"Ụjọ ọnwụ ka na-atụ mama nnukwu m na-agbanyeghi na ọ karịrị afọ 100"

Mgbe e biputara ya

Mama nnukwu Rachael Uzor gbara ihe karịrị afọ otu narị na iri abụọ kọwara ihe ndị mere oji gbasie ike rute afọ ole a ọ dị.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Mama Uzor sị na ọ na-eri nri dịka une, ụkpaka, umeju anụ, nke nyeere ya aka n'ahụike.

Ụmụ ụmụ ya mere ka anyị mata na mama nnukwu ha na-atụ ụjọ ọnwụ na-agbanyeghi na o ruola afọ otu narị na iri abụọ (120 years).

Mama nnukwu mụrụ ụmụ anọ, ụmụ ụmụ iri abụọ na itoolu (29) na ụmụ ụmụ ụmụ iri anọ na asatọ (48).

Kirie ihe ọzọ Mama Uzor gwara anyị na ndụmọdụ o nyere ndị na-eto eto.

Chimezie Ucheagbo na Nnamdi Agbanelo rụpụtara akụkọ a.