You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mathew Oliver Okpara: Etu ndị agha si gbagbuo nwanne m nwoke si ọrụ alata n'Imo steeti
Ndị bee Mathew Oliver nwụrụlanụ ka nọ n'obi mgbawa dịka Chris Okpara kọọrọ BBC Igbo etu ndị agha Naịjirịa batara Imo steeti si gbagbuo nwanne ha nwoke n'ụbọchị May 25,2021.
O kwuru na ndị unknown gunmen gara wakpoo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Orji ụbọchị ahụ nke mere ka ndị agha wuchie akụkụ ebe ahụ bụ n'akụkụ okporoụzọ Urata dị n'Orji gbawa egbe.
Okpara kwuru na otu onye agha ọkwa ya gbalitere apụtala rịọ ezinụlọ ha mgbaghara ma kwuo na ọ ga-agwa ndị isi agha maka ọdachị a.
Okpara kwuru na ruo ugbua ebubeghị ekwenti ya ọzọ dịka ọ kpọọla onye agha ahụ ka ọ mara ka ihe si kwụrụ.
Gere ihe o kwuru n'uju n'ihe nkiri a dị ebe a.