Nnamdi Kanu trial: Etu ikpe Nnamdi Kanu si gaa n'Umuahịa taa

Mgbe e biputara ya

Ụlọikpe ukwu dị n'Ụmụahịa, Abịa steeti ekwuola na ha ga-ekwupute ụbọchị a ga-ekpebi ikpe Nnamdi Kanu.

Jọstis Benson Anya bụ onye nọ n'elu ikpe ahụ, kwuru na a ga-eme ka ndị niile ikpe ahụ metụtara mara ụbọchị a ga-ekpebi ya bụ ikpe Kanu.

Cheta na e sibu n'ụbọchị 21 nke ọnwa Septemba yigharịa ya ruo ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba; tupu e tinye ya n'ụbọchị 10 nke ọnwa Disemba 2021.

Ọkaiwu Kanu ma bụrụkwa onye gbara akwụkwọ a n'ụlọikpe bụ Aloy Ejimakor, kwuru n'ajụjụọnụ a gbara ya sị na ọ na-aja ndị ọkaikpe Abịa steeti mma dịka ha kpere ikpe a ọsịsọ.

Ejimakor kwukwara na afọ juru ya na mpụtara ya bụ ikpe.Dịka o si kwuo, ọ dịịrị ụlọikpe ukwu ide akwụkwọ mkpebi ikpe ha, tụmadị ụlọikpe kachasị bụ ndị nwere ikike inye mkpebi ha ozugbo.

O kwuru na ya na ndị ọkaiwu ndị otu ya na-echebiri ikpe ahụ mgbe ọbụla ha ji mechaa.

Ka ikpe Nnamdi Kanu si gaa n'ụlọikpe dị n'Umuahia.

Ọkaiwu ya bụ Aloy Ejimakor gwara onye BBC Igbo na ndị ọrụ nchekwa anọghịzi ya ka ha sị anọbụ mbụ.

Ọ kọwara etu ikpe ahụ ga-esi ga ma kwuo na e nwere "partial compliance" na ndị ọrụ nchekwa idebe iwu nke ụlọikpe nyere.

Ihe ọzọ Ejimakor kwuru bụ na a na-atụ anya na ndị ọkaiwu na-anọchị anya gọọmentị etiti ga-ewepụta akwụkwọ ndị ha ji akwado ikpe ha.

Ejimakor sị na ndị ọkaiwu gọọmentị rịọburu ụlọikpe mbụ ka enyeso ha oge ha ga-eji wepụta akwụkwọ ndị ahụ.