Exclusive: Uche Nwosu akpọọla aha ndị ọrụ gọọmentị Imo steeti aka ha ndị na nwụchi ya

Mgbe e biputara ya

Uche Nwosu bụ ọgọ nwoke Rochas Okorocha agwaala BBC Igbo ihe mere ya n'ụbọchị ụka.

O kwuru na ọ nọ n'ime ụlọụka, ndị bu egbe kpuchiri ihu ha abata n'ime ebe ahụ gbaliwe egbe elu.

Ọ kpọkwara aha ndị gọọmentị Imo steeti ọ sị na aka ha dị na nwuchi ya.

Mana Oguwike Nwachukwu na-ekwuchitere gọọmentị Imo steeti zara ihe Nwosu kwuru si uya chee ihu n'ihe gbasara ya.

O kwuru ka Nosu kwụsị ịkpọpụta aha ndị mmadụ na-ekonukọ okwu.

"Nwosu kwesiri ịkwụsị ikwu okwu ga-eme ka ọnọdụ ya kawanye njọ" ka Nwachukwu kwuru.