Etu ọgbakọ ndị ntorobịa Oraifite na 'Whatsapp' si rụọrọ nwaanyị ajadu nọ n'ọrịa ụlọ

Aha onyonyo, Etu ndị mmadụ si gbatara nwaanyị ajadu nọ n’ọrịa ọsọ enyemaka
Mgbe e biputara ya

Dịka ọtụtụ obodo na-enwe otu ebe ha na-akpa etu ha nwereike isi tinye aka n’imezi maọbụ kwalite mmepe obodo, otu ndị Oraifite egosila na ha pụrụiche.

Otu nwaanyị ajadu n’Oraifite, Anambra steeti natara onyinye ọma pụrụiche n’aka ndị ọmaghị na mbụ - Onyinye e nyere ya bụ onyinye ụlọ ọhụrụ.

Bonny Okonkwo bụ onyeisi ọgbakọ Oraifite Development Platform gwara BBC Igbo ka ihe si mee.

Ka o si kwuo, otu a tụrụ ego dịka ha si eme na mbụ chọọ etu ha nwereike isi nyere ndị mmadụ na be ha aka.

Ahọpụtara mmadụ anọ ndị ajadu ha ga-enyere aka nke gụnyere nwaanyị a na ezinaụlọ ya.

Mgbe ha hụrụ ọnọdọ nwaanyị ajadu a nakwa etu ebe o bi dị, otu a nwere ọmịiko ma tụkọọ ego ruru nde anọ na ụma (4.4 m) n’abali ise maka atụmatụ inyere ya aka.

Dịka ndị otu nọ na mba ụwa dị ịcheịche, ha gbara izu maka ntụkọ ego a site n’ọgbakọ nke teknzu ebe ndị mmadụ na-agbasa ozi a na-akpọ Whatsapp.

Mana akụkọ atụmatụ a mechara fepụ fega mba Australia ebe o ruru otu nwoke obodo Oraifite ọzọ ntị.

Nwoke ahụ aha ya bụ Ezenwa Henry mere mkpesa nye otu a ka o jiri aka rụọrụ nwaanyị a ụlọ ahụ ma kwanye ihe ndị dị mkpa maka obibi n’ime ya.

Ha nabatara mkpesa ya ma kpebi na ha ga-eji ego ha tọkọrọ maka nwaanyị nwere mezie otu ụlọ akwụkwọ dara ada n'obodo ha.

Etu a ka nwaanyị a na ụmụ ya si hapụ ụlọ ha bi bụ nke dị ka mkpọ mkpọ ebe ma nata onyinye ụlọ ọhụrụ a a rụrụ ha.

Agbanyeghi na nwaanyị nọ n’ọrịa mgbe ndị a mere ihe, o kwuru na onyinye ahụ mere ka ndụ ya dị mfe ma nye kwa obi ọma.

Nwaanyị ajadu a mechara laa mmụọ n’aka ọrịa ji ya kamgbe afọ 2020 n’ọnwa Jenụwarị 2022.

Kirie ihe onyoonyo a ka ịhụ etu ihe a niile si mee n’uju.

Ndị mere akụkọ a bụ Chukwudi Okereke na Chiemela Mgbeahuru.