Anambra News Today: APGA akatọọla ogbugbu Ezenwa Nwokenagu na Nnobi

Aha onyonyo, Nnobi Attack: Ụmụnwaanyị abụọ so n'ime ndi oji egbe gburu ndi mmadu na Nnobi - Omenugha
Mgbe e biputara ya

Otu APGA ekwuola mwute ha maka ọnwụ otu onyeisioche ha bụ Ezenwa Nwokenagu so na ndị nwụrụ mgbe awakporo ha na Nnobi

APGA katọkwara oke mwakpo na-ebiri ọkụ n'Anambra ma kwuo na ọ bụghị agwa a ka e ji mara ndị steeti ahụ.

Emeka Ozumba bụ ọnụ na-ekwuchitere otu ahụ bụ onye depụtara nke a n'ozi itiakan'obi o zigaara ezinaụlọ na ikwu na ibe Nwokenagu.

Ozumba gwara ndị Anambra ha jụpụ mwakpo n'ụzọ ọbụla kama ha tinye uchu n'ịhọpụta onye ọchịchị dị mma na ntuliaka na-abịa.

Nwokenagu bụbu onyeisioche APGA ward 1 n'Uruagu Nnewi dị n'Anambra steeti tupu ọ nwụọ.

Ọzọ, Nelson Omenugha bụ onye na-ahazi otu “Youths Earnestly Seek Soludo (YESS) gwara BBC Igbo etu o siri gbalahụ ọdachị n’aka ndị oji egbe wakporo obodo Nnobi dị n’Anambara Steeti, n'ụbọchị 26 nke Septemba 2021.

Dịka Maazị Omenugha siri kwuo, ọ bụ n’ihu ya ka ụmụnwaanyị abụọ yi uwe ojii wụrụ mmanụ ọkụ n’ụgbọala ya nakwa nke ndị nchekwa obodo wee mụnye ya ọkụ.

Ọ sịkwa na ya hụrụ ndị nchekwa obodo abụọ e gburu na mwakpo ahụ.

Ọ sị: “Ka anyị nụrụ ụda egbe aghara aghara, anyị hapụrụ ụgbọala m gbaba ebe anyị gara zoo. Anyị nọ ebe ahụ were na-ahụ ihe na-eme.”

Omenugha kwuru na ọ bụ ụgbọala ya na nke ndị nchekwa ka a gbara ọkụ n’ebe ahụ, ma kwukwa na o nwere ụgbọala ọzọ a gbakwara ọkụ n’obodo ahụ nke mere ha atọ.

“Ndị mụnyere ọkụ nọ ebe ahụ hụ na ọkụ ahụ gbawara ọfụma tupu ha apuọ.”

Ọ sị na ya chebu na ọ bụ sọ egbe ka ndị ahụ na-agba mana o tụzịrị ya n’anya oge ha bịara kụwaa enyo ụgbọala ya ma malite ibupu ngwo ngwo dị n’ime ya.

“Ọ tụrụ m n’anya makana a chọbụrụ m ịgbatu oche ụgbọala ahụ zoo n’ime ya.”

Maazị Omenugha, dịka ọ na-ekele Chukwu maka etu o si jiri ndụ ya pụta n’ọdachi a, sị na ọ metụtara ajọ ihe na-eme n’Ọwụwa Anyanwụ ugbua.

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambara Steeti bụ Tochukwu Ikenganyia ịmata ihe ndị uweojii ma maka ihe mere mana ọ sị na ya enwetebeghị ozi banyere ya.

Maazi Ikenganyia mechara binye aka n’akwụkwọ mgbasaozi nke kwuru na ndị omekome ji ụgbọala Sienna nakwa nke a kpọrọ Shuttle Bus gburu mmadụ atọ na Nnobi n’ụbọchị 26 nke ọnwa Septemba.

Akwụkwọ ọzị ndị uweojii kwuru na mwakpo a mere dịka ọ fọrọ nkeji iri abụọ ka ọ kụọ elekere asatọ nke abalị.

Ndi uweojii sị na ọ bụ n’ụzọ Afọ Nnobi ka mkpa mkpa a kpara.

Ha kwukwara na mmadu atọ nwụrụ na mwakpo a, gụnyere Johnbosco Ojukwu dị afọ 33, Rapuluchukwu Ugoeze dị afọ 30 nakwa Chukwuemeka Nwokebagu dị afọ 31.

Maazị Ikenganyia, n’akwụkwọ ahụ o binyere aka, sị na onyeisi ndị uweojii n’Anambara bụ Tony Olofu ezipụla ndị uweojii kara aka ka ha malite nnyocha ma chọpụta ndị kpara ike a.

Dịka Maazị Omenugha siri kọwara n’okwu ya, ọ bụ ndị ọrụ nchekwa obodo nọ n'ụgbọala Sienna a gbara ọkụ ka ndị omekome ahụ gburu.