You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ogbambọ: "Etu m si kpụgharịa ụgbọala a site na ntuziaka m hụrụ na nrọ"
Nonso Ofor bụ onye Oraifite n'Anambra Steeti kwuru na o ji aka ya rụpụta ụgbọala a nke wuru ewu na soshal midia.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọ sị na ihe ndị ọzọ ọ na-arụ gụnyere ihe e ji egwu mmiri, ncha nakwa efere e ji asa ahụ a kpọrọ "Jacuzzi".
Ofor sị na o ji injine ụgbọala Venza hazigharịa ụgbọala dị ka ụgbọala "Rolls Royce Phantom".
Ọ sị na amamihe o jiri mee nke a si na ihe e gosiri ya na nrọ mgbe ọ na-ehi ụra, na e nwekwara ọtụtụ ụgbọala a na-egosi ya nke ọ na-arụbeghi.
N'olu ya " M na-arụ ụra, a na-egosi m ọtụtụ ụgbọala na nrọ, mana m pụta n'ihe rụọ ya, o gosipụta ihe ahụ m hụrụ na nrọ."
O kwukwara na ewezuga ingine ahụ, ihe ndị ọzọ nille gbasara ụgbọala a bụ aka ka o ji rụọ ya.
Ofor sị na ọ chọpụtara na ọ bụ ihe ọ na-arụpụta n'aka ya bụ ihe na-enye ya ego.
O kwuru na akụrụngwa o ji arụ ụgbọala a bụ ihe ndị o nwetachara na Naịjirịa ebe a.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị akwụkwọ Sekọndịrị ka ọ gụrụ tupu ọ gawa igba bọị ma chọtazie akaraka ya.
Ofor kwuru na o si Legọs steeti ebe ọ rụpụtara ụgbọala a buru ya bịawa Ọwụwa Anyanwụ.
N'ikpeazụ ọ sị "Obi dị m ụtọ na ndị mmadụ nabatara ihe m na-eme".
Gere ihe o kwuru ebe a n'ujụ.