International Women's Day 2022: Nwaanyị a bụ nwaanyị kacha sie ike m ma - Daddy Showkey

Mgbe e biputara ya

John Odafe Asiemo bụ otiegwu a ma dịka Daddy Showkey gwara BBC Igbo etu mma nnukwu ya si bụrụ nwaanyị kacha sie ike ọ ma.

O kwuru na ọ bụ nwaanyị na-agaghị akwụkwọ zụpụtara ụmụ itoolu na mahadum.

Daddy Showkey kọrọla BBC Igbo akụkọ ndụ ya nakwa ka nne ya nke ukwuu si wee nye ndụ ya aka mgbe ọ gbapụrụ ụlọ n'oge o pere mpe.

N'ụbọchị ncheta ụmụnwaanyị a kpọrọ "International Women's Day 2022", Daddy Showkey kọwara na otu ihe na-ewute ya bụ na mma nnukwu ya adịghị ndụ hụ ka ọ bụ mmadụ nakwa onye a ma ama.

O kwuru na mama nnukwu ya na-agwa ndị mmadụ na ọ ga-abụ onye a ma ama n'ụwa.

Ọ gwara BBC Igbo maka ịhụnanya o nwere n'ebe nwaanyị ahụ nọ.

Gere ihe ọ gwara BBC n'uju ebe a.

Ndị mere akụkọ bụ Adline Okere na Vining Ogu.

Onye bụ Daddy Showkey?

  • John Odafe Asiemo a maara dịka Daddy Showkey bụ onye a ma ama dịka ọgụ egwu nke a kpọrọ "ghetto reggae".
  • A mụrụ ya n’ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọst afọ 1970.
  • Ọ bụ onye Olomoro dị n’okpuruọchịchị Isoko South nke Delta Steeti mana a mụrụ ya n'Ajagunle Legọs bụ ebe o toro.
  • E jiri egwu ya o bipụtara n'afọ 1995 bụ ‘welcome’ mara ya.
  • Daddy Showkey bụ onye gosipụtara egwu a na-agba masịrị imirikiti mmadụ nke a kpọrọ ‘galala’.
  • Site mgbe ahụ o bipụtara akwụkwọ egwu karịrị atọ n'aka Feline records.
  • Ọ lụrụ nwunye aha ya bụ Ebere Asiemo, ma mụta ụmụ anọ; nwoke abụọ na nwaanyị abụọ.
  • Nwunye ya bụ onye Ikwuanọ dị n'Abịa steeti
  • Showkey na-asụ asụsụ ise; ha bụ Bekee, Pidgin, Isoko, Igbo na Yoruba.

Site na mgbe o bipụtara ọpụrụiche egwu ya, ma nke a na-agba agba bụ galala, ọtụtụ ndị ọgụụ egwu ọzọ helitere isi ma bido iṅomi ya n'egwu nke ya.

Na mkparịụtaụka a, Showkey tinyekwara ọnụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ntoroọbịa, Ipob na ihe ndị ọzọ.

Kirie ihe onyoonyo a n'uju.

Ndị mere akụkọ a: Olufemi Gabriel, Adline Okere na Vining Ogu