You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Trump ga-ezute Eze Charles na Windsor Castle

Akụkọ banyere ngagharịiwe ndị ntoroọbịa Naịjirịa na-eme n'ụbọchị mbụ ruo ụbọchị 10 nke ọnwa Ọgọst.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu, Chinonso Ugorji, Michael Ngene, Adline Okere, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa

  1. Ngagharịiwe enweghị isi n’Ebonyi steeti

    E nweghị onye pụtara n’Ebonyi steeti maka ngagharịiwe #EndBadGovernance kama ebe niile kpọchiri akpọchi.

    Onye ntaakụkọ BBC kpagharịrị n’isi obodo steeti ahụ bụ Abakaliki ma chọpụta na ụlọorụ dị iche iche, ụlọakụ na ahịa tọgbọrọ chakoo ebe ọ bụ naanị ụlọahịa ole na ole mepere.

    Ọ kọọrọ anyị na ndị mmadụ na-agara mkpa ha dịka ụgbọala na-agbakwa n’okporoụzọ.

  2. Ihe Adeyanju kwuru maka ngagharịiwe a na-eme n'Abuja

    Ebe ndị mmadụ na-eme ngagharịiwe n'Abụja, Ọkaiwu Deji Adeyanju kọwara ihe ụlọikpe kwuru maka atụmatụ ngagharịiwe.

    Igwe mmadụ pụtara n'Abụja ebe e mere ngagharịiwe. Ha gbakọrọ n'ọdọ egwuruegwu Moshood Abiola stadium. Ha mere ngagharịiwe maka ọchịchị ọjọọ na ihe isiike. Ha gụrụ egwu ma si ebe ahụ gaa Eagle's Square ebe ndị uweojii Abụja bidoro gbawa ha ikuku na-afụ ose.

    A nwụchiri onye ntaakụkọ n'Abụja mana ndị uweojii kwuru na ọ bụghị nnwụchi kama a kpọrọ ya bịa zaa oku.

  3. Ndị Enugu esoghị eme ngagharịiwe

    Ngagharịiwe na-aga n’ihu ugbua n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche erughị Enugwu steeti.

    Onye ntaakụkọ BBC chọpụtara nke a oge ọ kpagharịrị n’akụkụ Enugwu dị iche iche malite n’Ọkpara Square ruo Ogui Road, New Haven na Agbani Road.

    Ọ kọorọ anyị na ebe niile ọ kpagharịrị dị ka ebe a gbara ọsọ n’ihi na e nweghị ndị pụtara isonye na ngagharịiwe a kpọrọ “#EndBadGovernance”.

    Oge o ruru n’ahịa Main Market Enugwu, ọ chọpụtara na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole bịara ahịa dịka ha ji nwaayọ ebupụta ngwaahịa ha.

    Dịka o siri kwuo, ụfọdụ mmadụ na-eche na ọ bụ n’ihi ịdọ aka na ntị otu dị iche iche gụnyere Ọhanaeze Ndị Igbo mere ndị Enugwu ji kewapụ onwe ha na ngagharịiwe ahụ.

    Ngalaba ndị ntorobịa Ọhanaeze Ndị Igbo kwuru na ndị Igbo achọghị ngagharịiwe ọbụla kama ihe ha chọrọ bụ ntọhapụ onyendu IPOB bụ Nnamdi Kanu, ikewapụtakwu steeti na mpaghara ọwụwa anyanwụ, ikepụtara ndị ntorobịa ohere ọrụ na ikenye ndị Igbo ọkwa ọchịchị.

    Onyendu Enugu Youths Movement bụ Maazị Okoh gwara BBC na ndị ntorobịa Enugwu agaghị esonye na ngagharịiwe ahụ.

    Ọ sịrị na ihe mere ha ji nwee mkpebi ahụ bụ n’ihi na ndị ọrụ nchekwa agbagbuola ndị mere ngaghrịiwe na mgbe gara aga tinyere na ndị omekoome na-eweghara ngagharịiwe oge ụfọdụ ma were ohere ahụ zukọrọ ngwongwo na akụnaụba ndị mmadụ.

  4. Enweghị ndị pụtara maka ngagharịiwe n’Imo steeti

    Ala Imo steeti tọgbọrọ chakoo ka ebe a gbara ọsọ dịka onye niile jụrụ isonye na ngagharịiwe na-aga n’ihu ugbua gburugburu Naịjirịa.

    Ụlọọrụ na ụlọahịa niile mechiri emechi dịka okporoụzọ tọgbọrọ chakoo.

    Cheta na ndị ekperima a nọrọla n’ime mkpụrụ ụbọchị atọ gara aga kpaa mkpamkpa ọjọọ na steeti ahụ dịka ha gburu ndị uweojii anọ na mmadụ nkiti abụọ.

  5. Ngagharịiwe aghọrọla ọgbaghara na Kano

    Ọgbaghara adapụtala ugbua na ngagharịiwe ndị mmadụ pụtara ime na Kano dịka amalitere iwakpo ogige ebe a na-akwado ikuziri ụmụaka maka Teknụzụ na steeti ahụ.

    Minista na-ahụ maka Mgbasaozi na akụnaụba Teknuzu bụ Bosun Tijani akwaala arịrị maka ihe na-eme.

    O dere nke a n'akara X ya na ọ bụ ebe ha na-akwado ịgbape n'izuụka ọzọ na-abịa ka ndị ahụ gbara ọkụ ma zupu ngwa ndị akwagara n'ime.

  6. E jirila anwụrụ anya mmiri chụsasịa ndị mmadụ na Kano

    Akụkọ si Kano apụta ugbua na-ekwu na ndị uweojii ejirila anwụrụ anya mmiri chụsaa ndị mmadụ na Kano.

    Cheta na Kano bụ otu ebe ndị mmadụ pụtara ịme ngagharịiwe megide agụụ na ihe isi ike na Naịjirịa.

    Mana ugbua akụkọ na-ekwu na achụsaala ndị ahụ gbakọrọ n'ebe akpọrọ 'state road' dị na Kano.

    Anyị hụkwara foto ebe aka mmadụ na-agba ọbara dịka a sị na mgbọ tụrụ ya mgbe ndị uweojii gbapụrụ egbe iji maja ndị ahụ.

  7. Ndị kwụnyeere gọọmentị apụtala igosi nkwado ha n'Alausa Legọs

    Ndị na-akwụnyeere gọọmentị apụtala igosi nkwado ha.

    Otu ahụ kpọrọ onwe ha Civil society Strategists pụtara jiri ọkọlọtọ dị ịcheiche e dere "mkparịtaụka ka ọgbaghara " na ihe ndị ọzọ.

    BBC hụrụ ha n'akụkụ Alausa bụ obi gọọmentị Legọs steeti.

  8. Enugu tọgbọ chakoo n'ụtụtụ taa

    Enugu bụ ebe a na-atụ anya na ndị ntorọbịa ga-apụta sonye na ngosi iwe tọgbọ chakoo n'ụtụtụ taa.

    Onye ntaakụkọ BBC gagharịrị n'ụfọdụ ebe ọ kachasị n'Okpara Square hụrụ na o nweghi ka otu onye pụtara ebe ahụ mana ụfọdụ mmadụ pụtara ịga mkpa ha.

    Cheta na Ohaneze ndị Igbo nakwa ndị Igbo ọzọ dọrọ ndị ntorọbịa Igbo aka na ntị sị ha apụtala sonye na ngosi iwe a maka ikpe ihe ha amaghị maka ya ịma ha.

    O dobeghi anya ihe mere ndị mmadụ ejighi pụta n'Enugwu dịka ngosi iwe na-ebiri na Legọs nakwa Abuja.

  9. Ndị uweojii ekeela nkwụcha n'Ojota dị na Legos

    BBC nọ n'okporoụzọ niile n'ụtụtụ a iji mara etu o si akpọtụ.

    Anyị hụrụ ndị uweojii ebe ha dị njikere ma kwụrụ na-eche ihe ga-eme. Cheta na mgbe e mere ngagharịiwe End SARS n'afọ 2020, Ojoto bụ otu ebe anọchiri ụzọ ma jụụ ndị mmadụ ịgafe.

  10. Ndewo nu

    Ị bọọla chi?

    Anyị na-ekwu ka ọnwa ọhụrụ a mitara gị mkpụrụ ọma

    Soro anyị maka ihe niile gbasara ngagharịiwe ndị ntorọbịa kwadoro ime taa bụ End Bad Governance.