You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Gọọmentị Adamawa etinyela mmachi mkpagharị dịka ndị mmadụ wakporo ụlọ nchekwa nri

Akụkọ niile dị mkpa n'ọnwa Julaị

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa, Ikechukwu Kalu and Chukwunaeme Obiejesi

  1. Ihe mberede ataala isi mmadụ 15 n'okporoụzọ Legọs - FRSC

    Ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ nke Naịjirịa bụ 'Federal Road Safety Corps' ekwuola na ihe mberede mere n'okporoụzọ si Badagry gawa Ijanikin, na Legọs Steeti, egbuola mmadụ 15.

    Olabisi Sonusi bụ ọnụ na-ekwuru ndị FRSC nke Legọs kwuru na ihe mberede a mere n'ebe elekere asaa na ọkara nke ụtụtụ ụbọchị Sọnde, bụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Julaị 2023.

    O kwuru na ọ bụ ụgbọala abụọ - otu nnukwu ụgbọala na otu bọọsụ - takọtara isi. Ọnụọgụgụ ndị mmadụ nọ n'ime ụgbọala abụọ dị 24, mana mmadụ 15 nwụrụ anwụ ebe mmadụ itoolu nwetara ihe mmerụ ahụ dị icheiche.

    Ndị nwụrụ anwụ gụnyere ụmụ nwoke itoolu, ụmụ nwaanyị ise, na otu nwata nwaanyị, ebe ndị merụrụ ahụ bụ ụmụ nwoke ise na ụmụ nwaanyị anọ.

    Dịka ndị ozi ahụ si n'aka ndị FRSC si kwuo, e bugara ozu ndị ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu dị n'ụlọọgwụ ọha nke Badagry, ebe ndị merụrụ ahụ nọkwa n'otu ụlọọgwụ ahụ anata ọgwụgwọ.

    Onyeisi ụlọọrụ FRSC nke Legọs bụ Babatunde Farinloye kwuru na ihe mberede a agaraghị eme ma ọ bụrụ na ndị ọkwọ ụgbọala abụọ a kpachapụrụ anya n'etu ha si anya ụgbọala ha.

    Dịka o si kwuo, ihe kpatara ya bụ ihe mberede bụ ịgba oke ọsọ dịka otu ụgbọala chọrọ ịgbafere nke ọzọ n'agbanyeghị na nnukwu mmiri na-ezo.

    Farinloye dọrọ ndị ọkwọụgbọala aka na ntị ka ha kpachapụ anya ma kwụsị ị na-agba oke ọsọ n'okporoụzọ, ma na-erubekwa isi n'iwu okporoụzọ niile, ọ kacha oge ugbua bụ oge udummiri.

  2. Etu ụfọdụ ndị nwere akara ‘Twitter Blue’ si enyereaka agbasa ozi nduhie banyere agha Ukraine

    Dịka agha Russia na-ebuso Ukraine na-agafe ụbọchị 500, ọtụtụ akụkọ ụgha na akụkọ nduhie na-efegharị na ọtụtụ soshal midia dị iche iche mana ụfọdụ ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ime ha bụ ndị a na-ekesa na Twitter ọkachasị, ndị nwere akara ‘blue tick’ bụ ndị na-akwụ ụgwọ iji nwete ohere pụrụiche na soshal midia Twitter.

    Akụkọ banyere ngwa agha ndị Ukraine iji kpa mkpa mkpa n’ọgbaghara mere na France

    Ọtụtụ akụkọ ụgha pụtara n’oge ọgbaghara dapụtara na France na nso nso a mana otu n’ime ha saara ọkụ n’izu gara aga bụ nke metụtara ndịagha Amerịka ịnyere Ukraine aka.

    Ya bụ akụkọ gosiri foto e seere si n’akụkụ nke gosiri egbe abụọ ma dee:

    “Ndị uweojii France adịla njikere dịka ha ji ngwa ọgụ e che si Ukraine”.

    Ọtụtụ ndị nwere akara ‘Blue tick’ na Twitter kesara ya bụ akụlọ nke nde kwuru nde ndị mmadụ hụrụla.

    BBC Verify mere nnyocha ma hụ na ebe akụkọ si malite ifesa bụ ụfọdụ ọbaozi si Telegram bụ ọbaozi ndị na-akwado agha Russia na-ebuso Ukraine. Ya bụ foto bụ foto e sere kemgbe afọ 2012 bụ nke sị n’oty websaịt ndịagha mba Russia bụ nke si n’asọmpị ịgba egbe e mere n’akụkụ Moscow.

    Anyị enwebeghi ịke ịchọpụta ma enwere akụkọ ọbụla nọ n’ịntanetọ gosiri isi akụkọ ahụ e ji na-ekesa akụkọ a ugbua. Enweghikwanụ ihe ọbụla gosiri na na ngwa ọgụ mba Amerịka nyere Ukraine bụ ihe e ji adaju ọgbaghara na-ada na France.

    Ụfọdụ ndị nwere akara ‘Blue tick’ a kesakwara akụkọ banyere ‘Baby factory’ n’Ukraine.

    Ya bụ akụkọ kwuru na Russia chọtara ọtụtụ ebe ndị Ukraine na-ezobe ụmụnwaanyị ndị na-atụrụ ime ma na-amụrụ ha ụmụ aghara aghara.

    Ya bụ akụkọ nke kwuru na ndị Ukraine ji ụmụaka agba akwụna ma na-awara ime ahụ ha bụ ihe BBC Verify nyochara ma ghara ịhụ ihe akaebe ọbụla. O si n’akụkọ otu ọbaoezi The People's Voice kesara na Maachị. Ọbaozi a bụ ihe a sị ‘so n’ọbaozi kacha ekesa akụkọ ụgha n’ịntanetị’.

    Ụfọdụ ndị a nwekwara akara ‘Twitter blue’ kesakwara akụkọ ụgha banyere onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky ịkagbu ntuliaka mba ahụ mana ya bụ okwu bụ ihe e ji megharịa ihe Zelensky zara na mkparịtaụka ya na BBC nwere n’ọnwa Juun ebe o kwuru “ọ bụrụ na anyị merị n’agha, a ga-eme ntuliaka... A ga-enwerịrị ntuliaka n’oge udo dị ọbụghị oge agha dị dịka iwu siri kwuo.”

  3. Ọtụtụ ndị Igbo ekwenyeghị na Biafra, iwe ha bụ ịkpa oke dị na Naịjirịa - Ojukwu

    Lotanna Ojukwu, ekwuola na ọtụtụ ndị Igbo ekwenyeghị na Biafra, kama na ọ bụ mmegbu na ịkpa oke a na-akpaso ndị Igbo na Naịjirịa mere ụfọdụ ji akpọ oku maka nkewa.

    Lotanna bụ nwa nwoke nke atọ nke Mazi Louis Odimegwu Ojukwu ma bụrụkwa nwanne nwoke nke nta nke Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu, onye kewapụrụ Biafra na mba Naịjirịa na 1967, mere ka agha daa na Naịjiriria bido na 1967 ruo 1970.

    Ojukwu kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ Arise TV n'ụbọchị Fraịde, Julaị 7, 2023, gbasara mwakpo nke ndị ojiegbe na-awakpo ndịmmadụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa iji kpọọ oku ka gọọmentị tọhapụ onyeisi Ipob bụ Nnamdi Kanu.

    "Ọtụtụ ndị Igbo ekwenyeghị na Biafra, ihe ha na-achọ bụ ohere ibi ndụ ha nakwa inweta ihe niile ruuru ha na Naịjirịa," Lotanna Ojukwu kwuru.

    "Abụghị m onye na-ekwuchite ọnụ Nnamdi Kanu maọbụ Simon Ekpa, mana abụ m onye Igbo, ma hibekwa ọgbakọ ebe ọtụtụ ndị Igbo na-anọ enwe mkparịtaụka.

    "Ndị mmadụ na-eji maka na ndị Igbo anaghị enweta ihe ruuru ha na Naịjirịa, na-emezi ka ọ dị ka na ndị Igbo chọrọ ikewapụ bụrụ mba nke aka ha.

    "Ọ bụrụ n'ezie na ndị Igbo bụ ndị na-achọ ịnọrọ onwe ha, gịnị kpatara ọtụtụ ndị Igbo ji aga obodo dị icheiche: Abuja, Kano, Legọs, nakwa mba dị icheiche n'Afrịka na ụwa niile na-azụ ahịa ma na-ehibe ụlọọrụ dị icheiche?

    "Anyị bụ ndị na-enwe mmasị ime njem, nakwa inwe ohere ịzụ anyị ebe niile na-enweghịmgbochi ọbụla."

    Lotanna Ojukwu kọwara na ihe gbasara Biafra bụ ihe mere na mberede, ọbụghị na ọ bụ ihe ndị Igbo chọburu ime.

    O kwuru sị: "Ihe m ji kwuo na okwu Biafra bụ ihe mberede bụ na ọ bụ ogbugbu ndị Igbo na mpaghara ugwu na 1966 - ebe e gburu ihe karịrị mmadụ 80,000, kpatara ndị okenye na ndị omeiwu nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ jiri manye nwanne m nwoke (bụ Odumegwu Ojukwu) ka o kwuputa na Biafra abụrụla mba nọorọ onwe ya."

    "Taa, ndị Igbo ka na-ahụtakwa na a na-emegbu ha, ha na-ahụta na anaghị enye ha ohere a na-enye ndị agbụrụ ndị ọzọ na Naịjirịa.

    "Ọ bụ mmegbu a ka Nnamdi Kanu gbadoro ụkwụ na ya (dịka ọ na-ekwu okwu nnwereonwe Biafra), ọ bụkwa ya ka Simon Ekpa na-agbado ụkwụ na ya ugbua. Ọ bụ ihe a bụ mgbọrọgwụ nsogbu anyị na-enwe na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ugbua.

    "Ya mere m ji arịọ Onyeisiala Bola Tinubu ka ọ tọhapụ Nnamdi Kanu, ma menyụọ ọkụ okwu nnwereonwe a nke na-achọ ịdọpụ ọtụtụ ndị Igbo n'obodo Naịjirịa bụe ebe imirikiti n'imi ha chọrọ ịnọgide."

  4. Ihe mere anyị ji zigara mba Ukraine ogbunigwe 'cluster bomb' - Joe Biden

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden akọwaala ihe kpatara ha ji zigara mba Ukraine ogbunigwe pụrụ iche a na-akpọ 'cluster bombs' dịka agha Ukraine na Russia ka na-aga n'ihu.

    Biden nyere nkọwa a dịka ọtụtụ na-akatọ ya bụ ihe n'ihi na 'cluster bomb' bụ ogbunigwe nke gburula ndị nkịtị n'oge gara aga.

    "Ọ dịghịrị m mfe ime mkpebi ahụ, e chere m ya ogologo oge tupu m kpebie na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ime maka na ngwaagha ndị Ukraine na-agwụ agwụ," Biden kọwara na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ CNN n'ụbọchị Fraịde.

    Biden kwukwara na ya na ndị isiala mba dị icheiche ha na Amerịka nwere mmekọrịta, nwere mkparịtaụka tupu ya ekpebie iziga ogbunigwe ndị ahụ.

    Onyeisiala Ukraine bụ Volodymyr Zelensky kelere Amerịka maka onyinye ahụ ma kwuo na ọ bịara n'oge ọ dị oke mkpa, mana ọtụtụ ndị nkwado ikike dịịrị mmadụ nakwa ụfọdụ ndị nọ na pati Biden, - Democratic Party - katọrọ onyinye ahụ.

    Ọnụ na-ekwuru mba Russia kwuru na ihe a gọọmentị Amerịka mere bụ igosi na ha bụ ndị ihu abụọ.

    Gịnị mere ogbunigwe a ji akpata okwu?

    'Ogbunigwe a bụ 'cluster bomb' bụ ihe a machiri amachi na mba karịrị 120 n'ụwa niile, mana ma Russia ma Ukraine ji ya alụ ọgụ n'agha a na-aga n'ihu.

    Ihe kpatara e ji machie ụdị ngwa ọgụ a bụ maka na ọ bụghị ha niile na-agba oge a tụrụ ya, mke pụtara na ụfọdụ n'ime ha na-anọgide ruo ọtụtụ afọ tupu ha agbaa, nke nwereike imetụta ndị nkịtị

    Onye ndụmọdụ okwu nchekwa na mba Amerịka bụ Jake Sullivan kwuru na ha ghọtara nke ọma na ogbunigwe ndị a ga-etinye ọtụtụ ndị nkịtị n'ihe ize ndụ, bụ ihe mere ha ji chee ya ọtụtụ oge tupu ha ezigara ya mba Ukraine, "mana anyị agaghị ahapụ Ukraine n'oge dị otu a ka ha nọrọ na-enweghị ngwa ọgụ ọbụla ha ji echekwa onwe ha".

    Sullivan kwuru na 'cluster bomb' nke mba Amerịka na-arụpụta ka mma karịa nke ndị mba Russia na-arụ.

    O kwuru na nke Amerịka anaghị agba agba bụ ihe dịka pasentị abụọ, ebe nke ndị Russia bụ pasentị 30 maọbụ 40.

    Chetakwa na oge ọgụ Russia na Ukraine bidoro ọhụrụ, Amerịka katọrọ mba Russia maka iji ogbunigwe 'cluster bomb' ebuso Ukraine agha.

    Ọnụ na-ekwuru onyeisiala Biden n'oge ahụ bụ Marta Hurtado kwuru na ọ bụ "mpụ agha" ma ọ bụrụ n'ezie na Russia na-atụ ogbunigwe ahụ.

  5. "Ọrụ chere anyị n'ihu karịrị akarị - Alx Otii gwara ndị Kọmishọna ọhụrụ ya

    Gọvanọ Abia Steeti bụ Alex Otti eduola mmadụ 16 ọ họpụtara ọhụrụ dịka kọmishọna na steeti ahụ n'iyi ọrụ n'ụbọchị Fraịde.

    Nke a na-abịa dịka mmadụ atọ n'ime mmadụ 19 Otti nyere ọkwa Kọmishọna ka na-agabiga nnyocha n'ụlọ omeiwu steeti ahụ.

    Otti kwuru na a ga-edu mmadụ atọ ndị ahụ n'iyi ọrụ ngwangwa ndị ụlọ omeiwu nyere ha nkwado.

    N'emume idu n'iyi ọrụ a nke e mere n'ogige gọọmentị n'ụbọchị Fraịde, Julaị 7, Otti gwara ndị Kọmishọna ọhụrụ ahụ na "ọrụ chere ha n'ihu iji wulie Abia steeti ọhụrụ karịrị", ya mere ka onye ọbụla n'ime ha dị uchu n'ọrụ.

    Lee aha ndị Kọmishọna ọhụrụ ndị a nakwa ngalaba ha na-elekọta:

    1. Ikechukwu Uwanna - Ọkaiwu Kachasị nakwa Kọmishọna ikpe ziri ezi

    2. Prof Monica Ironkwe - Nkọpụta nri (Agriculture)

    3. Kingsley Anosike - Nhazi atụmatụ mkpata na mmefu

    4. Prof Uche Eme Uche - Agụmakwụkwọ

    5. Philemon Asonye Ogbonna - Gburugburu na mmepe obodo

    6. Mike Akpara - Akụnụba

    7. Dr. Ngozi Okoronkwo - Ahụike

    8. Prince Okey Kanu - Mgbasaozi na Ọdịnala

    9. Chaka Chukwumerije - Ala na Ụlọ obibi

    10. Prince Uzor Nwachukwu - Okpuruọchịchị na Echichi ọdịnala

    11. Prof Joel Friday Ogbonna - Mmanụ agbịdị na Ihe akụ ọnatarachi

    12. Chima Emmanuel Oriaku -Sayensị na Tekịnụzụ

    13. Nwaobilor Ananaba - Egwuregwu na Ọdịmma ndị ntorobịa

    14. Dr Chimezie Isaac Ukaegbu - Azụmahịa, Ịkpata ego na Nrụpụta ihe

    15. Ngozi Blessing Felix - Ọdịmma Ụmụnwaanyị na Mbelata ụbịam

    16. Engr Don Otumchere Oti - Ọrụ

    17. Comrade Sunny Onwuma - Njem

    18. Engr Ikechukwu Monday - Ọkụ Latrik na Akụrụngwa oha

    19. Dr. Mathew Ekwuribe - Ekọnọmi ọgbara ọhụrụ na Ndị obere ụlọahịa

  6. Onyeisiala Tinubu ga-aga mba Guinea-Bissau isonye n'ọgbakọ Ecowas

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu ga-ahapụ Naịjirịa taa bụ Satọde gawa mba Guinea-Bissau iji sonye n'ọgbakọ ndị isiala mba dị icheiche so n'otu 'Economic Community of Westa African States' (Ecowas).

    Nke a bụ njem nke abụọ onyeisiala Tinubu ga-eme pụọ na Naịjirịa kamgbe e duru ya n'iyiọrụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee afọ a.

    ọnụ na-ekwuru Tinubu bụ Dele Alake kwuru na ọgbakọ ahụ nke ga-amalite n'ụbọchị Sọnde, Julaị 9, ga-akpa ihe dị icheiche maka mwulite ọnọdụ nchekwa na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka, nkwalịte atụmatụ nzụkọrịta ahịa n'etiti mba Afrịka nke a kpọrọ 'African Continental Free Trade Area (AfCFTA) na bekee, nakwa ihe gbasara ọnọdụ ọchịchị na mba Mali, Burkina Faso, na Guinea, bụ ebe ndị agha weghaara ọchịchị n'ike n'aka ndị nkịtị.

    Dele Alake kwuru na Tinubu ga-alọghachi Naịjirịa ma emechaa ya bụ ọgbakọ.

  7. Ụnụ eteela ụra

    Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ.

    Ụbọchị taa maara anyị niile mma o.

    Ka anyị malite.

  8. Ọga ụlọọrụ agbaala ndị ọrụ ụmụnwaanyị ọtọ n'ihi 'sanịtary pad' e ji hụ nsọ

    Ndị uweojii anwuchiela mmadụ atọ dịka a gbachara ndị ọrụ ụmụnwaanyị atọ ọtọ n'otu ụlọ mmepụta ihe oriri ihi ihe nwaanyị ji ejichi nsọ ya.

    Dịka otu onye ọrụ si kwuo, onyeisi na-elekọta ụlọọrụ 'Brown's Food Company' dị na Kenya manyere ụmụnwaanyị ndị ọrụ ya ka ha yipu uwe ha iji chọpụta onye tụnyere ihe nwaanyị ji ahụ nsọ ya n'igbe e ji atunye ahịhịa.

    Nwaanyị ahụ manyere ụmụnwaanyị ahụ yipu akwa ha dịka mbọ ọ gbara ịmata eziokwu n'ọnụ ha amịtaghị mkpụrụ.

    Ụlọọrụ ahụ kwuru na ha akwụsịla onyeisi ọrụ mere nke ihe a ọrụ ganye ma emechaa nnyocha.

    N'ihe onyonyo o wepụtara n'ọbaozi Facebook, Onyeomeiwu na mba ahụ bụ Senator Gloria Orwoba kwuru na ya nwetara ozi mbeku banyere ihe a mere n'abalị Monde.

    Ọ sịrị, "Onyeisiọrụ hụrụ ihe nwaanyị ji hụ nso ya a tụnyere n'igbe ahịhịa, ihe m ghọtara bụ na ikpo ahịhịa ahụ abụghị maka ihe e ji ahụ nsọ."

    Sịnetọ ahụ bụ onye a ma maka ịgba mbọ megide itebọ ụmụnwaanyị n'ihi nsọ nwaanyị gara n'ihu sị, "Na mbụ Onyeisiọrụ kpọkọbara ụmụnwaanyị ahụ jụọ onye mere ya, mgbe ọ nataghị ọsịsa, ọ chọwa onye nọ na nsọ ya iji taa onye ahụ ahụhụ."

    N'ozi ha wepụtara n'ọbaozi websait, ụlọọrụ Brown's Food Company sị na "o wutere ha " ma kwụkwa na "agwa ahụ abụghị usoro ụlọọrụ si eme ihe".

  9. Ụnụ abọọla chi

    Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi.

    N'ebe a ka ị ga-enweta ọkpụrụkpụ akụkọ ndị dị mkpa maka ụbochị taa.

    Gaa n'ihu na-esonyere anyị.

  10. Onyeisiala Tinubu etinyela ụtụisi 5% n'okwu ekwentị, ngwahịa a rụpụtara na Naijiria

    Onyeisiala NAijiria b ụ Bola Tinubu ebinyela aka n'iwu ịkwụ pasentise na mgbasaozi n'ekwentị, ụtụ isi na ngwahịa a rụpụtara na Naijiria.

    Onye ndụmọdụ mgbasaozi ya bụ Dele Alake bụ onye gbara ama kwuru na Tinubu nyere iwu ka a kwụsị nwa mgbe nta ụtụisi n'elu plastik na ekpem bụ nke e tiri ọhụrụ.

    Ọ kwụsịkwara nwa mgbe nta ụtụ na ntụbata ụfọdụ ụgbọala.

    Tinubu malitere ọtụtụ mgbanwe nakwa atụmatụ n'ọnọdụ akụnaụba kemgbe abalị 40 o jiri banye n'ochịchị.

  11. Ụlọikpe atọhapụla Abba Kyari

    Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja nọrọ ụbọchị Tozde tọhapụla onye bụbu onyeisi ngalaba gbagbata ndị uweojii bụ Abba Kyari ka o si n'ụlọ na-abịa ikpe.

    Ngalaba nna-ebu agha megide ọgwụike bụ NDLEA kpụburu Abba Kyari na ụmụnne ya abụọ(Mohammed Baba Kyari na Ali Kyari)ụlọikpe n'ikpe nke akara ya bụ FHC/ABJ/CR/408/2022.

    Ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ bụ Jọstis James Omotosho,gbadoro ụkwụ na Kyari agbaghị ọsọ si na mkpọrọ pụta n'abalị ise nke ọnwa Julai ndị amaghị enwere ndị mkpọrọ si ụlọimkpọrọ dọwara.

    Jọstis Omotosho kwuru ka ọ kwụọ ego dị nde naira iri ise(N50 million) ma kpọtakwa mmadụ abụọ bii aAbuja ga-eji ego dị nde naira iri ise kwudoro ya dịka ndị akaebe.

    Ọkaikpe Omotosho kwuru na nnwereonwe ya nwa oge ga-agbado ụkwụ etu ikpe ọzọ Abba Kyari nwere dị n'iru Ọkaikpe Jọstis Emeka Nwite bụ nke metụtara itinye aka n'ibu ọgwụ iike si gaa.

  12. Anyị enwetala mkpesa maka mmetọ ụmụaka ruru 100 n’ọnwa atọ - Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs

    Ndị uweojii Legọs steeti ekwuola na ọnụọgụgụ mkpesa banyere mmetọ ụmụaka ha eruola 100 n´ọnwa atọ. Ọtụtụ steeti na Naịjirịa na-ahụtakwa iri elu mkpesa ndị dị etu a nakwa mkpesa ndịna n’ike nyere ya bụ ihe ndị mmadụ na-ekwusị dịka mmụba ya dịzika “mfesa ọrịa”.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin gwara ndị ntaakụkọ na ọnọdụ a na-eche ndị ọchịchị steeti ahụ ezigbo echiche.

    O kwuru: “Anyị na-enyocha okwu mmadụ 83 ugbua iji gosi na ndị uweojii na-agbasi mbụ ike ịbelata mkpagbu ụmụnwaanyị na mwakpo ndị mmadụ maka okike ha na Legọs steeto ”

    Hundeyin kọwara na n’agbata ọnwa Eprel ruo ọnwa Juun, mkpesa eruola ha aka maka ndịna n’ike ndị mmadụ 14 nakwa mkpagbu mmadụ 56 maka okike ha (ọkachasị ụmụnwaanyị).

    Ọ gakwara n’ihu kwuo na ha akpụpụla mmadụ 99 a na-enyo enyo n’okwu a ụlọikpe.

    Dịka okwu mmetọ ụmụaka na-ari elu, narị kwuru narị okwu ndị dị etu a abụghị ihe ndị mmadụ na-eme mkpesa maka ya maka ụjọ nrụrụaka n’okwu ikpe ha, ịkpa oke so mkpesa ndị a, nakwa ịkpụ ụgwụ n’ala n’usoro ikpe ndị dị etu a.

    Ndị na-alụ ọgụ ikike dịrị onye na-ekwu na ha chọrọ ka ehibe ntaramahụhụ zuruoke ndị na-eme ihe ndị dị etu a na Naịjirịa dịka otu n’ime ụzọ a ga-eji belata ya bụ ihe na Naịjirịa.

  13. Ndị dọkịnta Naịjirịa enyela gọọmentị izuụka abụọ iji mezuo nkwa ha

    Ndị dọkịnta Naịjirịa na-arụ n’ụlọọgwụ gọọmentị nwe enyela gọọmentị Naịjriịa izuụka abụọ iji mezuo nkwekọrịta ha nwere. Gọọmentị pụrụ apụ bụ nke Muhammadu Buhari kwere nkwa ihazi okwu niile nọ n’etiti ha ndị otu dọkịnta ahụ nke so mkpebi ha mere mgbe ndị dọkịnta a gbara abụbụ ọrụ abalị ise n’ọnwa Mee mana enwebeghi ihe ọbụla gọọmentị ọhụrụ Naịjirịa mere kemgbe ahụ.

    N’ozi nke otu jịkọrọ ndị dọkịnta a bụ Nigerian Association of Resident Doctors (Nard) wepụtara, otu a na-eche na izuụka abụọ a ga-ezuru ndị gọọmentị iji mezuo nkwa ndị a. Nke a na-abịa dịka otu ọnwa gachara mgbe ha kwuru na ha ga-enye gọọmentị ọhụrụ a oge iji lebaanya n’okwu ha.

    Ụfọdụ n’ime ihe ha na-achọ n’aka gọọmentị gụnyere ibuli ego ụgwọ ọnwa ha ruo pasentị 200, ịkwụ ha ụgwọ dị eji ha eji, ịkwụ ego ‘2023 Medical Residency Training Fund’ na ihe iti aka n’obi nye ndị ọrụ ha ‘iji gbaa ha ụmụ dịka ụklọ ndị ọrụ ahụike na-ada na Naịjirịa ugbua’.

    Ha na-adọ aka na ntị na-ekwu na ọ bụrụ na e mezughi ihe ha na-achọ na ha “agaghị enweike kwee nkwa ịdị n’otu ndị ọrụ ahụike Naịjirịa’ n’akụkụ Naijirịa niile.

    Okwu etinyeghi ego nke ọma n’ọrụ ahụike, enweghi ebe ụlọọrụ ndị ọrụ ahụike zuruoke, okwu ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ahụike emeela ka ọtụtụ ndị dọkịnta na ndị ọkachamara n’ihe gbasara ahụike na-agbaga mba ndị ọzọ aga achọ ọrụ.

  14. Threads: Instagram emepeela soshal midia ọhụrụ iji maa Twitter aka

    Onyeisi ụlọọrụ Meta bụ ụlọọrụ nwee Whatsapp, Facebook, Instagram na ndị ọzọ ekwuola na atụmatụ ha jiri mepee Threads bụ iji maa Twitter aka ma chụpụ ha n’ahịa.

    Mark Zuckerberg onye ọgaranya ụwa malitere ụlọọrụ a mbụ dịka Facebook na 2004 mgbe ya ụmụakwụkwọ ibe ya nọ na-agụkọ akwụkwọ ọnụ na mahadum Harvard.

    Ndị ọkaibe n’ihe teknụzụ na-ekwu na soshal midia ọhụrụ a bụ Threads nwereike ịrata ọtụtụ ndị mmadụ ọhụrụ ọkachasị ndị mgbanewe na-aga n’ihu n’ụlọọrụ Twitter na-akpasu iwe.

    Soshal midia Threads a nke ndị European Union enwebeghiike isonye na ya bụ ihe mmadụ nwereike iji ya gbasaa ozi ederede na mkpụrụ edemede 500 nakwa ihe ndị ọzọ o nwere nyere ngwa njirimara Twitter.

    N’ime awa asaa ka emepere soshal midia a, mmadụ nde 10 n’akụkụ ụwa wụbara ma debanye aha isonye na ya dịka Zuckerberg siri kwuo.

    O kwuobuola na “ime ka ya bụ ọbaozi dị mfe iji gbasaa ozi bụ ihe ga-eme ọ ree ahịa n’akụkụ ụwa niile”.

    Mana onyeisi ụlọọrụ Twitter bụ Elon Musk sara ya sị: “Ọ ka mma ndị mmadụ ịnweike ị na-ebuso ndị ọzọ agha na Twitter karịa izochi ihe nọ ha n’obi na Instagram ma na-eme ka obi adị ha mma.”

    Mgbe a jụrụ Zuckerberg ma Threads a ga-aka Twitter bụrụ ihe gbara agba n’ụwa, ọ sị “Ọ ga-ewetu obere oge mana e chere m na ọ ga-abụ ọbaozi ebe mmadụ karịrị otu ijeri ga-enweike na-ezukọ ma na-akpa nkata.”

    Mmepụta Threads pụtara n’oge ọtụtụ ndị mmadụ na-akata Musk na etu o siri na-agbanwe ọrụ Twitter nakwa usoro ọrụ ndị na-arụ ebe ahụ.

    N’ụbọchị Satọde a, onyeisi Twitter bụ Elon Musk beturu ọnụọgụgụ okwu ozi ndị mmadụ nwereike ịgụ n’ọbaozi Twitter ha n’ihi “ọrụ ha na-azụ n’ime” soshal midia ahụ.

    Nke a so n’echiche ọhụrụ Musk wepụtara iji mee ka ndị ọrụ debanye aha na malite ịkwụ ụgwọ iji nwata akụkụ Twitter nwere akara bụ ‘Twitter Blue’.

    Twitter kwukwara na ngwa ozi a ma ama dịka TweetDeck ga-abụzị ihe ọha ga-amalite ịkwụ ụgwọ maka ya n’abalị 30 na-abịa abịa.

    Kemgbe Musk weghaara ọchịchị ụlọọrụ a, ọtụtụ ndị na-eji Twitter agbasaozi ekwupụtala n'ihu ọha na ha enweghịzi afọ ojuju na soshal midia ahụ nakwa etu o siri ahazị ụlọọrụ ahụ dịka a na-akatọ ya maka agwa dị yayaya nakwa etu echiche ya n’ihe ndọrọndọrọ ọchịchị ya siri dị.

    N'ọnwa gara aga, Musk na onyeisi Meta bụ Mark Zuckerberg kwetara ị;ụ ọgụ n’ihu ọha (bịụ ihe a na-eche bụ okwu egwregwu) dịka ozi mbụ Zuckerberg wepụtara na soshal midia Threads kwukwara na ịlụ ọgụ ‘martials arts’ na-amasị ya.

    O kesara foto gosiri ihe egwuregwu nke rụrụ aka na Threads na Twitter yiri onwe ha.

  15. Nnọọnu!

    Ndị be anyị, unu asaala chi?

    Soro akụkọ niile dị mkpa ịkọ taa ebe a.

  16. Gọọmentị Naịjirịa ewepụtala atụmatụ nnakọ ụtụ isi ọhụrụ nye ndị ahịa

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ikpata akụnụba n’ala Naịjirịa bụ Federal Inland Revenue Service (FIRS) ewepụtala atụmatụ ịnakọ ndị ahịa ụtụ isi ọhụrụ.

    Atụmatụ nke a bụ nke ha na otu ndị ahịa Naịjirịa a kpọrọ ‘Market Traders Association of Nigeria’ (Matan) ga-ejikọ aka ọnụ mee.

    A na-ekwu na ụtụ isi a ga-emetụta ndịahịa ruru mmadụ nde 40 n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche.

    FIRS na-ekwu na atụmatụ a bụ iji belata ọtụtụ ụtụ isi ndị na-abụghị ndị ọrụ gọọmentị na-anakọ ndị mmadụ nke gụnyere “ụtụ megidere iwu na’aka ndị agboro” na-anaghị eru gọọmentị aka.

    Atụmatụ ọhụrụ a ga-eji teknụzụ ụlọakụ a kpọrọ “VAT Direct Initiative” were na-anakọzị ya bụ ego site n’akara njirimara onye nke Tax Identification Number (TIN).

    TIN ga na-enyocha ma esochi ụtụ isi azụ n’akpa ndị mmadụ iji hụ na a gbara ya n’anwụ ma gbochie aghụghọ ibanye nnakọ ego a.

    Ụlọọrụ na-ekwu na ọ bụ naanị mkpata ego pasentị iri na ụma si n’aka ụtụ isi a na-anakọ ndị mmadụ.

    Ngụkọ gosiri na Naịjirịa so na mba ebe nnakọ ụtụ isi kacha datụọ adatụ dịka Naịjirịa na-adabekarị mmanụ agbidi maka mkpata ego ya.

    Ndị ọkaibe n’ihe gbasara ụtụ isi na Naịjirịa na-ekwu na gọọmentị kwesịrị ịkwalite ịnakọ ụtụ isi n’aka ụmụafọ Naịjirịa iji beleta oke ibi ego n’aka mba ndị ofesi.

    Ọchịchị onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu na-agba mbọ ihụ na e hibere ụzọ dị iche iche a ga-esi kwalite akụnụba Naịjirịa nke so na nkwa ndị ọ kwere n’oge achụmnta vootu tinyere ya n’ọchịchị.

  17. Ndị be anyị ndeewonu!

    Nnọọnu n'ọbaozi anyị taa bụ ụbọchị nke ise n'ọnwa Jụlaị 2023.

    Soro akụkụ niile dị mkpa ịkọ taa niile ebe a.

  18. Gọvanọ Peter Mba ahọrọla Akeredolu-Ale dịka onyeisi ụlọntaakụkọ ESBS

    Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Peter Mba ahọrọla onye ntaakụkọ a ma ama bụ Ladi Akeredolu-Ale dịka onyeisi ọhụrụ ga na-elekọta ụlọọrụ ntaakụkọ steeti ahụ a na-akpọ 'Enugu State Broadcasting Service (ESBS).

    Akeredolu bụ onye ntaakụkọ a ma ama n'ụlọ ntaakụkọ Channels Television ebe ọ rụrụ ọrụ ọtụtụ afọ.

    "Akeredolu-Ale bụ onye ntaakụkọ nwetarala ọtụtụ nkwanyeugwu dị icheiche n'ime ihe karịrị afọ 30 ọ rụrụla ọrụ ntaakụkọ. Enwere m nchekwube na ọ ga-agbanwe ụlọọrụ ntaakụkọ anyị, weta ọtụtụ ihe ọhụrụ ma mee ka ESBS bụrụ ụlọọrụ ga na-ewebatara gọọmentị Enugwu Steeti nnukwu ego," ka Mba kwuru n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Tuzde.

    Ladi Akeredolu-Ale gụrụ akwụkwọ na Mahadum Ilorin nakwa Mahadum Lagos, ebe o nwetara nzere B.Sc na M.Sc na ngalaba mmụta 'Sociology'.

    Ọ gụkwara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ 'Lagos Business School

    O nwetakwara ọzụzụ na mgbasaozi site n'aka otu 'National Association of Broadcasters' nke mba Amerịka.

  19. Etu ndị ekperima na-amanye 'sit-at-home' si wakpo Abakiliki n'ụbọchị Tuzde

    Ndị ekperima bucha egbe wakporo mpaghara dị icheiche n'Abakiliki, isi obodo Ebonyi Steeti, n'ụbọchị Tuzde, chụsasịa ndị mmadụ, gbaa ụgbọala ndị uweojii nakwa nke ndị nkịtị ọkụ tupu ha agbalaga.

    Akụkọ kwuru na ndị ekperima a wakporo Ukwuagba Ngbo nke dị n'okpuru ọchịchị Ohaukwu, ebe ndị uweojii nọ ọrụ ebe ahụ riri mbọmbọ ọsọ, ha wee mụnye ụgbọala ndị uweojii ahụ ọkụ.

    Onyeisioche okpuruọchịchị Ohaukwu bụ Ikechukwu Onwe, gwara onye ntaakụkọ anyị na ya katọrọ mwakpo ahụ ma kpọkwaa ndị ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara ahụ ka ha gbakọọ aka ọnụ iji gbochie etu ndị omekome si akpa ike na mpaghara ha.

    Akụkọ kwukwara na ndị ekperima wakporo mpaghara ahịa Isieke, gbaa egbe, chụsaa ndị mmadụ ma gbaa ụfọdụ ọgbatumtum ụkwụ atọ ọkụ.

    Nke a na-abịa dịka Simon Ekpa, onyeisi otu a kpọrọ 'Auto Pilot', nyere iwu ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ niile ruo otu izuụka.

    'Auto pilot' bụ otu kewapụrụ n'ime otu Ipob, nke bụ ndị na-azọ nnwereonwe Biafra.

    N'ụbọchị Mọnde, ndị ekperima a na-eche na ha bụ ndị 'Auto-pilot' wakporo mpaghara dị icheiche n'Aba, Abia Steeti ma gbaa ụfọdụ ụgbọala ndị mmadụ ọkụ, dịka ha na-amnaye ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ.

    Ha kwuru na iwu 'sit-at-home' ahụ bụ iji gosi iwe ha maka etu gọọmentị Naịjirịa si jichie onyeisi ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu.

    Gbasara mwakpo a mere n'ụbọchị Tuzde, gọọmentị Ebonyi Steeti agwala ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ egwu kama ka ha na-agara onwe ha mkpa ha dị icheiche maka na ndị ọrụ nchekwa akwụrụla chịm ichekwa ha.

  20. Ogbunigwe agbagbuola mmadụ atọ si n'otu ezinaụlọ na Mogadishu

    Mmadụ atọ si n'otu ezinaụlọ anwụọla ebe atọ ọzọ merụrụ ahụ mgbe a tụrụ ogbunigwe n'ebe obibi ndị nkịtị na Waberi nke Mogadishu bụ isiobodo Somalia.

    Nne, nwa nwoke na nwa nwaanyị si n'otu ezinaụlọ mmadụ isii nwụrụ ebe nne na ụmụ ndị nwaanyị abụọ merụrụ ahụ.

    Ogbunigwe a tụrụ n'ụtụtụ Tuzde gbara n'ebe obibi ndị mmadụ n'obodo ahụ. Ụlọ o metụtara dị nso n'isiụlọọrụ ministri na-ahụ maka nchekwa.

    Otu al-Qaeda nke mgbọrọgwụ ha bụ al-Shabab kwuru na ha mere mwakpo, na ebe ha lekwasịrị anya bụ ụlọ gọọmenti nwe gụnyere obi ọchịchị onyeisiala.aid it carried out the attack adding that it targeted government buildings including the presidential palace.

    Ndị ọrụ nchekwa na Mogadishu ekwubeghi okwu banyere nke a.