Juju Stories: O nweghị onye Anambra obi kara ịpụta nwalee ike chi ha kwenyere na ya
Gbenga Adewoyin bụ nwoke na-agagharị ụfọdụ ebe na Naijirịa achọ onye ga-ekwe nwalee ya site n'ime ihe iribama nke gbadoro ụkwụ n'okpukperechi ha.
Adewoyin gara Anambra steeti ma dịka ihe onyonyo a gosiri, enweghị onye pụtara nwalee ya.
Adewoyin na-ekwu kwa na onye mere ihe iribama a ga-erite nde Naira abụọ na ụma.
Onye bụdị Gbenga Adewoyin?
Gbenga Adewoyin bụ nwa okoroọbịa Naijirịa dị afọ iri abụọ na anọ.
Adewoyin kwuru na ọ nweghị chị ọbụla o kwenyere maọbụ ọ na-efe.
O kwuru na okpukpere dị iche iche na-ebute ọtụtụ nsogbu na Naijirịa bụ ihe mere o jiri bido ịmaaka a ọ na-ama.
Gịnị mere Gbenga Adewoyin jiri bido ije a?
Naijirịa bụ mba ọtụtụ ndị kwenyere n'ịkọ ọgwụ na ihe ndị ọzọ yiwere ya.
Ọtụtụ mgbe ka akụkọ gbasara ndị egburu maọbụ jide ndị si na ha ji ndị ha gburu agwọ ọgwụ ego.
Nsonso a ka ejidere ụmụnwoke atọ ndị gburu nwaagbọhọ dị afọ iri na asatọ ha sị na ha chọrọ iji akụkụị ahụ ya gwọọ ọgwụ ha ga-eji nweta ego.
Ụfọdụ ihe ndịa so n'ihe kpaliri mụọ Adewoyin nke mere ka ọ pụta sị, " Onye ọbụla ga-egosi m na e nwere ihe dịka mụọ maọbụ ọgwụ ga-erite ndị naira abụọ na ụma.
O kwuru na ọ bụ ndị mmadụ tụkọtara ego a ma sị na ọ ga-ewehachi ya azụ n'aka ndị nyere ya ma ọ bụrụ na-enweghị onye mere ihe iribama sitere n'okpukperechi.
Kedụ ebe gọọmentị kwụ maka okwu a?
Minịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na Naijirịa bụ Lai Muhammed na-ebo ndị ejije Nollywood ebubo na ọ bụ ihe ha na-egosi n'ejije ha kpatara ogbugbu ndịa.
Kama ndị na-eme ihe ejije na-ekwu na mịnịsta Mohammed kwesịrị itinye uche maka etu ndị ọchịchị dị iche iche , nne na nna na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị si etinye aka na nzulite ndị ntoroọbịa.