You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee ka i ga-esi kwado dịka nwaanyị nwere ahụ ma bụrụkwa elelebe eje ọrụ - Chigul
Njike na nhazi na-abụkarị nsogbu nye ọtụtụ ụmụnwaanyị nwere ahụ ibu.
Nke a na-eme ka ụfọdụ n’ime ha na-enwe obi ịda mba mgbe ọbụla ha chọrọ ịkwado pụwa ọrịrị.
Nwaada Chioma Omeruah bụ onye eji Chigul mara, bụrụkwa nwaanyị nwere ahụ enweghi ụdị nsogbu a. Ejiji ya na-apụkarị ọkụ na soshal midia.
N’onyonyo a, Chioma kọwara ka nwaanyị nwere ahụ kwesịrị isi jikee ejiji ya, kwadoo onwe ya ọfụma iji gosipụta akụkụ ahụ ya mara mma ma zokwaa ebe ndị ọzọ ha na-achọghị ka ndị mmadụ hụ.
Ọ kọwakwara obere maka ndụ ya, agụmaakwụkwọ ya, etu o si too nakwa etu o si banye n’ọrụ ime ejije nakwa ịkpa ọchị.
Ndị na-akpa ọchị anabatala Chioma n’ọrụ ha mana n’ọrụ ịkpa ọchị, enwebeghi ọtụtụ ụmụnwaanyị nọ na ya.
Chioma kwuru na ọ bụ maka etu ndị ezinaụlọ nwaanyị ahụ nakwa ndị enyi ya si akatọ ha.
O nyekwara ndụmọdụ etu ụmụnwaanyị ndị ọzọ dịka ya ga-esi abata n’ọrụ ịkpa ọchị a.
Onye bụ Chioma Omeruah?
Chioma bụ bụ nwaafọ Anambra bụ nwa nke abụọ ọchịagha Samson Omeruah.
Ọ nwere ụmụnne atọ. Ọ bụ onye ama ama dịka onye na-akpa ọchị, ọgụ egwu nakwa onye na-eme ejije.
Ọ meela ọtụtụ ejije na Nollywood ma gụkwaa ọtụtụ egwu.
Mana kedụ onye Chioma bụ tupu ndị mmadụ a mara ya?
Tupu Chioma abụrụ onye ọ bụ taa, ọ gbalịrị ịgụ akwụkwọ ịbụ ọkaiwu na mba US mana ọ mịtaghị mkpụrụ.
O si na nke ahụ gafezie na ịgụ asụsụ French nakwa asụsụ ndị ọzọ dịka asụsụ Italy, Hindi, Fulani nakwa ndị ọzọ o ji aka ya kuziere onwe ya.
Ka Chioma nọchara afọ iri na abụọ na mba US, ọ lọtara Naịjirịa wee bidozie akaọrụ ya ọ na-arụ ugbua.
Chioma enwetala ọtụtụ nhọpụta dịka ọkaibe n'ime ejije nakwa ịkpa ọchị.
Onye mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo.