You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Supreme Court: Ihe ndị mere taa n'Ụlọikpe Kachasị n' ikpe Atiku,Obi megide Tinubu

Lee ihe niile gbasara ikpe mkpesa n'ụlọikpe na ka o si aga.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Adline Okere, Chioma Nkemdilim Daramola, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa

  1. Presidential Election Tribunal:Ụlọikpe kụpụrụ arịrịọ Labour Party ịgba Inec Ajụjụ

    Ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ntuliaka bụ Presidential Election Tribunal nọ n'ikpe ụbọchị Satode kụpụ arịrịọ Peter Obi rịọrọ site n'olu ndị ọkaiwu ya ka ha nwee ohere gbaa Inec ajụjụ.

    Ọkaikpe nọ n'isi okwu ahụ bụ Jọstis Haruna Tsammani tara Labour Party ụta maka iwetaghị akwụkwọ arịrịọ ahụ n'oge.

    Mana Labour Party gara n'ihu wetakwa ihe akaebe ndị ọzọ nke gụnyere ihe onyonyo gosiri ọgbakọ ọzụzụ Inec mere ndị okwu ndọrọndọrọ ọchịchị metụtara nke Onyeisioche Inec bụ Yakubu Mahmood nọ n'isi ya.

    N'ọgbakọ ahụ,Mahood kwere nkwa na a ga-etinye mpụtara ntuliaka n'igwe IREV ozigbo a na-agụkọ ya.

    Ihe onyonyo nke abụọ gosiri mkparịtaụka nke kọmishọna Inec na-ahụ maka nkuzi na mgbasaozi banyere atụmvootu bụ Festus Okoye na onye ntaakụkọ Channels TV nwere bụ ebe Okoye kwukwara na a ga-eji IREV zipụ mpụtara ntuliaka ozigbo a gụkọchara ya n'ọgbọ atụmvootu.

    Dịka ọkaiwu Labour Party bụ Jubrin.S Okutepa(SAN) siri kọwaa, ya bụ ihe onyonyo ahụ bụ iji gosi ebe Mahmood nakwa ndị ọzọ welitere isi n'Inec kwere nkwa tupu ntuliaka nke ha emezughị mgbe oge ruru.

    Labour Party wetakwara akwụkwọ EC40GBU Forms nke okpuru ọchịchị isii dị na Benue steeti.

    E higharịrị ikpe ahụ gaa Tuzde,abalị 13 nke ọnwa Juun afọ 202

  2. PEPT: Ihe onye ọrụ Inec PDP kpọrọ akaebe taa kwuru

    Onye ọrụ ngo Inec agbaala akaebe n'igwe BVAs arụghị ọrụ dịka ha enwelighị ike iji ya zipụ mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala n'ọgbọ atụmvootu ebe ọ rụrụ na Ntuliaka Onyeisiala afọ 2023.

    PDP na Atiku Abubakar gbara Inec, APC na Bola Ahmed Tinubu akwụwkwọ ịgbagha mpụtara ntuliaka 2023 nke Inec kpọpụtara Tinubu dịka onye meriri.

    Onye ọrụ Inec gwara ụlọikpe taa bụ Satọde na ihe nile ndị ọzọ gara siri werere mana naanị na BVAS arụghị ọrụ.

    O kwuru na mpụtara ya denyere denyere na akwụkwọ "Form ECA8" bụ ngụkọ ihe e nwetara n'ọgbọ atụmvootu ya n'ezie bụ nke ya zigara n'ebe nchịkọta vootu na wọọdụ dịka ya jichara igwe BVAS see ya foto.

    O kwuru na ya enweghị ike ịbanye n'ọbaozi Inec.

    Ọkaiwu na anịọchite Atiku kpọkwara ndị akaebe ndị ọzọ.

    E mechara higharịa ikpe ahụ gaa Tuzde, abalị 13 nke ọnwa Juun.

  3. Labour Party akpọọla 'Channels TV' dịka onye akaebe

    Otu Labour Party kpọọ onyeisi ụlọmgbasaozi Channnels TV dịka onye akaebe n'ụlọikpe pụụ iche maka ntuliaka n'Abuja n'ụbọchị Fraide.

    Onye nọchitere ụlọrụ ahụ bụ Lucky Obewo Isawodo nke bụ onyeisi ntakụkọ na ngalaba ụlọmgbasaozi aghụ n'Abuja.

    Mana ọkaiwu na anọchite Bola Tinubu na Shettima gbaghara nke a ma jụkwa sịkwa ka a ghara ịnabata ihe onyonyo akaebe Labour Party wetara.

    Okaikpe Ụlọikpe bụ Jọstịs Haruna Tsammani higharịrị ikpe ahụ gaa echi .

  4. Anyị akpọọla ndị akaebe 16 ugbua - PDP

    Ndị ọkaiwu PDP ekwuola na ha akpọọla ndị aka ebe iri na isii kamgbe ha malitere ikpe ha ịgbagha mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere na Febrụwarị 2023.

    Inec kwuru na ọ bu Bola Ahmed Tinubu nke APC meriri ntuliaka a, mana PDp na-agbagha ya. Ha sị na ọ bụ onye nke ha bụ Atiku Abubakar meriri ntuliaka ahụ.

    N'ikpe nke taa, Chris Uche (SAN) nọchitere anya PDP; A.B Mahmood (SAN) nọchitere anya INEC; Akin Olujimi (SAN) nọchitere anya Tinubu/Shettima, ebe ọkaiwu L.O Fagbemi (SAN) nọchitere anya APC.

    Ndị ọkaiwu PDp kpọrọ ndị akaebe anọ taa, bụcha ndị rụrụ ọrụ dịka 'Presiding Officer' n'ụbọchị ntuliaka. Ha anọ gbara ama etu ọbaozi Inec ebe ha kwesịrị iziga mpụtara ntuliaka nke ha si jụ ịrụ ọrụ n'ụbọchị ahụ.

    Otu n'ime ndị akaebe a kwuru na nke a butere ọgbaaghara nke mere ka a kagbuo mpụtara ntuliaka n'ọgbọ vootu (polling unit) nke ya.

    Oge ndị ọkaiwu jụrụ ha ihe mere na ha esoghi usoro 'offline' were ziga mpụtara ntuliaka nke ha, otu n'ime ndị akaebe ahụ kwuru na Inec akụzighiri ha ihe ọbụla gbasara 'offline' oge a na-enye ha ọzụzụ.

    Emechara yigharịa ụbọchị ikpe a ka ọ dị echi bụ ụbọchị Satọde, Jun 10, 2023.

    Na mkparịtaụka ha na ndị ntaakụkọ dịka ike nke taa bịara na njedebe, ndị ọkaiwu PDP kwuru na ha akpọọla ndị akaebe 16 ugbua, ma na-atụ anya ịkpọkwa ọtụtụ ọzọ.

  5. Etu e siri nabata mkpesa Peter Obi n'ụlọikpe mkpesa ntuliaka

    Otu onye akaebe Labour Party n’ụbọchị Tọọzde rụrụ Inec aka maka imetọ usoro ntuliaka onyeisiala 2023.

    Mgbe mkpesa malitere, otu Labour Party (LP) kọpụtara otu onye akaebe nke kwuru na ọ na-arụ ọrụ dịka ‘software engineer’.

    Ndị ọkaiwu Labour Party, Inec, Onyeisiala Bola Tinubu na APC wụchiri n’oge nke bụ:

    • Livy Uzoukwu. SAN(LP)
    • A.B Mahmood. SAN (Inec)
    • Akin Olujimi. SAN (Tinubu na Shettima)
    • L.O Fagbemi .SAN (APC)

    Onye akaebe LP ahụ kwuru na dịka onye ọkaibe n’ihe gbasara teknụzụ ọ mere nnyocha maka etu e siri ziga mpụtara ntuliaka si akụkụ dị iche iche na ọbaezi Inec bụ Irev, ọ rụrụ aka na ọ dị ya ka e nwere ndị kpara nkata ịhụ na nrụrụaka banyere n’usoro ntuliaka ahụ.

    Ebubo a kpasuru ọkaiwu Inec bụ A.B Mahmood iwe dịka ọ gbaghara ya bụ okwu ma kwuo site n’akwụkwọ ndị e weterela n’ụlọikpe ahụ na Inec so usoro nchekwa n’ihe gbasara teknụzụ kacha elu.

    Dịka a nụchara mkpesa ndị a nakwa etu e siri gbaghaa ya Peter Obi bụ onye zọọrọ LP ọkwa ma bụkwa onye batara ụlọikpe ahụ ibute mkpesa banyere okwu ndị a wetere ụlọịkpe mpụtara ntuliaka 2023 nke ụbọchị Febrụwarị 25.

    Otu onye ọkaịwụ LP bụ Paul Ananaba weteere ụlọikpe ahụ akwụkwọ EC8DA bụ mkpụtara ntuliaka ahụ.

    Ananaba butekwara ihe akaebe ndị ọzọ bụ akwụkwọ EC8As, EC8Bs na EC8Cs bụ ndị si ọgbọ ntuliaka, wọọdụ nakwa okpuru ọchịchị dị iche iche na steeti 18 bụ ebe ndị ha na-agbagha mpụtara ntuliaka si ebe ahụ. Nke a gụnyere Bayelsa, Benue, Cross River, Ebonyi, Edo, Lagos, Niger, Ondo, Oyo, Rivers, Sokoto, Ekiti na Delta steeti.

    Ihe mere Inec jiri gbagha akwụkwọ ndị Peter Obi butere

    Inec agbaghaghị akwụkwọ ndị LP na Obi bụtere bụ mpụtara ntuliaka si ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị. Ọkaiwu Inec ekwughi ihe mere ha jiri hapụ ịgbagha ya.

    N’otu ahụ, ndị ọkaiwu onyeisiala Tinubu nakwa APC agbaghaghị ya – Mana ha gbaghara mpụtara ntuliaka ndị LP wetere nke ha sị si ndị si ọgbọ ntuliaka, wọọdụ nakwa okpuru ọchịchị dị iche iche na Naịjirịa.

    Mana ọkaiwu LP bụ Ananaba kwuru na ha adịla njikere iwetere ụlọikpe ahụ akwụkwọ EC40G bụ nke nwere etu e siri kesa ihe e ji atụ ntuliaka na steeti dị iche iche.

    Ka ụlọikpe nụchara okwu ndị a, e yigharịrị ikpe ahụ gaa ụbọchị itoolu nke Juun, 2023.

  6. Justice Tsammani: "Agaghị ekwu ihe ọbụla gbasara ndị akaebe ruo mgbe m ga-enye ikpe"

    Taata n'ụlọikpe, otu pati PDP wetara ụfọdụ ndị ha jiri akwụkwọ kpọkuo n'ụlọikpe bụ ndị ọrụ ngo ndị ụlọọrụ INEC.

    O gosikwara ụlọikpe akwụkwọ e jiri kpoku ya n'ụlọikpe. Ụlọikpe anabata ya.

    Ọ sị na oge e kwesiri inye ya bụ akwụkwọ onyeakaebe agafeela.Okwu onyeaka ebe ka e debanyere n'ụbọchị isiin'ọnwa Juunu 2023.

    A.B Mahmood, SAN bụ ọkaiwu ndị INEC soro na nzọmụkwụ ọkaiwu L.O. Fagbemi nke APC, ha anabatakwaghị akwụkwọ a ndị ọkaiwu Tinubu anabataghị.

    N'otu aka, Chris Uche, SAN bụ ọkaiwu otu patị PDP sị ka ụlọ omeiwu kagbuo ya bụ okwu APC na Inec.

    O chetara ndị ọkaiwu mpaghara 54 n'akwụkwọ iwu Electoral Act 2022. N'okwu ya, ọ sị na mpaghara edemede iwu a sị n'ụdị ikpe n'ụlọikpe a, akaebe ọbụla kwesịrị ịbịa n'ụlọikpe n'abụghị nke aka ya mana nke ha jiri iwu mee ya ka ọ bịa ụlọikpe etu o kwesịrị.

    Ọ sị na ọ ga-abụ ịda iwu ma ọ bụrụ na ha ekweghị ka onye akaebe enyeghị akaebe ya maka na ndị ọkaiwu ekwesghị. Ọ sịkwa na ha enweghịke ime ka onye akaebe ejiri akwụkwọ kpọbaa n'ụlọikpe enweghịike ịbụ onye mbụ na-agba akaebe. Ebe a ka ụlọikpe gatụrụ ezumike.

    Ikpe PDP amalitela n'ụlọikpe n'Abuja n'elekere 10 n'ụtụtụ taa.

    Justice Tsammani malitere ya bụ ikpe a ka ha si oge ezumike lọta.

    Ọ si na ọ gaghị ekwu ihe ọbụla gbasara ya bụ ikpe ruo mgbe ọ ga-enye ikpe ya.

    Ọ si ka ha malite.

    N'ụlọikpe taata

    Onye aka ebe mbụ bi n'Abuja sị na ọ bụ 'polling officer' P O dị na ọdọ ntuliaka 017 dị na ward 3, n'Aba Nọọtụ n'Abia steeti.

    Ọ sị na ka emechara ntuliaka, o nwereike inyefe mpụtara ntuliaka Sineti nakwa ụlọomeiwu mana o nweghị ike ime nke ọkwa Onyeisiala maka netwọk bidoro nyewe nsogbu.

    Ya mere o jiri ziga ya bụ mpụtara ntuliaka n'ụzọ esighị nke intaneti ma mekwa ka o nyefee ya mgbe netwọk dịwara mma.

    O gosikwara ụlọikpe akwụkwọ e jiri kpoku ya n'ụlọikpe.

    Ụlọikpe nabatara ya bụ akwụkwọ mkpoku a

    Onyeọkaiwu Tinubu bụ Wole Olanipekun, SAN anabataghị okwu onyeakaebe a. N'okwu ya maka na iwu ntuliaka nyere oge ndị akpọkuru dịka ndị akaebe mana iwu enyeghị nkewa n'okwu ndị na-enye aka ebe akpọkuru.

    Ma ndị okaiwu Tinubu, INEC na APC ekweghị ịnabata akaebe ọ nụrụla iyi.

  7. Ụtụtụ Igbo ndị ọma!!!

    Amalitela ikpe mkpesa maka ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa taa.

    Sonye anyị ebe a.

  8. Labour Party ewepụtala ihe akaebe si steeti 17

    Ụlọikpe pụrụ iche e hiwere maka ikpe Ntuliaka onyeisial afọ 2023 ehigharịala ikpe gaa echi bụ Abalị asatọ nke ọnwa Juun afọ 2023.

    Otu Labour Party wepụtara n'ụlọikpe akwụkwọ 'Forms EC8Cs' nke ntuliaka Onyeisiala nke afọ 2023 e mere n'ụfọdụ Okpuru Ọchịchị na Naijiria nke Inec binyere aka.

    Ha wepụtakwara akwụkwọ "Form EC8DA nke ọkaiwu Bola Tinubu Na Shettima,APC nakwa Inec jụrụ ka a nabata mana ụlọikpe gara n'ihu nabata akwụkwọ ndị a.

    Akwukwọ ihe akaebe ahụ gụnyere nke:

    1. Okpuru Ọchịchị asatọ na Bayelsa steeti

    2. Okpuru Ọchịchị 23 na Benue state

    3. Okpuru Ọchịchị 18 na Krọs Rivas Steeti

    4. Okpuru Ọchịchị 10 n' Ebonyi steeti

    5. Okpuru Ọchịchị 18 n' Edo steeti

    6. Okpuru Ọchịchị 20 na Lagọs steeti

    7. Okpuru Ọchịchị 25 na Niger steeti

    8. Okpuru Ọchịchị 18 n' Ondo steeti

    9. Okpuru Ọchịchị 33 n'Oyo steeti

    10 Okpuru Ọchịchị 23 na Rivas steeti

    11. Okpuru Ọchịchị 23 na Sokoto steeti

    12.Okpuru Ọchịchị 19 n' Ekiti Steeti

    13. Okpuru Ọchịchị 25 na Delta steeti

  9. Anyị kwụrụ Inec N6.6m iji nwete akwụkwọ akaebe e jiri mee ntuliaka – PDP

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka gara n’ihu ileba anya n’akwụkwọ akaebe na ndị akaebe PDP wetara n’ihu megide mmeri Bola Ahmed meriri na ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

    N’elekere itoolu n’ụbọchị 7 juun, 2023, ọkaiwu Atiku na PDP bụ Chris Uche nyere ụlọikpe a akwụkwọ e jiri mee ntuliaka nke ha ụlọọrụ binyere aka ma nye ha.

    Mana ọkaiwu Inec, APC, Tinubu na Shettima jụrụ ịnabata akwụkwọ ahụ ma sị na ha ga-akọwa ihe mere ha jiri jụụ.

    Mana ụlọikpe gara n’ihu nabata akwụkwọ akaebe ahụ si n’aka PDP.

    Ọkaiwu PDP kwuru na-agbanyeghi na ha kwụrụ ụlọọrụ Inec ego ruru nde naịra isii na ụma isii (N6.6m), ha jụrụ inye ha akwụkwọ akaebe niile ha chọrọ.

    Onye akaebe ndị PDP kpọtara bụ onyeisi pati ha n’Anambra steeti kwuru na o tinyere aka n’akwụkwọ EC8A mgbe ọ chọpụtara na a gaghị enye ya akwụkwọ ahụ ma ọ bụrụ na o tinyeghi aka na ya.

    E bugharịrị ikpe ahụ gawa n’ụbọchị 08 Juun, 2023 dịka ndị ọkaiwu Inec, Tinubu, APC na Shettima kwuru na ha ga-eleba anya n’ihe ndị akaebe PDP na-ekwu.

  10. Igbo ndị ọma unu emeela

    Igbo ndị ọma anyị na-anabata unu n'okwu ikpe banyere ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.

    Bịa soro anyị ka ị maara etu ikpe ahụ si aga.

  11. Ihe mere taa n'ụlọikpe mkpegharị gbasara okwu ntuliaka ọkwa onyeisiala nke 2023

    Ikpe nke taa abịala n'isi njedebe n'ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja, dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' na 'Labour Party' na-agbagha mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke e mere n'ọnwa Febrụwarị 2023.

    Dịka ikpe malitere ọkaiwu nọchitere anya PDP bụ Eyitayo Jegede kwuru na ha wetara akwụkwọ 'Form EC8B' nke si n'okpuru ọchịchị iri na Kogi Steeti, dịka ihe akaebe ha.

    Jegede kọwara na ọ bụ naanị 'Form EC8B' si n'okpuru ọchịchị iri ka Inec nyere ha n'agbanyeghị na ihe ha nara Inec bụ nke okpuru ọchịchị niile dị na Kogi steeti.

    O kwukwara na ka ọ dị ugbua, ha akwụọla Inec ihe karịrị nde naịra isii iji nweta akwụkwọ niile ndị a e ji mee ntuliaka bụ nke ha wetara n'ụlọikpe dịka ihe akaebe ha.

    Mana ndị ọkaikpe kwuru na ha chọpụtara na ndị ọkaiwu PDP ahazichaghị ihe akaebe ha nke ọma etu o kwesịrị, ma gwa ha ka ha buru ya ga hazie ya nke ọma.

    Ndị ọkaiwu PDP rịọrọ ka e yigharịa ụbọchị ikpe nke ha iji nye ha ohere ịhazi ihe akaebe ha nke ọma tupu ha eweghachite ya n'ụlọikpe.

    Ndị ọkaikpe kwenyeere ha ma yigharịa ụbọchị ikpe ka ọ dị n'ụbọchị Wenezde, bụ ụbọchị asaa nke ọnwa June afọ 2023.

    Ikpe nke ndị 'Labour Party' malitere n'ebe elekere abụọ nke ehihie.

    Oge ikpe malitere, ọkaiwu ndị LP bụ Ben Anachebe kwuru na ihe ha nwere ime taa bụ iweta akwụkwọ 'Form EC8B' nke si n'okpuru ọchịchị dị icheiche na steeti iri na atọ na Naịjirịa dịka ihe akaebe ha.

    Ha wetara ihe akebe a n'usoro a:

    • Adamawa Steeti - Okpuru ọchịchị 22
    • Bayelsa Steeti - Okpuru ọchịchị asatọ
    • Benue Steeti - Okpuru ọchịchị 23
    • Kogi Steeti - Okpuru ọchịchị 21
    • Nasarawa Steeti - Okpuru ọchịchị 11
    • Niger steeti - Okpuru ọchịchị 25
    • Delta Steeti - Okpuru ọchịchị 18
    • Ekiti Steeti - Okpuru ọchịchị 11
    • Imo Steeti - Okpuru ọchịchị 25
    • Kaduna Steeti - Okpuru ọchịchị 21
    • Ondo Steeti - Okpuru ọchịchị 18
    • Sokoto Steeti - Okpuru ọchịchị 23
    • Oyo Steeti - Okpuru ọchịchị 27

    Cheta na ndị LP ewetabuola akwụkwọ 'Form EC8A' si na steeti 20 dịka akaebe n'ụbọchị ikpe ndị gara aga.

    Matakwa na 'Form EC8A' na 'Form EC8B' bụcha ụdị akwụkwọ e ji edepụta mpụtara ntuliaka, mana ha abụghị otu ihe kpọmkwem. Lee ndị iche dị na ha:

    Form EC8A : Ka e ji edepụta mpụtara ntuliaka n'ọgbọ vootu ọbụla (polling unit)

    Form EC8B : Ka e ji edepụta mpụtara ntuliaka na 'ward' ọbụla

    Form EC8C : Ka e ji edepụta mpụtara ntuliaka n'okpuru ọchịchị ọbụla (Local govt)

    Form EC8D: Ka e ji edepụta mpụtara ntuliaka na steeti. Akwụkwọ a ka e jikwa edepụta mpụtara ntuliaka nke ụlọ omeiwu ukwu na nke nta (House of Reps na Senate)

    Form EC8E: Ka e ji edepụta mpụtara ikpeazụ nke ntuliaka ahụ (Final result)

    Form EC60EC: Ka e ji edepụta mpụtara ntuliaka n'ọgbọ vootu (Polling unit) ọbụla, bụ nke a ga-amapanye n'ahụ aja n'ọgbọ vootu ahụ ka onye ọbụla na-ahụ ya

  12. 'Labour Party' ewetakwala ihe akaebe si steeti asatọ ọzọ n'ụlọikpe taa

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party ewetala ihe akaebe si steeti asatọ ọzọ n'ụlọ ikpe mkpegharị dịka ikpe gbasara mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke afọ 2023 ka na-aga n'ihu.

    N'ikpe nke taa bụ Mọnde, ụbọchị ise nke ọnwa Jun, onye nọchitere anya Labour Party bụ ọkaiwu aha ya bụ Patrick.I.N Ikweto (SAN); A.B Mahmood (SAN) nọchitere anya Inec; Wole Olanipekun (SAN) nọchitere anya Tinubu na Shettima, ebe L.O Fagbemi (SAN) nọchitere anya APC.

    Ndị ọkaiwu LP wetara ihe akaebe nke bụ akwụkwọ 'form EC8A' ebe e debanyere mpụtara ntuliaka n'okpuru ọchịchị dị icheiche na steeti asatọ ndị a:

    • Ebonyi steeti - Okpuru ọchịchị 13
    • Nasarawa steeti - Okpuru ọchịchị 13
    • Delta steeti - Okpuru ọchịchị 25
    • Kaduna staeeti - Okpuru ọchịchị 23
    • Kogi Steeti - Okpuru ọchịchị 21
    • Imo steeti - Okpuru ọchịchị 27
    • Ondo steeti - Okpuru ọchịchị 18
    • Sokoto steeti - Okpuru ọchịchị 7

    Cheta na n'izuụka gara aga, ndị ọkaiwu LP wetara ihe akaebe 'form EC8A' nke si na steeti 12. E tinyere ya steeti asatọ nke ha wetara taa, ọ pụtara na ewetala ihe akaebe si na steeti 20.

    Mana ọkaiwu APC mere mkpesa na ndị ọkaiwu Labour Party anaghị erube isi na nkwekọrịta ha nwere nke bụ na otu abụọ ahụ ga-ezute kpaa maka ihe akaebe a na-eweta n'ụlọikpe opekatampa otu ụbọchị tupu ụbọchị ikpe.

    Ọkaiwu Fagbemi (SAN) bụ onye na-anọchite APC kwuru na ndị ọkaiwu LP gosiri ha ihe akaebe ha ji bịa ụlọikpe taa ihe dịka nkeji iri gara aga.

    Onyeisi ọkaikpe bụ Haruna Tsammani dọrọ ndị ọkaiwu LP aka na ntị ka ha kwụsị ụdị omume a, ọkaiwu Ikweto kwekwara nkwa na ọ gaghị emezi ọzọ.

  13. Etu e si buga ikpe PDP ụbọchị isii nke ọnwa Juun

    Ikpe nke taa bụ ụbọchị Mọnde abalị ise n’ọnwa Juun, 2023 malitere n’elekere itoolu nke ụtụtụ.

    Ndị ọkaiwu na-anọchite ndị ikpe a metụtara gbakọrọ n’oge nke gụnyere:

    • May Agbamuche ọkaiwu Inec
    • L.O Fagbem SAN ọkaiwu APC
    • Chris Maigida osote ọkaiwu APC
    • Ehitayo Jegede SAN ọkaiwu PDP
    • A. B Mahmood SANọkaiwu Inec
    • Akin Olujimi SAN ọkaiwu Bola Tinubu

    Ndị ọkaikpe PDP kpọtara ndị akaeba anọ n’ikpe taa iji mee mkpesa n’okwu nrụrụaka nakwa ihe ndị ọzọ ha sị mere n’oge ntuliaka 2023.

    Nke a mere ya nchịkọta onye akaebe nke asaa ha na-akpọta ụlọikpe kemgbe ikpe ha malitere.

    Ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka gbakọrọ ịnụrụ ikpe otu Peoples Democratic Party (PDP) na onye zọọrọ ha ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 bụ Atiku Abubukar nwere megide Onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu, otu All Progressives Congress (APC) nakwa ụlọọrụ nhazị ntuliaka Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) maka ebubo na usoro ntuliaka 2023 agaghi n’ụzọ ziri nakwa na mmeri Tinubu ezighi ezi.

    Ụlọikpe nabatara ịnụ olu onye akaebe nke mbụ PDP kpọtara taa dịka o kwuru na ọ bụ onye dọkịnta ma bụrụkwa onye ojiegoachụego na Rivas steeti.

    Onye akaebe nke abụọ a nụrụ olu ya bụ onye ọkọọ ugbo si Abuja ma bụrụkwa onyeisioche PDP n’Abuja. Onye nke atọ bụ onye ojiegoachụ ego bi n’Abuja ebe onye nke an bụ onye ọrụ ‘Human resources; na Nasarawa.

    A.B Mahmood nke Inec natara ụlọikpe ohere ka ogbo ya bụ Abdullahi Aliyu gaa ndị ajụjụ ọnụ na mkpesa ha dịka Fagbami nke APC natara ụlọikpe ikike ha ogbo ya bụ Rotimi Oguneso gaa ndị akaebe ahụ ajụjụ ọnụ.

    Onye akaebe nke mbụ gbara ama na Atiku Abubakar enwetaghi 25% vootu dịka o kwuru na ọ kpagharịrị n’akụkụ ọgbọ ntuliaka dị iche iche ụbọchị e mere ntuliaka.

    Ọkaiwu Inec rụrụ onye akaebe nke atọ aka ma kwuo na okwyu ọnụ ya nakwa onye akaebe bụ otu ihe kpọm kwem mana o kwuru na ọ maghị ihe ọbụla gbara okwu a rụrụ ya aka maka ya.

    Onye nke anọ kwuru na ndị ọrụ Inec ekweghi zigaa ozi nakwa vootu ndị si ọgbọ ntuliaka ndị ọ mere njem gaa ụbọchị ntuliaka n’ọbazị Inec n’ihi na ịntanetị ngwa teknụzụ Inec arụghị ọrụ ụbọchị ahụ.

    O kwuru na nke a mere o jiri binyeaka n’akwụkwọ e jiri tụọ vootu nke kwuru na vootu agaghị n’ihu ebe ahụ mana ha hụrụ nke nwere ọtụtụ nkagbu ugbua nke na-arụ aka na e mere nrụrụaka ebe ahụ. Onye nke anọ gara na ihu gwaa ụlọikpe ka ha ghara ịnabata mpụtara ntuliaka si steeti ahụ ma kwukwa na LP enwetaghị mmeri ọbụla na Nassarwa.

    Ụlọikoe nụchara mkpesa ha dịka PDP rịọrọ ka eyigharịa ikpe ahụ n’ihi ndị akaebe ha agwụla maka nke taa.

    Ụlọikpe nabatara mkpesa ha ma bụga ikpe ahụ ụbọchị Tuzde, abalị isii nke ọnwa Juun.

  14. Ọ gbagwojuru anyị anya Inec ịjụ ịnabata mpụtara ntuliaka ha nyere anyị - Ọkaiwu LP

    Ọkaiwu 'Labour Party' bụ Livy Uzoukwu ekwuola na ọ bụ ihe mgbagwoju anya na Inec na-agwa ụlọikpe ka ha ghara ịnabata mpụtara ntuliaka nke e dere n'akwụkwọ 'form EC8A' bụ nke ha bụ ndị LP wetara n'ụlọikpe dịka ihe aka ebe.

    Uzoukwu kwuru nke a n'ụlọikpe mkpegharị taa dịka ikpe gbasara mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere n'ọnwa Febrụwarị ka na-aga n'ihu.

    LP na ndị ọkaiwu ha wetara mpụtara ntuliaka si n'okpuru ọchịchị dị icheiche na steeti isii dịka ihe akaebe ha.

    Steeti ndị a gụnyere Adamawa steeti (okpuruọchịchị 21); Bayelsa steeti (okpuruọchịchị asatọ); Oyo steeti (okpuru ọchịchị 31); Edo steeti (okpuru ọchịchị 18); Legọs Steeti (okpuru ọchịchị 20), na Akwa Ibom Steeti (okpuru ọchịchị 31).

    Nke a mere ya steeti asatọ nke ndị ọkaiwu LP wetara mpụtara ntuliaka ha dịka ihe akaebe, cheta na ha wetara mpụtara nke Rivers na Niger Steeti n'ụbochị Tọzde, bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Jun 2023.

    Mana ndị ọkaiwu Inec, ndị nke APC, na ndị nke Tinubu na Shettima kwuru na ha akwadoghị ka ụlọikpe nabata mpụtara ntuliaka ndị a n'akaebe.

    Nke a mere ka Livy Uzoukwu gwa ndị ọkaikpe na ya bụ ihe gbagwojuru ha bụ ndị ọkaiwu LP anya, n'ihi na mpụtara ntuliaka ndị ahụ ha wetara n'ụlọikpe bụ nke Inec nyere ha.

    "Ọ gbara anyị gharịị na Inec na-ekwu na mpụtara ntuliaka nke ha onwe ha nyere anyị ekwesịghị ka ụlọikpe nabata ya n'akaebe," Uzoukwu kwuru.

    Mana onyeisi ndị ọkaikpe ahụ bụ Haruna Tsammani gwara ọkaiwu Uzoukwu ka ọ dị njikere maka ọtụtụ ihe mgbagwojuanya ka ga-abịa n'ọdịnihu.

    Ụlọikpe gara n'ihu ịnabata akwụkwọ akaebe niile ahụ ndị ọkaiwu LP wetara.

    Ndị ọkaikpe mechara yigharịa ikpe ahụ ka ọ dịzie n'ụbọchị Mọnde, bụ ụbọchị ise nke ọnwa Jun 2023.

  15. Labour Party amalitela igosi akaebe ha n'ụlọikpe

    Otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Labour Party' ebidola igosi ihe akaebe ha n'ụlọikpe gbasara akwụkwọ ha gbara megide mpụtara ntuliaka 2023.\

    Dịka ya bụ ikpe malitere n'ụlọikpe mkpegharị n'ụtụtụ taa bụ Fraịde, abalị abụọ nke ọnwa June 2023, ọkaiwu na-anọchite anya LP bụ Livy Uzoukwu kwuru na ha ga-aga n'ihu n'iwepụta ihe akaebe ha bụ nke ha malitere n'ụbọchị nke gara aga. Uzoukwu kwukwara na ọ bụ ọkaiwu Peter Afuba ga-ahụ maka iwepụta ihe akaebe ndị a.

    Ihe akaebe ndị a bụ akwụkwọ 'Form EC8A', bụ akwụkwọ e ji edekọ mpụtara ntuliaka n'okpuru ọchịchị dị icheiche.

    Cheta na n'ụbọchị ikpe gara aga, LP wetara 'Form EC8A' nke okpuru ọchịchị 15 na Rivers Steeti, nakwa nke okpuru ọchịchị ndị ọzọ na steeti dị icheiche.

    Ọkaiwu Afuba kwuru sị: "Anyị na-egosi ụlọikpe akwụkwọ 'form EC8A' nke si na steeti abụọ ndị anyị malitere ụnyaahụ ya bụ Rivers na Niger Steeti."

    "N Rivers steeti, anyị na-egosi mpụtara ntuliaka nke okpuru ọchịchị isii, Bonny, Oyinbo, Ahoada-East, Okirika, Eleme, na Abua-Odua. Na Niger Steeti, anyị nwere akwụkwọ 'formm EC8A nke okpuru ọchịchị Bida."

    Ndị ọkaiwu Inec, APC, na Bola Tinubu kwuru na ha ekwenyeghị n'ihe akaebe ahụ ndị LP nyere ụlọikpe, mana ụlọikpe gara n'ihu nabata ha.

  16. Etu e siri buru ikpe PDP gaa ụbochị abụọ nke ọnwa Juun

    Ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka n’Abuja nụrụ ikpe mkpesa PDP maka ntuliaka 2023.

    Ndị ọkaiwyu nọchịchị ndị ikpe a metụtara gbakọrọ n’oge, n’ebe elekere atọ nke ehihe Tọọzde a bụ abalị mbụ nke ọnwa Juun, 2023.

    Ndị ọkaiwu a gụnyere:

    • Chris Uche. SAN (PDP)
    • Kemi Pinheiro. SAN (INEC)
    • Chief. Akin Olujimi. SAN (Bola Ahmed Tinubu)
    • L.O Fagbemi (APC)
    • Chris Uche. SAN (Labour Party)

    PDP kpọpụtara ndị akaebe mmadụ atọ iji mee mkpesa maka okwu ebubo nrụrụaka ha sị mere n’oge ntuliaka 2023.

    Ụlọikpe nabatara akaebe nke mbụ kwuru na o si Kogi steeti ma bụrụ onye rụrụ ọrụ dịka onye nnọchịteanya PDP n’oge ntuliaka ahụ.

    Onye ọkaiwu Inec bụ Abdullahi Aliyu weere ọrụ inyocha ya ka a mara na ihe o na-ekwu abụ eziokwu.

    Onye akaebe ahụ gara n’ihu kwuo okwu n’aha pati ahụ ma kọwa na n’oge ntuliaka ọ gagharịrị na ọgbọ ntuliaka karịrị 20 n’okpuruọchịchi Olamaboro nakwa Lokoja nke Kogi steeti ma nọrọ lee anya n’aha pati ya ihe dịka nkeji atọ ruo ise.

    O kwuru na ọ na ndị ọrụ Inec manyere ụfọdụ ndị ndị nnọchite pati ha ka ha binyeaka n’akwụkwọ ndị eji tụọ vootu nke e digharịrịla ụfọdụ ozi n’ime ya ma mee nrụrụaka.

    Onye akaebe nke abụọ wepụtakwara mkpesa ya mana ọkaiwu APC rụrụ onye abụọ aka ma kwuo na okwu ọnụ ya yiri ihe onye akaebe nke mbụ kwuru kpọm kwem nke mere ha jiri na-enyo okwu ọnụ ya enyo.

    O zọrọ isi onwe ya site n’ikwu na nke a nwereike idi ire n’ihe ha abụọ nwere mkparịtaụka banyere ihe mere ụbọchị ahụ tupu ikpe ahụ amalite.

    Ndị ọkaikpe nụchara mkpesa ha ma yigahria ikpe ahụ gaa ụbọchị Fraịdee abalị abụọ nke ọnwa Juun.

    PDP ga-akpọpụta ndị akaebe nakwa ihe akaebe make mkpesa.

    Cheta na n’ọnwa Febrụwarị mgbe Inec kpọpụtara Bola Tinubu dịka onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa ma nyekwa ya asambodo mmeri, Atiku Abubakar, PDP, Peter Obi, Labour Party nakwa mmadụ abụọ ọzọ - Solomon Okangbuan nke pati Action Alliance (AA), Nnadi Charles Osita nke 'Action Peoples Party (APP), na Chichi Ojei nke pati Allied Peoples Movement (APM) - kwuru na ha ekwenyeghị na mkpọpụta ahụ Inec mere.

    Ha na-ekwu na usoro ntuliaka ahụ ezighi ezi ma na-ebo ebubo nrụrụaka.

  17. A amalitela ịjụwa ndị akaebe PDP ajụjụ n'ụlọikpe

    Ikpe mkpesa ntuliaka ndị PDP amalitela.

    Ndị ọkaiwu ajụwala ndụ akaebe bịarala PDP ajụjụ.

  18. Eyigharịala ikpe Labour Party gaa ụbọchị abụọ nke Juun

    Ụlọịkpe mkpesa ntuliaka nụrụ mkpesa otu Labour Party taa bụ ụbọchị mbụ nke ọnwa Juun.

    Ọkaiwu Labour Party bụ Emeka Okpoko butere mkpesa ha n’ihu ụlọikpe ahụ.

    Ụlọikpe ahụ gbarụrụ ihe maka ụfọdụ ndahie aka ndị ọkaiwu mere n’okwu Labour Party dịka a chụgharịchiri ha azụ ihazigharia ya.

    E mechara nụrụ mkpesa maka okwu a nakwa ihe akaebe a sị si Rivas steeti bụ steeti a na-ebo ebubo nrụrụaka n’oge ntuliaka 2023.

    Ka ha hazighariri ya bụ mkpesa, ha butere ihe akaebe si okpuruọchịchị 15 bụ ( Andoni, Emouha, Ahoada West, Asari toru, Khana, Ikwerre, Opobo-Nkoro, Tai, Gokana, Akoku-Toru, Etche, Ogi Polo, Omuma, Ogba-egbema Ndoni, Degema.

    Agbanyeghi na ndị ọkaiwu Inec, APC, nakwa Bola Tinubu jụrụ ka e mee nke a, ụlọịkpe nabatara ya ma nụrụ mkpesa ndị a.

    Ọkaiwu Labour Party bụkwa Okpoko butekwara mkpesa si Benue steeti gụnyere okpuruọchịchị Gwa-East, Ogbadibo, Kwande, Burukwu, Konshisha, Agatu, Makurdi, Ohimini, Ukum, Gboko, Oju, Katsina-Ala, Logo, Vandekia, Oturukpo, Tarka, Gums, Obi, Apa, Shongo, Ado, Gwei-West, Okpowu.

    Ụlọịkpe nabatara ya ma nụrụkwa mkpesa si ụfọdụ okpuruọchịchị na Niger steeti gụneyre Agaie, Agwara, Borgu, Bosso, Chanchanga, Edatti, Gbako, Gurara, Katcha, Kontangora, Lapai, Lavun, Magama, Mashegu, Mokwa, Paikoro, Rafi, Rijau, Shiroro, Suleja, Tafa, Wushishi.

    A gakwara n’ihu nụrụ mkpesa si okpuruọchịchị 20 na Osun steeti gụnyere Aiyedaade, Ife South, Egbe dare, Odo otin, Irepodun, Obokun, Boluwadare, Iwo, Ede South, Oriade, Ifedayo, Olorunda, Ejigbo, Orolu, Irewole, Ola Oluwa, Isokan, Boripe, Aiyedire, Osogbo.

    Mkpesa ọzọ Labour Party bukwa bịa bụ mkpesa si okpuruọchịchị 16 na Ekiti steeti bụ Ekiti west, Ise/Orun, Ikere, Oye, Ijero, Ekiti East, Moba, Irepodun/Ifelodun, Ilejemeje, Ado Ekiti, Ido-Osi, Efon, Ikole, Gbonyin, Ekiti south-west, Emure.

    Ka a nụchara mkpesa ndị a, Okpokpo nyefere ogbo ya bụ Awa Uma Kalu ohere ịnye nkọwa n’okwu ha.

    Ọkaikpe ndị nọ n’isi ikpe a, nabatara mkpesa ha, gbaa izu ma kpebie iyigharị ikpe a gaa ụbọchị Fraịdee abalị nke abụọ n’ọnwa Juun.

    Nke a ga-aga n’ihu n’elekere itoolu nke ụtụtụ.

    A ga-anụzị mkpesa otu Peoples Democractic Party (PDP) n’elekere atọ nke ehihe Tọọzde a.

    Cheta na dịka Inec kpọpụtara Tinubu dịka onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa ma nyekwa ya asambodo mmeri, Atiku, Obi, nakwa mmadụ abụọ ọzọ - Solomon Okangbuan nke pati Action Alliance (AA), Nnadi Charles Osita nke 'Action Peoples Party (APP), na Chichi Ojei nke pati Allied Peoples Movement (APM) - kwuru na ha ekwenyeghị na mkpọpụta ahụ Inec mere.

    Ha na-ekwu na usoro ntuliaka ahụ ezighi ezi ma na-ebo ebubo nrụrụaka.

  19. APC na Inec ekweghị ịnabata akwụkwọ akaebe ndị otu pati Labour nyere ụlọikpe

    Ọkaiwu ndị INEC, APC, Tinubu na Shettima sị na ha "agaghị anabata akwụkwọ. Ndị APC sị na ha "jiri obi ha niile jụ ya bụ akwụkwọ"

    Ọkaiwu Okpoko nyekwara ụlọikpe akwụkwọ ndị a EC8A si okpuruọchịchị 18 na Krọs Riva steeti (dịka Obubra, Odukpani, Boki, Yala, Bekwara, Kalaba Municipal, Obudu, Obalinku, Kalaba Saut, Ikom, Abi, Yakurr, Biase, Ogoja, Bakassi, Etunga, Akpabuyo, Akamkpa)

  20. Ihe mere ndị ọkaiwu APC jiri bara ndị ntaakụkọ mba n'ime ụlọikpe

    Cheta na n'ụbọchị 31 Mee 2023, ndị ọkaiwu otu pati Labour gwara ndị ọkaikpe na-anụ kpe ha ka ha bugharị ikpe ha gaa ụbọchị mbụ n'ọnwa Juunu.

    Onye ọkaikpe asi ha na ha ga-agụnyere ha ụbọchị Mee 31 ka ọ bụrụla ha ụbọchị abụọ n'ime ụbọịchị 21 ha bụ ndị ọkaikpe nyere maka ikpe a.

    Ndị ọkaikpe ajụọ ndị ọkaiwu APC, na ndị ọkaiwu Tinubu ma nke ndị Inec ma ha kwere na mbugharị a, ha asị "ee".

    Ndị otu patị Labour sị na ha yọrọ maka mbugharị a maka onye ọrụ ha ejighị ahụ.

    Ndị ọkaikpe si ka ha gatu oge ezumike nke nkeji iri.

    Ka ha gara ya bụ ezumike nkeji olenole a ka ndị ọkaiwu APC bidoro bawa ndị ntaakụkọ mba.

    Iwe ndị ọkaiwu APC bụ na na ha sị na ụdị isiokwu ndị ntaakụkọ na-ebu amasịghị ha.

    Ha bidoro jụwa ndị ntaakụkọ ihe mere ha jiri buru isiokwu sị na "ụlọikpe ekweghị nụ ikpe otu Pati Labour n'ụbọchị Mee 31", ebe ọ bụ na ndị Labour bụ ndị yọrọ ka ebugharịala ha ikpe.

    Ndị ọkaiwu APC dịka iwe o jitu ha.