Ndubuisi Egbo: Anaghi m aga Champions League igwu egwu

Aha onyonyo, Okwu Emmanuel Egbo maka Champions LEAGUE 2020
Mgbe e biputara ya

Ndubuisi Emmanuel Egbo gbaara Naịjirịa bọọlụ n'otu Super Eagles, mana ihe aha ya ji ada ụda ugbua bụ na ọ bụrụla onye Afrịka mbụ du otu egwuregwu bọọlụ Yurop aga asọmpi Champions League.

Otu bọọlụ Maazị Egbo na-akụziri bụ k.T. Tirana, emeela ka ndị otu ya soro na ndị ga-achịpụya na Champions League nke afọ 2020/2021.

Na mkparịtaụka a, ọ gwara BBC Igbo etu o si akwado asọmpi ahụ nakwa usoro ọ na-ele anya ga-enyere ya aka iburu iko Champions League ahụ.

Gee ya ntị n'uju.

Ndị mere akụkọ a bụ Jessica Nwankwo na Chiemela Mgbeahuru.