Esemokwu ndị Navy na ndị Atani emetụtaghị ndị Ipob - Igwe Ngoody ndị Atani
Onye Eze na-elekọta obodo Atani dị n'Anambra steeti bụ Igwe Azuka Augustine Ngoody ekwuola na ebubo ndị IPOB boro ya na o ji ndị agha Navy kpụrụ ụmụ okorobịa IPOB n'Atani abụghị eziokwu cha cha.
Igwe Ngoody kọwaara BBC Igbo na ihe mere na Atani bụ na ndị na ekpo aja n'ikpere mmiri jụrụ ikwụzị ụtụ ụtụisi narị Naịra ise kwa tipa aja nke obodo guzobere maka mmezi obodo.
Ụmụ okorobịa ahụ butere ọgba aghara na Atani' nke na ha tiri ndị ichie ihe merụọ ha ahụ nke ukwuu.
Ngwa ngwa ndị uweojii bịara ikpe udo, ndị ahụ na-eme ọgba aghara napụrụ ha egbe na chụghachi ha azụ.
Iji gbochie ịkwafu ọbara mezịrị Igwe Ngoody na ndị isi obodo jiri kpọọ ndị agha Navy ha were kpụrụ ụfọdụ ndị isi aba okpu ahụ.
Igwe kwuru na naanị mkpụrụ ụbọchị abụọ ka ha nọrọ n'ụlọ nkpọrọ tupu ahapụzịa ha.
ya bụ ihe mere na ọnwa june 2021.
N'Okwu gbasara iresi ndị Fulani ọchị ehi ala, Igwe Atani kwuru na nke ahụ bụ okpotokpo asị.
Ọ kọwara na ọ bụ eziokwu na ndị Ochi ehi na-abịa n'ọhịa atani kwa mgbe kwa mgbe ịchụ ehị, mama onweghị mgbe ya resiri ha ala ma ọ bụ napụ mmadụ nke ya nye ha n'ike.
Ihe BBC hụrụ bụ na ndị na ekpo aja na arụ ọrụ ha dịka na mbụ.
Otu Onye ndị ichie Atani bụ chief Nwabueze kọwakwara na ọ bụ ndị ogwu aja nwere nsogbu wee gwaa ndị IPOB ka ha ghọta na onweghị mgbe Igwe Atani jiri nyefee ala ha na-aka ndị Fulani ochi ehi.
Igwe Agustine Ngoody dụrụ ndị otu IPOB ndụmọdụ ka ha na nyochaa ihe ọbụla ha nụrụ maka obodo ọbụla nke ọma tupu ha emee ihe ọbụla n'ihi na Igbo niile bụ otu ma na azọkwa maka ọdimma ndị Igbo.

