Thyroid disease: Ihe mere m jiri agba mbọ ka ndị mmadụ mata maka ọrịa a

Aha onyonyo, Ihe mere m jiri agba mbọ ka ndị mmadụ mata maka ọrịa thyroid
Mgbe e biputara ya

Iruoma Ofortube gbakere dịka ọ rịachara ọrịa thyroid (nke Igbo na-akpọ ọrịọ,maọbụ akị ọrịọ), bụ ọrịa ọtụtụ mmadụ aghọtaghị.

Ndị mmadụ na-akpasịkwa ndị bu ọrịa agwa na-ezighi ezi na Naịjirịa.

Ọ na-abụkarị amaghị maka ya na-eme ka ndị mmadụ na-asị na ndị na-arịa ọrịa bu amụosu.

Ofortube na-agbazị mbọ ime ka ndị mmadụ mata maka ọrịa ọfụma.

O hibere ngalaba na-agbasa ozi maka ọrịa ma na-akọwara ndị mmadụ maka ya nakwa na-eme ka ha nwete ohere ọgwụgwọ nakwa enyemaka ndị ọzọ ha chọrọ.

Ndị mere akụkọ a bụ Uche Akolisa na Oyeyemi Mustapha.