You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enugu state news: 'Anyị atụtụtaghị otu mkpụrụ ihe n'ọkụ gbara n'ahịa Afor Iwollo Oghe'
Ndị na-azụ ahịa n’Afor Iwollo Oghe dị n’okpuruọchịchị Ezeagu nke Enugwu steeti akpọola oku ka a gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ọkụ gbara ihe ruru ụlọahịa iri abụọ (20) ọkụ ebe ahụ n’ụtụtụ Satọde, abalị abụọ nke ọnwa Ọktoba.
Ụfọdụ ndị ahịa ahụ gwara onye ntaakụkọ BBC Igbo okwu, kwuru sị na ha atụtụtanwughi otu mkpụrụ ihe n’ime ọkụ ahụ malitere ịgba ebe elekere abụọ nke isi ụtụtụ.
Oriakụ Caroline Onyigbo kọwara etu ya na ụmụ ya si jiri ndụ ha pụta na ya bụ ọkụ.
O kwuru sị "Mụ na ụmụ m nọ na-arahụ ụra mgbe isi anwụrụ kpọtere anyị. Mgbe m mepere ụzọ m hụ na ọnụ ụlọahịa m na-agba ọkụ, m wee tiwe mkpu ma kpọrọ ụmụ m gbapụ ezi.
Nkeji ole na ole gara ebe anyị na-eti mkpu enyemaka, mana enweghi onye bịakwutere anyị dịka ọkụ ahụ malitere ịgbapịa ụlọahịa ndị ọzọ."
Oriakụ Blessing Ezi kwuru sị na ya na di ya bịawara ozugbo ha natara ozi na ọkụ na-agba ebe elekere abụọ nke isi ụtụtụ a.
Ezi na-ere ọgwụ na ihe ntecha kwuru na enweghi otu mkpụrụ ihe ha tụtụtara n'ime ọnụ ụlọahịa ya.
O kwukwara na ọ bụ n'ọnụ ụlọahịa nke ya ka ụfọdụ ụmụntorobịa gbatara ọsọ enyemaka nọ menyụọ ya bụ ọkụ ma kwụsị ya ịgbapịakwu ọnụ ụlọahịa ndị ọzọ.
Ruo ugbua, amabeghi ihe kpatara ọkụ ọgbụgba a.
Ndị na-azụ ahịa ebe ahụ kpọkuru gọọmentị Enugwu steeti nakwa nke okpuruọchịchị Ezeagụ ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihi na ọ bụ ebe ahụ ka ha si eri nri ma na-elekọta onwe ha.
Gere ihe ha kwuru n'uju: