International Day of Women Judges: Lee ụzọ ị ga-eso iji bụrụ ọkaikpe dika nwaanyị

Aha onyonyo, International Day of Women Judges: Lee ụzọ ị ga-eso iji bụrụ ọkaikpe dika nwaanyị
Mgbe e biputara ya

Ịbụ onye ọkaiwu bụ ọrụ nwere nnukwu nkwanye ugwu, mana itoru n'ọkwa ọkaikpe buzi nkwanye ugwu karịrị ibe ya.

Ụbọchị iri nke ọnwa Maachị n'afọ ọbụla bụ ụbọchị e wepụtara iji cheta umunwaanyị ndị ọkaikpe, ma jalite ụmụnwaanyị ndị na-eto eto ka ha nwee mmasị ịbanye na ya bụ ọrụ.

Oriaku Jane-Frances Ajah bụ ọkaikpe n'ụlọikpe nta Bekee na-akpọ 'Magistrate court' nke mpaghara Enugwu East, n'Enugwu steeti.

Ọ kọọrọ BBC Igbo usoro nwata nwaanyị chọrọ ịbụ okaikpe kwesịrị igbaso iji hụ na ya bụ ọkwa ruru ya aka.

Usoro e si abụ ọkaikpe:

Nke mbụ, Ọkaikpe Ajah kwuru na "onye chọrọ ịbụ ọkaiwu ga-abụ onye ịgụ akwụkwọ na-amasị, bụrụkwa onye na-eme ọfụma ọfụma n'agụmakwụkwọ ya."

"Onye ahụ ga-enwe mmasị na mmụta "English" nakwa 'Government'."

"Na mahadum, onye ahụ ga-enweta ọzụzụ ịbụ ọkaiwu. O mechaa, ọ ga-agakwa ụlọakwụkwọ pụrụ iche maka ndị ọkaiwu a na-akpọ 'law school'.

"Onye ahụ ga-etinyezi uchu n'ịga uloikpe ka o wee na-amata usoro dị icheiche dị n'ụlọikpe."

"Tupu mmadụ etoruo ọkwa ọkaikpe, onye ahụ ga-arụ ọrụ ọkaiwu ihe ruru afọ ise, afọ isii maọbụ afọ asaa."

Ọkaikpe Ajah kọwara na onweghi ịkpa oke ọbụla dị n'etiti ndị ọkaikpe umunwoke na ndị nke nwaanyị.

"Etu e si mee nwoke ka e esi eme nwaanyị, ihe e nyere onye ka a na-enye ibe ya," Ajah kwuru.

O nyere ndị nne na nna ndụmọdụ ka ha na-akwado ụmụ ha ndị nwaanyị ka ha bụrụ ndị ọkaiwu maka na ọ bụ n'ụzọ dị otu a ka ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị bụ ọkaikpe ga-gbagote.