Onweghị mgbe m kwuru ka a ghara ili nwaanyị ajadụ n'obodo anyị - Igwe Ogbeke Agbani

Mgbe e biputara ya

Onye igwe na-elekọta Ogbeke Agbani dị n'Enugwu Steeti Igwe Okechukwu Nwobodo Egbune ekwuola na onweghị Oge ya jiri kwuo na agaghị eli ozu Elizabeth Egbuna nwụrụ anwụ.

Mkpụrụ ụbọchị ole ma ole gara aga ka ụlọ ọrụ na ekwuchitere ndị mmadụ ọnụ ha bụ Women's Aid Collective (Wacol) degara gọọmenti na ndị uweojii akwụkwọ were bọ igwe ahụ ebụbo na ọmachiri ha ili ozu nwaanu ahụ n'ihi na ha na azọ ala.

Dịka ozi Women's Aid Collective (Wacol) si kwuo, mazi Chizi Ani bu onye ya na nwaanyị ahụ na-azọ ya bụ ala.

BBC Igbo gara hụ igwe ahụ n'obi ya, ebe okwuru na ya bụ ebubo nke na efegharị na Soshal Midia bụ asị.

Mazi Chizi Ani dugharịrị BBC Igbo na ya bụ ala na-ese okwu, ebe anyị chọpụtara na ọ bụ maka ala ga abụ okporo ụzọ na Ebube okwu.

Nwa ya bụ nwaanyị nwụrụ anwụ bụ Chiamaka Egbune kwuru na ka mgbe Gọmenti na ndị uwe ojii batara n'okwu ahụ, na Igwe ahụ enyela ha ikikere ili nne ha.

Igwe Egbune na mazi Chizzy Ani na gochara aka n'ụkwụ ha na ha ekwughikwa ka aghara ili onye nwụrụ anwụ.