Kidnapping in Enugu State: Etu e si jide nwaanyị echebu bụ onyeara a na-ebo ebubo ịtọrọ ụmụaka

Aha onyonyo, Etu esi jide nwaanyị echebu bụ onyeara na-atọrọ ụmụaka
Mgbe e biputara ya

Onyeisi Obodo Iji-Nike nke Enugwu Steeti bụ Chukwuemeka Anike ekwuola etu ha siri jide otu nwaanyị echere bụ onye ara kama ọ tọọrọla mmadụ abụọ n'obodo ha.

O kwuru sị, "Oruola ọnwa isii anyị na-achọ ndị na-eme ihe a n'obodo anyị".

Ọ kọorọ BBC Igbo na ihe dịka otu afọ gara aga n'obodo ha, na otu nwaanyị hapụrụ nwa ka ọ gaa saa ahụ ma mgbe ọ pụtara ọ chọpụtara na nwa ya dị naanị ụbọchị anọ efuola.

Anike kwuru etu ha siri jide ya bụ nwaanyị onye mechara kọọrọ ha etu o si atọrọ ụmụaka n'obodo ha ma onye ọ na-ersi ya na mpaghatra ugwo Naijirịa.

Ya bụ nwaanyị kwuru etu o si atọrọ ụmụaka ma ndị ọ na-eresị ha.

Ndị uweojii azabeghị ozi anyị zigara ha gbasara akụkọ a tupu akụkọ a apụta.

Lee ihe onyonyo ka ị nụ akụkọ ya n'uju.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: