Oseala: Lee etu e si ahazi ofe ndị Igbo anaghị e si n'ọkụ mana ọ na-atọwa ntị
Igbo nwere ọtụtụ nri dị iche iche ndị mmadụ achọpụtabeghị nakwa ọtụtụ nke ndị mmadụ chefurula.
Otu n'ime ha bụ ofe Oseala.
Gịnị bụ ofe Oseala?
Oseala bụ ofe ndị Igbo na-eri n'oge ugani (oge enweghị nri maọbụ ego e ji azụta nri).
Anaghị e si Oseala n'ọkụ. Aha ọzọ a na-akpọ ya bụ ofe nsala a na-esighị n'ọkụ.
Oriaku Chioma Nzekwe toro na mgbe gboo gwọọrọ anyị ofe oseala ma gwa anyị na ọ na-tọwa nti.
N'okwu ya, ọ sị "Ị riwe Oseala etu o si atọ ụtọ, ị nwerike iji ya rie efere ụtara atọ."
Ọ bụrụ na agụụ ji gị maọbụ inweghị ego nakwa oge isi ofe n’ọkụ, Oseala ga-agbapụta gị.
Ngwa nri e ji e si ofe Oseala
- Ose
- Ogiri Igbo
- Nnu
- Crayfish
- Mmiri ọkụ
- Akwụkwọ Utazi
- I nwerike itinye ya crayfish nnukwu akpọrọ Oporo, azụ, dịka i si chọọ.
- I nwekwara ike itinye ya uda na oziza, sụkọọ ya na 'Crayfish'.
Odo na aka Odo ka e ji e si Oseala.
Etu e si agwọ ofe Oselala
Sachaa Odo na aka Odo ọfụma
Sachaa ose tinye n'ime Odo
Saa 'Crayfish' tinye
Tinye Ogiri Igbo
Tinye uda na mkpụrụ uziza nwantịtị ma ị chọọ.
Sacha akwụkwọ ụtazi tinye n'ime Odo
Tinye obere nnu
Tinye obere mmiri ọkụ
Nwere aka Odo chikọta ngwa nri niile a n'ime odo
Nri egheela ooo! Ọ kwa ọ na-atọwa ntị?
Ụfọdụ obodo na-akpọ ofe Oseala aha dị iche iche dka ofe Ngwe, ofe Nchichi wdgz.