Balogun Fire: 'Esi m n' ụlọelu ogogo ise wutuo ka ọkụ ahụ ruru m ahụ'

Ọkụ ọgbụgba dakwasara ndị ahịa n'ahịa Balogun dị na Legọs agbaachala mana akụkọ ndị nwụụ, merụụ ahụ nna ihe ndị ọzọ e mefuru ka na-aga n'ihu.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu and Chioma Obianinwa

  1. Gọọmenti bịa gbapere anyị ahịa ka anyị zụọ 'season'

    Ndị na-azụ ahịa n'Ahịa Balogun dị na Legọs akpọkuola gọọmenti steeti ashụ ka ọ gbatara ha ọsọ enye maka site n'kpocha ihe ọkụ mebiri ma gbapere ha ahịa ka ha bidokwa zụwa ahịa.

    Gee ihe onyeisi ha kwuru n'ihe onyonyo:

    Aha onyonyo, Balogun Fire: Gọọmenti bịa gbapere anyị ahịa ọzọ- Ndị na-azụ ahịa
  2. Ndewoonụ, Ụmụ Igbo

    Igbo ndị ọma, ọ bụ ebe ka anyị ka apịakọta ya.

    Ụbọchị nta, a chụọ n'owere nchị!

  3. Ihe ọkụ a furu anyị - Ụmụ Igbo na-azụ ahịa na Balogun

    Ụmụ Igbo na-azụ ahịa na Martin Street ebe ọkụ gbara ọdọahịa ọtụtụ ndị mmadụ n'abalị ise na iii ọnwa Novermber kọọ onye ntaakụkọ BBC ihe ha gabigara n'ọdachi ahụ.

    Gee ihe ha kwuru n'ihe nkiri a:

    Aha onyonyo, Balogun Fire: Ihe ọkụ a furu anyị - Ụmụ Igbo na-azụ ahịa ebe ahụ
  4. Aka na-achị Legọs zochiri Balogun

    Babajide Sanwoolu

    Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwoolu gara nleta ndị ọkụ ọgbụgba gbara na Balogun metụtara n'ehihie taa.

    O tiri ha aka n'obi kwee nkwa ịgụkọ ndị ihe mere ma mata ụzọ ha ga-esi nyere ndị o metụtara aka.

    O kwuru na ọ bụ ihe tara ọjị anya itinye igwe na enyo ọkụ na nnukwu ụlọelu.

    Ọ tara ndị isioche ọkpụrụ ọchịchị ụta sị na ha so buru ihe na-ebe dịka kwuru na ha na-enye ndị mmadụ ọdọ ahịa n'eleghị anya na nhazi obodo.

    Ọ gara n'ihu kwee nkwa ịrụ ahịa agba ọhụrụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  5. Ewu ataala ọtụtụ ụmụ Igbo igu n'isi

    Ndị ahịa gbakọrọ na-agba izu
    Nkọwa foto, Ndị ahịa gbakọrọ na-agba izu maka ọkụ gbara n'ahịa Balogu, Legọs

    Ọtụtụ ndị ahịa ka na-agụkọ ihe ọkụ a furu ha dịka ha gbakọọ n'otu, n'otu na-akpa maka ọdachi a dakwasara ha.

    Ụfọdụ merụrụ ahụ dịka ha na-agba mbọ ịzọpụta ngwaahịa na-akọ ije ha.

    Ụfọdụ n'ime ha na-agbalị ịzọta ihe refọrọ n'ọkụ ọgbụgba ahụ bidoro ụnyaahụ na Matrtin Street, Legọs.

    Ngwaahịa a zọpụtara n'ọkụ ọgbụgba dapụtara na Wenezde na Balogun Legọs
    Nkọwa foto, Ngwaahịa a zọpụtara n'ọkụ ọgbụgba dapụtara na Wenezde na Balogun Legọs
  6. Anyị na-echekwa ahịa Balogun ugbua maka ndị agboro- Osote onyeisi ụweojii

    Ndị uweojii wujuru n'ahịa Balogu ebe ọkụ na-agba taaa bụ abalị nke abụọ ọkụ ọgbụgba bidoro.

    Na nkọwa ya, Osote onyeisi ụweojii Legọs,Bode Ojajuni,gwara ndị ntaakụkọ na ọrụ ha ebe ahụ bụ ichekwa ebe niile iji hụ na ndị agboro ejighị ohere ọdachi ahụ zuwe ahịa ndị mmadụ, ichekwa akọrọngwa ọrụ ndị ọrụ mmenyụ ọkụ na ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ.

    Osote onyeisi ụweojii Legọs,Bode Ojajuni
    Nkọwa foto, Osote onyeisi ụweojii Legọs,Bode Ojajuni,
  7. Lee ihe na-eme ugbua ebe ahụ

    Onye ntakụkọ BBC Igbo nọ ebe ahụ 'live'

  8. Otu onye uweojii nwụrụ n'ọdachi

    Ọkụ ọgbụgba gbara ụnyahụ n'ahịa Balogun Legọs tara isi otu onye uweojii a mabeghị aha ya.

    Dịka Olanrewaju Elegushi, onye nnyemaka pụrụ iche nke gọvanọ steeti ahụ n'obi azụmahịa steeti ahụ (Central Business District) siri kọwa, ọ bụ ihe si n'ụlọ ọkụ gbara dagburu onye uweojii ahụ.

    Olanrewaju Elegushi
    Nkọwa foto, Olanrewaju Elegushi bụ onye nneymaka pụrụ iche nke gọvanọ dịka o siri gbasa obi azụmahịa steeti Legọs

    Elegushi gara n'ihu kọwaa na ha ga-enyocha ụlọ ndị dị nso n'ulọ ndị gbara ọkụ iji mara ma ha aka kwusiri ike.

    " Ọ bụrụ na nchọpụta gosi na ha akwụsịghị ike, a ga-akụtu ha."

  9. Naijiria ọghọọla ihe njakịrị na mba ụwa?

    Onye ntaakụkọ a ma ama na mba Briten bụ Katie Hopkins ji etu Naijiria si gbasoo ọku gbara na Bologun ụbọchị Wenezde maa Naijiria njakiri.

    Hopkins onye wepụtara ihe onyonyo nwoke jị bọket agbanyụ ọkụ n'a Balogun gwara ndị Briten ibe ya n' akara igwe okwu Twitter ya sị, ọge ọzọ ha chetara ịkatọ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ Briten, ha kelee Chukwu na ha abụghị ndị Naijiria ebe.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Mana ụfọdụ ndị mmadụ kọwara ya na nwoke ahụ na-emenyụ ọkụ bụ onye nche na-arụ ọrụ na nso ụlọahịa gbara ọkụ.

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

  10. Kama aka gị ga-ebutere gị ime njo...

    Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ Legọs
    Nkọwa foto, Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ Legọs na ọkụ na-agba mgba

    Dịka iji mezuo ihe Akwụkwọ Nso kwuru na kama aka gị ga-ebutere gị ime njọ, chapụ ya, ndị ọrụ gbatagbata Legọs steeti a kpọrọ Lasema akụtuola ụlọ ọzọ bidoro gbawa ọkụ taa n' ebe oọkụ kpara mkpamkpa ụnyahụ na Martin Street n' ahịa Balogun, Legọs iji gbochie ọkụ ahụ ikesa.

    Ọkụ ọzọ malitere taa bụ Wenezde n' ebe ahụ emenyụrụ ọkụ ma gbawa ụlọelụ ọzọ.

    Ụgbọala na-akụrị ụlọ ahụ ọkụ na-agba
    Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ Legọs
    Nkọwa foto, Nwoke na ihe na-eme: Lee Ndị ọrụ mmenyụ ọkụ Legọs n'ọrụ n' Ahịa Balogun
  11. Ọkụ bidoro gbawa ọzọ n'elekere 6 nke ụtụtụ a

    Otu na-emenyụ ọkụ na Legọs akpọrọ LASEMA kwuru na ọkụ ahụ malitere gbawa ọzọ n'ụlọ dị n'akụkụ nke gbara ọkụ ụnyahụ n'elekere isii.

    Mana ha gwara onye ntaakụkọ anyị na ha nọ ya na-emenyu ya bụ ọkụ.

    Lasema

    Ebe foto si, Lasema

  12. Ọkụ ọ gbara pụta ụtụtụ a?

    Akụkọ si na soshal midia apụta na-ekwu na ya bụ ọkụ gbagidere ruo abalị makana emenyụchaghị ya ọfụma.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  13. Ndị be anyị ụtụtụ ọma nụ!

    Anyị ka na-ewetere unu akụkọ gbasara ọkụ na-agba n'ahịa Balogun dị na Legọs.

  14. A zọtara ahịa dowere ndị aka ntụtụ?

    Dịka ọkụ ahụ na-agba, ndị o rutebeghị n'ọdọahịa ha si n'elu ụlọelu atutu ngwaahịa ha.

    Mana dịka Igbo na-ekwu n'okwu, ala adịghị mma bụ uru ndị nze.

    Dịka ebe niile na-akpọtụ, ụfọdụ ndị agboro na ndị aka ntụtụ ji otu aka ahụ zuo ọtụtụ ndị ahịa ohi.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. Ihe mere ọkụ a ji mebie nnukwu ihe- Ndị ahịa

    Ndị na-azụ ahịa sị na ndị na-agbanyụ ọkụ abịaghị n'oge nke mere ọtụtụ ngwaahịa jiri gbaa ọkụ.

    Gee ihe ndị ahịa kwuru n'ọnụ ha:

    Aha onyonyo, Balogun Fire: 'Ọ bụ igwe ọkụ 'generator' kpara ọkụ ọgbụgba a'
  16. Ọkụ a ọ bụzị kwa afọ?

    Ndị mmadụ na-ele ka ihe si aga ebe ọkụ gbara na Balogun
    Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-ele ka ihe si aga ebe ọkụ gbara na Balogun

    Ọtụtụ ndị nọ na-ahịa na-ebo ebubo na ọ bụ kwa afọ ka ọkụ na-agba ya bụ ahịa ebe a na-ere akwa ụmụnwaanyị,, akpụkpọụkwụ na iheendị ọzọ ụmụnwaanyị ji edozi onwe ha.

    Ha tụrụ arịrị na gọọmenti emebeghị ihe doro anya iji hụ na ọzọ emela.

    Ụfọdụ na-atụ alo ka ha nwee ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ nke aka ha nakwa ọlụlu mmiri ma hapụ ichekwudo gọọmenti.

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip Instagram post
    Hapụ Instagram ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of Instagram post

    Ndị mmadụ gbakọrọ ebe ọkụ na-agba na Balogun, Legọs
  17. Ọkụ gbakwara na Dosunmu

    Ndị gbatara ile ihe na-eme

    Dịka ọkụ na-agba n'ahịa Balogun, ọkụ gbakwara ọdọahịa ndị mmadụ na Dosunmu dịkwa na nso Balogun.

    NDị ọrụ gbagbata Lasema kọwara n'ọ nweghị onye merụrụ ahụ maọbụ onye nwụụ n'ọdachi a mere taa.

    Mana ọtụtụ mmadụ ka na-agụkọ ihe ọdachi a furu ha.

    Akụkọ kwuru na otu nwaanyị ọkụ gbara ọdọahịa afọ gara aga so na ndị o metụtara.

  18. Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọkụ ọgbụgba a, Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na soshal midia agbarụọla ihu n'ihi ọkụ ọgbụgba a. Lee ihe ha na-ekwu:

    Skip X post, 1
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 1

    Skip X post, 2
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post, 2

    Skip X post, 3

    End of X post, 3

    Skip X post, 4

    End of X post, 4

  19. Kedụ ihe kpatara ọkụ ahụ?

  20. Ndị na-agbanyụ ọkụ abịaghị n'oge