Onyeisiala
Bola Tinubu agwala ụmụafọ Naịjirịa na-eme ngagharịiwe ka ha medata obi ala ma
nwee ndidi na gọọmentị na-agbasi mbọ ike ịhụ na ihe ga-adị mma.
O kwuru nke
a na mgbasaozi o mere n’ụbọchị Sọnde 4 Ọgọst, 2024 n’ihi ngagharịiwe nke a
na-eme megide ‘ọchịchị ọjọọ, agụụ, ọnụahịa dị elu, mwepu ego enyemaka na mmanụ ụgbọala’
dgz.
Onyeisiala
Tinubu gwara ndị a na-eme ngagharịiwe ka ha kwụsị ya ngwa ngwa ma nye gọọmentị
ohere ka ha rụọ ọrụ.
N’okwu ya “Ana
m agwa ndị na-eme ngagharịiwe ka ha kwụsị ya ugbua.
“Ụmụ Naịjirịa
ibe m, ọkachasị ndị ntoroọbịa anụla m mkpu akwa unu ma na-arịọ ka unu metuo obi
ala ka anyị rụkọọ maka ọdịmma obodo anyị.
“Anyị na-arụsi
ọrụ ike n’oge na-adịghị anya mpụtara ya ga-apụta ihe.”
Onyeisiala
Tinubu kwusiri ike na ọ bụ n’ihi ego enyemaka mmanụ ụgbọala gọọmentị na-akwụ bụ
ke e wepurula ugbua butere ọnọdụ ọjọọ a ma kọwaa na ọ dị mkpa na e mere ya maka
na ụfọdụ ndị mmadụ ji ya na-afọju akpa.
Ọ gara n’ihu
gụpụta ọtụtụ ihe ọchịchị ya merela nakwa nke ọ ka ga-eme iji belata nsogbu na ọnọdụ
ihe isiike nke a butere.
Ihe ndị a gụnyere;
ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ opekatampe 70,000, ibinye ụmụakwụkwọ ego, ikesara ọtụtụ ezinaụlọ
ego enyemaka, ibinye ndị na-arụpụta ihe ego, iwepụ ụtụisi n’ụfọdụ ngwa nri na ọgwụ
a na-ebubata na Naịjirịa ruo ọnwa isii, iwepụta ụgbọala mmanụ gaasị ga na-ebu
ndị ọrụ Bekee n’efu nakwa ihe ndị ọzọ.
Onyeisiala
Tinubu gakwara n’ihu katọọ mwakpo na mmebi ọtụtụ ụlọọrụ gọọmentị nakwa ihe ndị
e ji ebi ndụ ndị na-eme ngagharịiwe mebiri,
N’otu aka
ahụ ọ katọrọ ogbugbu ọtụtụ ndị a na-eme ngagharịiwe, ọkachasị na mpaghara Ugwu
nke Naịjirịa ma tie ezinaụlọ ha aka n’obi.
Ọ katọkwara
ụfọdụ ndị na-akpọ oku oke agbụrụ na soshal midia nke nwereike ibute ọgbaghara ma
kwuo ka ndị dị etu a kwụsị ya.
Mgbasaozi
Onyeisiala Tinubu a na-abịa n’ime ụbọchị anọ ndị ntoroọbịa Naịjirịa malitere
ime ngagharịiwe a kpọrọ #EndBadGovernance maka ihe isiike nakwa ihe ndị ọzọ.