You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enugu State: Ọ bụ eziokwu na nwoke gburu nwunye ya n'ihi efere nri n'Enugu?
Ụlọ ntaakụkọ Punch dere akụkọ n'ụbọchị Fraịde nke ha kwuru na nwoke ji aka tigbuo nwunye ya n'Enugwu n'ihi na nwaanyị ahụ enyeghị ya nri.
Akụkọ ahụ kwuru na nwoke ahụ ṅụrụ mmanya wee lọta were aka tigbuo nwunye ya.
Mana BBC Igbo agaala n'ogbe ebe ya bụ ihe mere wee mee nchọpụta.
Nchọpụta anyị gosiri na di nwaanyị ahụ a na-akpọ Mama Goodluck, etighi ya ihe ma ncha.
Ndị ha na ya bi n'otu ụlọ kwuru na ọ bụ eziokwu na di nwaanyị ahụ na-etibu ya ihe n'oge mbụ, mana o metụghị ya aka n'ụbọchị ahụ ọ nwụrụ.
Otu onye gwara anyị sị: "Ọ bụ n'ime abalị ka Mama Goodluck malitere ịkwasi ụkwara ike, ma sị ka e nye ya mmiri."
"Ọ na-ekwu na obi na-afụ ya ụfụ. Iku ume ya adịchaghị mma."
"Otu onye wetere mmmiri nsọ nye ya, mana o nyeghị aka. Onye ọzọ wetara mmanụ ojukwu, onye ọzọ kwa wetara 'olive oil', mana enweghị nke rụrụ ọrụ."
"Anyị mechara chọta keke wee buru ya gawa ụlọọgwụ."
Onye ọzọkwa gwara BBC na ụdị ihe emebuola nwaanyị ahụ n'ahịa n'oge gara aga.
Ọ sị na nwaanyị ahụ dara n'ime ahịa dịka ọ na-ere ahịa, mana ndị mmaọ̄ụ gbakọrọ gbawa ya mmiri tupu o nweta onwe ya."
Nwaanyị ọzọ bi n'otu ụlọ ahụ kwuru na Mama Goodluck na-enwekarị ọnọdụ ọbara mgbalielu ma ọ dị ime.
Ndị niile BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ọbụghị eziokwu na ọ bụ di nwaanyị ahụ ji aka kụgbuo ya.
Mana ka ọ dị ugbua, ndị uweojii bịara kpụrụ nwoke ahụ gawa ụlọọrụ ha.
Adọnyela ahụ Mama Goodluck n'ụlọ ozu nke bekee na-akpọ 'mortuary'.