Isu Awa Village: Etu ọgba arụsi si zọọ ha ndụ n'oge agha Biafra
Mgbe e biputara ya
Otu onye nze n'obodo Isu Awa kọwaara etu ọgba arụsi dị n'obodo ha si zọọ ha ndụ n'oge agha Biafra n'afọ.
O mere ka anyị mata na ndị obodo Isu Awa na-enwelighi ike ịgbapụ gawa obodo ọzọ mgbe agha malitere gbagaara n'ọgba ahụ.
Ọ sị na ọ bụ n'okpuru ọgba ahụ ka ha nọ na-esi nri ha na-eri, na ha na-ezo ezo a ga-ewete nri n'ụlọ nakwa n'ọhịa.

Nna anyị ukwu a sị na ọ dị obere mgbe ahụ mana mgbe o tolitere ka a kọwaara ya banyere ọgba arụsị ahụ ọfụma.

Ọ rụtụkwara aka ebe ọzọ ha na-aga ekute mmiri ọṅụṅụ n'oge ahụ.
Kirie ihe o kwuru n'uju;
Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Ikechukwu Kalu

