Faith Okebata: 'Ọku ndị agha Naịjirịa mụnyere n'ụlọ m n'Izombe gburu nwunye m' - Sunday Okebata

Aha onyonyo, 'Ndi agha Naịjirịa mụnyere ọkụ n'ụlọ m n'Izombe gbagburu nwunye m'
Mgbe e biputara ya

N'ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọktoba 2021, ndị agha Naijirịa na ndị ntoroọbịa nwere ọgbaghara n'obodo Izombe dị n'Imo steeti.

N'ime ọgbaghara ahụ, ndị agha Naịjirịa abụọ na otu onye ntoroọbịa nwụrụ.

Ndi obodo kwuru na ka nke a mechara, ndi agha bịara n'igwe were gbawa ụlọ ndị mmadụ ọkụ aghara aghara.

Ka ọgbaghara kwụsịrị, ihe karịrị ulọ 40 rere ọkụ.

Nwunye Sunday Okebata bu Faith Okebata so na ndị merụrụ ahụ n'ọgbaghara ahụ dịka ọkụ gbara ya ebe ọ na-agba mbọ ịzọpụta nne di ya na ụmụaka ya n'ụlọ ha.

Maazi Okebata sị na tupu ọ nwụọ, nwunye ya gwara ya na ọ bụ ndị agha Naịjirịa mụnyere ọkụ n'ụlọ ha

Ndị agha Naịjirịa apụtala kwuo n'aka ha adịghị na mwakpo a, mana ndi obodo sị na nke ahụ bụ asị ọcha.

BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnu ndị agha kpọmkwem, mana ha asaghị ajụjụ anyị jụrụ banyere ihe a kemgbe e zigara ha ozi.

Kirie akụkọ ihe mere ezinaụlọ Maazị Okebata n'ọnụ ya.