You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ebonyi State News: 'Di m gbahapụrụ m makana a mụrụ m ejima ma waa afọ ịmụpụta ha'
Amaka Chinwedu kwuru na mgbe di ya chọpụtara na ọ dị ime ka ọ malitere gwawa ya na usoro ịmụ nwa nke aga-awa afọ nwaanyị bụ ihe arụ n'obodo ha.
Ka o si kwuo "Mgbe m di ime nke mbụ ka di m gwara m na ndị obodo ha bụ Igbo-Etche anaghi anabata ya ka nwaanyị si na usoro iwa afọ mụọ nwa."
Nwaada Amaka kwuru na ka chi ya si zọọ ya n'ime nke mbụ ya na ọ mụghị ya site n'usoro iwa afọ.
O kwukwara na mgbe di ya chọpụtara na ọ dị ime ejima, oge ahụ ka nsogbu ha malitere nke gụnyere na ọ malitere tibe ya ihe kwa mgbe kwa mgbe.
Nke a bụ dịka o kwuru na ịmụ ejima bụ ihe arụ n'obodo ha.
Ndị uweojii nọ n'Ebonyi state kwuru na anabatala mkpesa a ma na-elebaya anya.
Gere ihe ndị ọzọ o kwuru n'uju ebe a.