Arụgharị Central School ewetala ọṅụ nye ndị Obioma n'Enugwu
Arụgharịala Ụlọakwụkwọ Central School Obioma dị n'Okpuruọchịchị Udi, Enugu steeti nke ndị obodo niile na-enwezi aṅụrị ugbua.
Ya bụ ụlọakwụkwọ dakasiburu adaka oge gara aga nke kpatara na ụmụ akwụkwọ na-agụ akwụkwu n'iro.
Nwa afọ obodo Obioma bụ Prince Ike Chioke jiri maka ahụhụ ụmụ akwụkwọ na-ata wepụta onwe ya wee rụgharịa ụlọakwụkwọ ahụ niile.

Mazi ike Chioke kwuru na ebum n'obi ya bụ ka onye ọbụla nwee ohere igụ akwụkwọ dị mma na primari nakwa sekondari.
Ndị soro kpee ekpere ma gbaa ama mmepe ahụ bụ nwunye gọvanọ Edo steeti bụ Betty Obaseki nakwa Auxilliary Bishop nke Enugwu katolik diocese bụ Bishop Ernest Obodo.
Kedụ mgbe arụrụ Central School Obioma?
Ndị Obodo nyere ụka Katọlik ala ebe ha uru ụlọụka St. Theresa's Catholic Church na 1937.

Ebe foto si, Ike Chioka
Ha malitere ịka ụka nakwa ịgụ akwụkwọ na-ebe ahụ na 1941 n'otu ogoglo ụlọ e ji okwute ruo.
Ha na-aka ụka na ya ụbọchị ụka jiri ya mere ụlọakwụkwọ site na Mọnde rụọ Satọde.

Ebe foto si, Ike Chioke
N'ime afọ 1947 ruo 1949, ya rụnye ha ụlọ ọzọ n'akụkụ.
Ndị ụka mechere hapụru ụmụakwụkwọ be ahụ na 1996 gawazia ebe ha ruru nnukwu ụlọụka.
Nke bụ eziokwu bụ na ụloakwụkwọ ahụ adakachabeghị ka ndị ọzọ anyị na-ahụ, mana o ọdịghị ka ezigbo ụlọakwụkwọ.
Otu ahụ ka ọ dị ruo n'afọ 1996 mgbe ndị obodo tụrụ ego were gbanwee gbamgbam ya.

Ebe foto si, Ike Chioke
Prince Ike Chioke tọrọ ntọala ịrụgharị ya n'ọnwa Septemba 2021, rụchaa ya na Disemba.

Ebe foto si, Ike Chioke
O kwuru na a ga-agbape ya na Febuwari 2022.

Ebe foto si, Ike Chioke
Onye bụ Prince Ike Chioke?

Ike Chioke bụ nwafọ Obioma n'Okpuruọchịchị Udi n'Enugu steeti.
Ọ gụrụ "Civil Engineering" na Mahadum Obafemi Awolowo dị na Ọshụ steeti bụ ebe ọ nwere 'first class", gụkwaa na Mahadum nke Oxford na-ebe ndị ọzọ.
O so na ọkaibe na ihe gbasara achụmnta ego na akụ na ụba (Investment Banking) bụ nke mere ka ọrụọ ọrụ na-ebe dị iche iche nke gụnyere Arthur Anderson, Goldman Sachs, Salomon Smith Barney Inc nakwa Citigroup.
Ụrọọrụ ọrụ ndị a dịcha na mba ofesi.
O tinyekwara aka na "Media" nakwa "Telecommunication."
Ọ bụkwa onyeisi n'ụlọọrụ Afrinest West Africa Ltd, nakwa Issuing House of Nigeria, Anambra state Investment Promotion and Protection Agency (ANSIPPA) na ndị ọzọ.
O sokwa na Soludo Transition Committee.
Lee ihe onyonyo gbasara Central School Obioma ebe a.