International Day of Women Judges: Lee ụzọ ị ga-eso iji bụrụ ọkaikpe dika nwaanyị
Ịbụ onye ọkaiwu bụ ọrụ nwere nnukwu nkwanye ugwu, mana itoru n'ọkwa ọkaikpe buzi nkwanye ugwu karịrị ibe ya.
Ụbọchị iri nke ọnwa Maachị n'afọ ọbụla bụ ụbọchị e wepụtara iji cheta umunwaanyị ndị ọkaikpe, ma jalite ụmụnwaanyị ndị na-eto eto ka ha nwee mmasị ịbanye na ya bụ ọrụ.
Oriaku Jane-Frances Ajah bụ ọkaikpe n'ụlọikpe nta Bekee na-akpọ 'Magistrate court' nke mpaghara Enugwu East, n'Enugwu steeti.
Ọ kọọrọ BBC Igbo usoro nwata nwaanyị chọrọ ịbụ okaikpe kwesịrị igbaso iji hụ na ya bụ ọkwa ruru ya aka.
Usoro e si abụ ọkaikpe:
Nke mbụ, Ọkaikpe Ajah kwuru na "onye chọrọ ịbụ ọkaiwu ga-abụ onye ịgụ akwụkwọ na-amasị, bụrụkwa onye na-eme ọfụma ọfụma n'agụmakwụkwọ ya."
"Onye ahụ ga-enwe mmasị na mmụta "English" nakwa 'Government'."
"Na mahadum, onye ahụ ga-enweta ọzụzụ ịbụ ọkaiwu. O mechaa, ọ ga-agakwa ụlọakwụkwọ pụrụ iche maka ndị ọkaiwu a na-akpọ 'law school'.
"Onye ahụ ga-etinyezi uchu n'ịga uloikpe ka o wee na-amata usoro dị icheiche dị n'ụlọikpe."
"Tupu mmadụ etoruo ọkwa ọkaikpe, onye ahụ ga-arụ ọrụ ọkaiwu ihe ruru afọ ise, afọ isii maọbụ afọ asaa."
Ọkaikpe Ajah kọwara na onweghi ịkpa oke ọbụla dị n'etiti ndị ọkaikpe umunwoke na ndị nke nwaanyị.
"Etu e si mee nwoke ka e esi eme nwaanyị, ihe e nyere onye ka a na-enye ibe ya," Ajah kwuru.
O nyere ndị nne na nna ndụmọdụ ka ha na-akwado ụmụ ha ndị nwaanyị ka ha bụrụ ndị ọkaiwu maka na ọ bụ n'ụzọ dị otu a ka ọnụọgụgụ ụmụnwaanyị bụ ọkaikpe ga-gbagote.
