You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnennaya Onu death: Ihe mere n'ezinụlọ anyị bụ arụ - Nwanne onye e gburu ebe a na-azọ akụ
Juliet Onu bụ nwanne Nnennaya Onu, onye e gburu ebe ọ na-azọ akụ nna ha, akwaala arịrị maka ọnwụ nwanne ha.
Juliet kwuru na ọ bụrụ na ha nwere nwa nwoke, na ha agaghị agabiga ihe ha gabigara.
Ọ sị na ihe mere n'ụlọ ha "bụ arụ", na ọ "hụtubeghi ụdịrị ihe a".
Etu e si gbuo Nnennaya, gbaa ya ọkụ 'n'ihi akụ nna ya'
E gbukasịrị Nnennaya ma gbaa ya na ihe o nwere ọkụ maka ịjụ ase akụ nna ya n'Onicha Igboeze dị n'Okpuru Ọchịchị Ọnịcha, Ebonyi steeti, dịka ezinụlọ ya si kwuo.
Nne ya nakwa nwanne ya nwaanyị bụ Juliet Onụ na-ebo ebubo na ọ bụ ndị otu ezinaụlọ gburu nwada Nnennaya dị afọ 35 ma gbaa ya ọkụ n'ihi na ha kwuru na ha enwetala mmaja ugboro ugboro n'aka ụmụnne nna ha.
Akụkọ kwuru na a gbara nwaada ahụ ọtọ, tie ya ihe tinka tiri panụ, chaa ya mma ma sunye ya ọkụ n'ihi na ọ chọrọ ka e kenye ya oke n'ala nna ya.
Dịka nne nwaada ahụ bụ Oriakụ Onu si kwuo, naanị otu nwanne nwoke nwaada alụghị di nwere, nwụrụ afọ ole na ole gara aga, n'ụzọ edoghị anya, ebe otu nwanne nwaanyị o nwere lụọrọla di.
Christopher Onyekachi Okorie bụ onyeisi ngalaba gọọmentị na-ahụ maka nchekwa ikike dịrị onye bụ National Human Right Commission (NHRC), kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie.
Ọ sị, "E gburu ya n'anya ọcha, gbupụ ụkwụ ya ma tụọ ya ihe niile o nwere, mụnye ya ọkụ. Ọ gbachara nke bụ na onye hụ ya, ọ gaghị amazi ya."
"Ihe ọjọọ o mere bụ ịjụ ase ka e kenye ya oke n'ihe nna ya."
Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi bụ Loveth Odah n'ekwentị, o kwuru na isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ amaghị maka ya bụ okwu.
"Anyị amaghị maka ya, ha ewetaghịrị anyị mkpesa ọbụla. Ana m adụ ndị o metụtara ọdụ ka ha wega mkpesa n'ogige ndị uweojii dị ha nso."
Ozi dị mkpa: Foto onọdụ ọnwụ nwaada a na-agba anyammiri nke ọ dịghị mma iwepụta n'ọha.