“Onye ọbụla na-ekwu na Naịjịria dara ogbenye enweghi anya ime mmụọ” – Rochas Okorocha
Rochas Okorocha, bụ onye na-anọchịte anya mpaghara 'Imo West' n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa, ekwuola na onye ọchịchị ọbụla na-ekwu na Naịjirịa dara ụbịam, bụ onye enweghị ọgụgụ isi ichepụta ihe.
Okorocha kwuru nke a na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a, dịka o kwupụtachara mmasị ya iso zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.
Nwamadị a chịburu Imo steeti dịka Gọvanọ kwuru na onwebeghị onye a ga-eji tunyere ya n'ime ndị niile kwupụtarala mkpebi ha ịzọ ọkwa a.
- Exclusive Interview: 'Ndị ritere ọkwa gọvanọ n'ụlọikpe ma n'ime obi ha na ha abụghị gọvanọ' - Rochas
- Rochas Okorocha na gọọmenti Imo steeti na-adụ aka n'ọnụ gbasara ndi bụ "unknown gunmen"
- Ihe mere Uche Nwosu taa - Rochas Okorocha
- Ndị niile Rochas Okorocha nyere ala na Ekwema Crescent gba aka - Gọọmentị Imo state
N'agbanyeghị ebubo nrụrụaka nke ndị ngalaba na-ebu agha megide mpụ bụ 'Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) na-ebo ya, Okorocha kwuru na egwu anaghị atụ ya.
Gbasara onye Igbo ịchị Naịjirịa, Okorocha kwuru na ndị Igbo anaghị akwado ndị nke ha.
N’okwu ya ọ sị: “Ndị Igbo amaghị etu e si akwa ụzọ”
Okorocha kọwakwara mmekọrịta dị n'etiti ya na Bola Ahmed Tinubu, onye bụ onyeisi oche pati All Progressives Congress (APC) si dị.
Gbasara etu o si hụta ọchịchị Naịjirịa nke ugbua, Okorocha kwuru na ya agaghị ekwupụta uche ya kịtaa, na ha ka nọ n’oche ọrụ.
Gịnị mere mkparịtaụka a ji dị mkpa?
Afọ 2023 bụ afọ Naịjirịa ga-eme ntuliaka maka ọkwa onyeisiala ga-anọchi onye nke na-achị ugbua bụ Muhammadu Buhari.
Buhari achịzuola afọ asatọ nke iwu Naịjirịa nyere mmadụ ikike ịnọ n'ọkwa Onyeisiala.
Ya mere na ihe niile banyere ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa ji asara oke ọkụ ugbua.
Mkparịtaụka BBC Igbo na Rochas Okorocha nwere rụtụrụ aka na mmasị ya ịzọ ya bụ ọkwa oche nakwa ihe ndị ọzọ banyere ọchịchị Naịjirịa.


