Ndị Ugbawka bere akwa arịrị maka ọchịehi, Ogbodo, e gburu

Mgbe e biputara ya

Ezinaụlọ Peter Chukwuani bere akwa arịrị maka onye ọchịehi ha a sị ndị oji egbe gbagburu n'Ugbawka dị n'Enugu steeti n’ụbọchị Wenezde.

Ya bụ onye ọchị ehi bụ onye Awụsa, aha ya bụ Mohammadu Alarabe na Mazị Chukwuani n'arụ ọrụ n'obodo ahụ.

E lielarị Mohammadu onye ndị obodo ma dịka Ogbodo taa bụ ụbọchị abụọ nke ọnwa Febuwarị n'ebe a na-eli ụka Alakụba na-eli ozu n'Abakpa Nike dị n’Enugu steeti.

Otu nwanne nwaanyị Chukwuani na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na Ogbodo ka gbakechere n'ọrịa abalị abụọ gara aga.

Ọ sị, "Onweghị onye ga-echefuli Mohammadu (Ogbodo) ngwangwa n'ezinaụlọ a maọbụ n'Ugboawka niile gbaa gburugburu. Ọ naghị akpaoke ma ọlị".

Tupu ndị ekperima ahụ agbagbuo ya, Ogbodo nọ na-eti, "ehi a unu na-agbagbu bụkwa nke onye Igbo. Ọ kwa Mazị Peter Chukwuani Onyeabor nwe ehi a, ọ bụghị nke onye Fulani".

Nwaanyị ahụ gbaara BBC ama sị "Ogbodo bụ nwaanne anyị. Ọ nweere anyị niile ka ụmụnne ya".

Nwokorobịa ọzọ aha ya bụ Ike, bụ onye ya na Ogbodo na-arụkọ ekweghị ogbugbo dịka ọ na-etiwa akwa.

Ike sị na ọ bụ Ogbodo kuziere ya ịchị ehi kpọbatakwa ya ka o soro chịwara Maazi Chukwuani ehi.

O kwukwara na Ogbodo na enyetụkwa ya nri mgbe ụfọdụ.

N'aka ọzọ, nwunye Chukwuani na-akọwa na mgbe ha na-anụ ụda egbe na ya na di ya nọ n'ime ụlọ ha.

Ọ sị, "di m chọrọ ịgbapụ n'ezi, ọ bụ m jidere ya ka ọ ghara ị ga. Mgbe ha gbachara egbe pụọ, anyị hụzịrị Ogbodo ka ọ dịna n'okporo ụzọ".

Ọnwụ Ogbodo ka na-anwụ ndị Ugbawka akpata oyi n'ụdị na ọnweghị onye ọnụ nyere okwu.

Otu onye ụkọchụkwụ nwereike ikwuru BBC Igbo okwu bụ Pastọ Caleb kọwara ka o siri mee.

O boro ebubo na “ndị omekome ahụ na-agbafe mgbe ehi ndị ahụ kwuchiri ha ụzọ, mere ha jiri malite ịkwa ha mgbọ, were gbuo ehi iri na abụọ n'ime ha, gbukwuo onye chị ha”.

Caleb sị na Ogbodo bụ sọsọ mmadụ bụrụkwa enyi ọha.

Ka ọ dị ugbua, gọọmentị Enugu steeti site n'ọnụ Stephen Oruruo bụ onye enyemaka Gọvanọ steeti ahụ na mgbasaozi sị na ndị uweojii na-etinye anya na ogbugbu nwaadị a dị obodo ma dịka Ogbodo.

Cheta na nghọtehịe dị na-etiti ndị ọchịehi na ndị obodo na ndịdịa anyanwụ Naịjrịa nke mere ọtụtụ steeti dị ebe ahụ jiri machie ịchịehi n'ụzọ.

Akụkọ ga-amasị gị