Gọọmentị Abia steeti ebugala ngwaọrụ n’ụlọọgwụ Ndị Inya Abam

Mgbe e biputara ya

Ndị Inya Abam, obodo dị n’okpuruọchịchị Arochukwu n’Abia steeti pụtara mbụ na BBC Igbo na 2020 dịka obodo nọ n’ọchịchịrị.

Mgbe BBC gbara ebe ahụ, o nweghị ihe gosiri na o nwere gọọmentị ha nọ n’okpuru.

Ka BBC Igbo nyechara ha ohere iji hichaa ha anyammiri maka ụkọ enweghị ụlọọgwụ, mmiri, ọkụ ma ọ bụkwanụ ụzọ e sị aba be ha, gọọmentị Abịa steeti gbara ọsọ rụọrọ ha ụlọ ọnụ ukpuru anọ n'otu obi ebe a na-anabata ndị ọrịa.

Ka otu afọ a rụchara ya bụ ụlọ gachara, ọ nweghị ihe gosiri na ebe ahụ bụ ụlọọgwụ dịka akwa, okporo, ọgwụ, oche and ihe ndị ọzọ bụ njirimara ụlọọgwụ adịghị ebe ahụ.

N’ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwari afọ 2022, BBC Igbo gakwara ebe ahụ ịmata ka ihe si gbara kwuru, ihe a hụrụ ebe ahụ bụ okpokoro ụlọ.

Mana ngwa ngwa anyị gachara, n’ụbọchị 31 nke ọnwa Jenụwarị, 2022, Gọọmentị Abia steeti malitere ibuga ngwaọrụ na ya bụ ụlọọgwụ.

BBC kpọtụụrụ Kọmishọna Ahụike Abia steeti bụ Jonathan Osuji, onye kwuru na “anyị ebugala ngwaọrụ nke mbụ ụnyaahụ, nke abụọ ga-apụ taa”, bụ ihe ọ gwara BBC.

BBC chọrọ ka ọ mata maka nkwa ndị ọzọ gọọmentị kwere ndị obodo a n'ajụjụọnụ anyị gbara ha n’afọ 2021, mana Kọmishọna abụọ anyị kpọrọ ekweghị ekwu okwu.

Kirie ka o siri gaa na Ndị Inya Abam mgbe BBC gara ebe ahụ.