Sam Ohuabunwa: Ma PDP nye ndị Igbo ikikere ọchịchị ma ha enyeghị ha, aga m azọ ọkwa ọchịch
Maazí Ohuabunwa bụ onye na-apụta ịzọ ọchịchị onyeisiala Naịjirịa nke na-abịa na 2023.
Ọ sị na ihe ya ji pụta ịzọ ọkwa ọchịchị isi ala Naịjirịa bụ ka ụmụakwụkwọ ibe ya n\ala Bekee si maa ya aka n'ihu.
Ọ okwuru na ya ma nsogbu ji Naịjirịa ma jidekwa ọgwụ ya.
Ọ sịkwa na ihe ji Naịjirịa dị ihe anọ; ụbịam, bụ nke ya ga-eji ịrata ọrụ mba ofe na Naịjrịa memilaa.
O kwuru na ọbụghị oke na ọrụ gọomentị ịwe ndị mmadụ n'ọrụ kama ọ oke na ọrị ndị abụghị gọọmentị.
Ohuabunwa sị na "ndi a anaghị akụzị ka e sị akụta azụ, ihe ha na nye bụ azụ".
Ọ sị na dịka onye nọ so n'otu ndị na-emepụta ngwaahịa dị icheiche na ya ma nsogbo ndi n'enye ọrụ.
Ọ sị na nsogbu Naịjirịa nke abụọ ya ga-ememila bụ mpụ.
Ohuabunwa sị na gọomentị ya, onye ọbụla mere ajọ ihe kwesiri ị ga mkporo.
Ọ sị na ọ bụ ataghị ndị mmadụ ahụhụ ka o kwesiri, mere mpụ na aghụghọ ji amabanye.
Onye bụ Sam Ohuabụnwa OFR?
Ohuabụnwa bụ nwaafọ Arochukwu n'Abia steeti amụrụ n'ọnwa Ọgụst 1950.
Ọ gụrụ maka ịkụ ọgwụ, burukwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa onye ji ego achụ ego.
Ọ bụ onye chọpụtara ma hibekwa Neimeth Pharmaceutical nakwa onyeisioche ndị Pharmaceutical Society of Nigeria.
A muru ya na Port Harcourt bụkwa ebe ọ gara akwụkwọ sekọnrị na Okrika.
Kedu ihe o jiri pụta ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjiria?
Sam sị na ọ bụ ihe ya hụru adịghị mma na gọọmentị Nịajirịa mere ya ji puta ka ya gbanwee ya.
Lee ya ka ị nụ ihe ndị ọzọ o kwuru