New Kidnap Law: "Iwu a gosiri na gọọmentị enweghi obi ebere"

Aha onyonyo, New Kidnap Law: "Iwu a gosiri na gọọmentị enweghi obi ebere"
Mgbe e biputara ya

Ọ bụ n'ụbọchị Wenezde ka Ụlọọmeiwu Ukwu nke Naịjirịa tinyere iwu ga-eme ka onye ọbụla kwuru ndị ntọ ụgwọ mgbapụta gaa nga afọ iri na ise.

Nke a bụ mgbanwe ọhụrụ etinyere n'iwu kpuchiri iyindụegwu nke ala Naịjirịa.

BBC Igbo gbara ụfọdụ mmadụ ajụjụ ọnụ gbasara nke a iji mara etu ha sị nabata ya bụ iwu.

Onye mbụ agbara ajụjụ ọnụ kwuru na iwu a gosiri na gọọmentị enwegi obi mmadụ.

O kwuru na tupu ewebata iwu dị etu ekwesiri ịwụlite ọnọdụ nakwa ngwa nchekwa n'obodo.

O gara n'ihu dụọ ha ndụmọdụ ha mee ka ndụ ndị mmadụ nwee ugwu

"Mgbe ọbụla ka anyị na-anụ na mmadụ nwụrụ, mmadụ nwụrụ, o nweghizi ihe e ji ya(ndụ) kpọrọ, ọ dịghị mma!"

Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a sị na iwu a gosiri na ndị omeiwu enweghi obi ebere ebe mmadụ nọ.

Onye nke atọ kwuru na iwu ahụ enweghi isi na ọdụ

"Ọ bụrụ na ndị ntọ jide onye nke m, m kwụọ ụgwọ a tụọ m nga?" ka ọ jụrụ

O kwukwara sị "ihe nke ahụ nwekwara ka ọ dị".

Na ngwụcha o kwuru na gọọmentị kwesiri itinye anya n'idozi obodo n'ihi na ọ bụrụ na obodo dị mma ohi, ntọ na mpụ ndị ọzọ ga-ebelata.

Gịnị ka iwu ọhụrụ a kwuru?

Iwu a nke ndị ụlọọmeiwu binyere aka na ya abụchaghi iwu ọhụrụ, ọ bụ iwu mgbanwe iwu Naịjirịa kpuchiri iyindụegwu dịbụ adị.

Ihe ọhụrụ etinyere na ya bụ na onye ọbụla kwuru ndị ntọ ụgwọ mgbapụta ga-aga mkpọrọ afọ iri na ise.

Ha nyekwara na ndị ntọ ọbụla ejidere ga-aga nga mkpụrụọka maọbụ a maa ya ikpe ọnwụ maọbụrụ na onye ahụ nwụọ.

Iwu a na-abịa n'ihi ndị ntọ na-akpa mkpa mkpa na mpaghara ugwu Naịjirịa kemgbe ihe ruru afọ iri.

Nsogbu a ewerekwaala ndụ puku kwuru puku mmadụ.