Emmanuel Nwodo: Lee nwokorobia ji mpi anụmana emepụta oche eze

Aha onyonyo, Emmanuel Nwodo: Lee nwokorobia ji mpi anụmana emepụta oche eze
Mgbe e biputara ya

Emmanuel Nwodo nwere ọnatarachị na-ekopu ụwa nke o kwuru nwerike iwulite omenaala Afịrịka.

Ọ gurụ akwụkwọ na mahadum Port Harcourt mana o jizi aka ya arụpụta oche ndị eze.

Ọ gwara BBC Igbo na ọ na-eji mpi anụmana emepụta oche eze.

N'ọnụ ya," ọ bụ na nrọ ka m hụrụ ebe m na-arụpụta oche eze ma pụtazia n'ihe rụwazie ya."

O kwuru na o na-egotekarị ngwaọrụ ya n'ahịa ebe a na-egbu anụmana.

O gosiri BBC Igbo etu o si emepụta ya bụ oche eze nakwa ọtụtụ mpi o ji arụ ọrụ.

Ihe mere Nwodo ji malite rụwa oche eze agbanyeghị na ọ gụrụ mahadum

Nwodo kwuru na mpi anụmana o ji arụ oche eze ga-eme ka ọmenaala ndị Africa tọọ atọ.

O kwuru na ọ dịghị mma etu ndị mmadụ si eche na ihe ọ na-eme bụ ihe arụsị.

Kama ọ dịmma ka ha hụta ya dịka ohere chi ya nyere ya iji kepụta ihe dị mma.

Ihe ndị ọzọ ọ kọwara di n'ime ihe nkiri a di ebe a.