Presidential Election Tribunal:Ụlọikpe kụpụrụ arịrịọ Labour Party ịgba Inec Ajụjụ
Ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ntuliaka bụ Presidential Election Tribunal nọ n'ikpe ụbọchị Satode kụpụ arịrịọ Peter Obi rịọrọ site n'olu ndị ọkaiwu ya ka ha nwee ohere gbaa Inec ajụjụ.
Ọkaikpe nọ n'isi okwu ahụ bụ Jọstis Haruna Tsammani tara Labour Party ụta maka iwetaghị akwụkwọ arịrịọ ahụ n'oge.
Mana Labour Party gara n'ihu wetakwa ihe akaebe ndị ọzọ nke gụnyere ihe onyonyo gosiri ọgbakọ ọzụzụ Inec mere ndị okwu ndọrọndọrọ ọchịchị metụtara nke Onyeisioche Inec bụ Yakubu Mahmood nọ n'isi ya.
N'ọgbakọ ahụ,Mahood kwere nkwa na a ga-etinye mpụtara ntuliaka n'igwe IREV ozigbo a na-agụkọ ya.
Ihe onyonyo nke abụọ gosiri mkparịtaụka nke kọmishọna Inec na-ahụ maka nkuzi na mgbasaozi banyere atụmvootu bụ Festus Okoye na onye ntaakụkọ Channels TV nwere bụ ebe Okoye kwukwara na a ga-eji IREV zipụ mpụtara ntuliaka ozigbo a gụkọchara ya n'ọgbọ atụmvootu.
Dịka ọkaiwu Labour Party bụ Jubrin.S Okutepa(SAN) siri kọwaa, ya bụ ihe onyonyo ahụ bụ iji gosi ebe Mahmood nakwa ndị ọzọ welitere isi n'Inec kwere nkwa tupu ntuliaka nke ha emezughị mgbe oge ruru.
Labour Party wetakwara akwụkwọ EC40GBU Forms nke okpuru ọchịchị isii dị na Benue steeti.
E higharịrị ikpe ahụ gaa Tuzde,abalị 13 nke ọnwa Juun afọ 202