrọ gaa n'obi gọọmentị ebe Sim Fubara n'achị steeti ahụ.

    Lee etu o si ga ebe ahụ.

    Ndị Pitakwa
    Ndị Pitakwa
    Ndị Pitakwa
  16. Ngagharịiwe amalitela ọzọ n'Ibadan taa

    Ndị pụtara ime ngagharịwe n'Ibadan bụ isi obodo Oyo steeti

    Otu otu n'ime otu abụọ ndị pụtara ime ngagharịiwe unyaahụ n'Ibadan pụtara ọzọ taa.

    Ndị ahụ malitere njem ngagharị ha n'ihu Mahadum Ibadan dị n'Oyo steeti ma kwuo na ọ bụ ebe ahụ ka ha ga-ebi ya ebe elekere iri na abụọ taa.

    BBC hụrụ ndị ọrụ nchekwa ebe ha kwụchiri ebe ahụ isonye ndị ahụ ma chekwa ha na ngagharịi ha.

    E nwebeghi ihe gbatagbata maọbụ nsogbu pụtara kemgbe ndị steeti ahụ malitere ngagharịi nke ha.

    Ndị ọrụ nchekwa kwụ ebe ndị mmadụ gbakọrọ
    Ndị ọrụ nchekwa
  17. Unu apụtala?

    Ndị mere ngagharịiwe unyaanhu

    Daalụ nụ maka isonye anyị n'ụbọchị abụọ nke ngagharịiwe ndị ntorọbịa hibere a kpọrọ End bad governance.

    Maka ndị ka na-esonye anyị n'ụtụtụ taa, chọpụta ihe ndị mere unyaahụ na nke nke ebe a:

    • Ndị mmadụ pụtara ịme ngosi iwe na steeti dị icheiche gụnyere Lagos, Abuja, Rivers, Kano, Oyo, Delta, Kaduna, Jigawa, Yobe na ndị ọzọ.
    • Ngagharịiwe ghọrọ ọgbaghara n'ụfọdụ ebe ọ kachasị na steeti ndị dị na mpaghara ugwu Naịjirịa
    • Steeti ndị manyere mgbochi ngagharị gụnyere Kano, Yobe, Jigawa na Borno steeti.
    • Ụfọdụ ndị na-akwado gọọmentị pụtara ime ngagharị nke ha n'Alausa dị na Legọs steeti.
    • Ngụkọ e mere kwuru na ihe ruru mmadụ 17 gụnyere otu onye uweojii nwụrụ na nsogbu si ngagharịiwe dapụta.
    • O nweghi ebe e mere ngagharịiwe na mpaghara ọwụwa anyanwụ dịka BBC hụrụ ebe ụzọ dị icheiche tọgbọ chakoo n'Enugwu, Ebonyi, Abia na Imo.
    • Cheta na otu Ohaneze Ndigbo nakwa otu ndị ọzọ dọrọ ndị Igbo aka na ntị ha apụtana sonye ngagharịiwe.
  18. Ngagharịiwe maka agụụ, gọọmenti ọjọọ amalitela n'Oyo steeti

    Ndị na-eme ngagharịiwe

    Ndi na-eme ngaharịiwe maka gọọmenti ọjọọ na agụụ dị na Naịjirịa amalitela n'Ọyọ Steeti.

    Ha gbakọrọ n’ụzọ Iwo tupu ha agafee Idi Ape wee gaa Mokola Roundabout.

    Ụmụntorobịa na-eme ngagharịiwe ahụ bụ ndị ji akwụkwo ha depụtara ihe ha chọrọ.

    Ndị na-eme ngagharịiwe n'Oyo steeti
    Nkọwa foto, .

    Ihe ha dere gụnyere “kwụsị agụụ", "kwụsị oke ahụhụ ndị mmadụ na-ata", "kwụsi ihe ụkọ" na ihe ndị ọzọ dị iche iche

    Ndị na-eme ngagharịiwe n'Oyo steeti

    E wepụ ndị gbakọrọ n’ụzọ Iwo, e nwere ndị ọzọ na-eme ngaharịiwe n’ụzọ e sị abanye n'Ibadan.

    Ha kwuru na ebe ndị na-eme ngaghariiwe ga agbako n'ikpeazụ bụ n’ụlọọrụ Gọvanọ Seyi Makinde.

    Ndị uweojii

    Ndị ọrụ nchekwa dị icheiche na ndi uweojii nọnyeere ndị na-eme ngaharịiwe ugbua iji hụ na ọ gara n’ụzọ udo.

  19. Ndị uweojii etinyela iwu onye apụtala ezi na Borno

    Kọmịshọna ndị uweojii na Borno bụ Yusufu Lawal

    Ebe foto si, Borno Police/X

    Ndị uweojii Borno steeti ekwupụtala ọnọdụ onye apụtala ezi na steeti ahụ iji nwee ike chekwaa iwu ma hụ na e mere ihe n’ezi usoro.

    Nke a dị n’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweoji Borno bụ Nahum Kenneth Daso tinyere aka na ya n’ụbọchị Tọzde 1 Ọgọst 2024.

    Dịka o siri kwuo, aka na-achị Borno steeti bụ Babagana Zulum chọpụtara na nke ahụ “dị oke mkpa” oge ya na ndịisi ụlọorụ nchekwa niile dị na steeti ahụ nwechara nzukọ.

    Ọ sịrị na ihe mere e ji kwupụta ọnọdụ ahụ bụ n’ihi ogbuniigwe tiwara na Kawori, nke gburu mmadụ iri na isii (16) ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

    Ozi ahụ kwuru na ya bụ iwu onye apụtala ezi ga-adị awa iri abụọ na anọ (24).

  20. Nchịkọta ihe ndị mere taa dịka ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe

    Taa bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọgọst bụ nke otu dị icheiche hibere iji malite ngagharịiwe megide agụụ na ọnọdụ nchekwa ọjọọ.

    Ọ bụrụ na ị ka na-esonye anyị ugbua, lee ihe ndị merela rue ugbua

    • Ndị mmadụ pụtara na steeti dị icheiche n'ụtụtụ ịme ngagharịiwe
    • Ndị uweojii gbara ndị pụtara anwụrụ anyammiri n'Abuja nakwa na Kano steeti
    • Mgbọ ndị ọrụ nchekwa tụrụ mmadụ atọ na Kano bụ ndị nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ ugbua.
    • Ndị pụtara igosi iwe na Kano gbabara n'ụlọ ehibere iji wulite Teknụzụ na steeti ahụ ma gbaa ya ọkụ maburu ngwa nri dị ebe ahụ
    • O nweghi steeti n'ọwụwa anyanwụ ebe ndị mmadụ pụtara ime ngagharịiwe gụnyere Enugwu, Imo, Abia, Anambra nakwa Ebonyi steeti.