You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu: Anyị na-ahazi etu dọkịta ya ga-esi hụ ya nke taa nke echi - Ifeanyi Ejiofor
Onye ọkaikpe n'ekwuchitere Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor gwara BBC Igbo ụbọchị Satọde na ha na-ahazi etu dọkịta Nnamdi Kanu ga-ezute ya kwam kwam.
Ọ sị na nke a bụ maka mmerụ ahụ nakwa obi ya ọ sị zara aza site n'ihe ọ gabigara n'oge a nwuchiri ya.
Ọ si na ọ bụ site na nnyocha ndi dọkịta na Kenya mere ka e siri chọta na obi Kanu zara aza. Ọ sị n'ezia n'aka ndị uweoji mba Kenya dị na nnwuchi Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob.
Na mkparita ụka a, o kwuru na nyocha ha mere na-egosi na a tara Nnamdi Kanu ahụhụ nke ukwuu, tịe ya ihe, ma tọrọ kwa ya site na usoro n'ezighi ezi.
N'okwu ya, o kwuru sị: "Oge n'abia mgbe anyị ga-agbapụ ndị mba Kenya afọ maka okwu nwuchi Nnamdi Kanu".
Cheta na mba Kenya agọrọla ukwụ na aka na ha adịghị n'ihe mere Nnamdi Kanu, ma sịkwa ka ndị sị n'aka ha dị wete akaebe.
Ọkaiwu Ejiofor gwara BBC Igbo na ha nwere akaebe, nke gụnyere onyonyo.
Maka njem Kanu, Ọkaiwu Ejiofor si na ọ bu nzukọ ka ọ gara tupu aka kpara ya ka ọ na-alaghachi mba Briten.
"Ọ bụ ihe a kpara akpa. Ha ma na ọ nọ ebe ahụ. Ọ bụ okwu ekwuru a na-ekwere n'isi."
Ọ kọwakwara BBC na ka ndị uweojii mba Kenya si nwuchie Nnamdi Kanu na ọdọ ụgbọelụ mba ahụ, jịbe ya ruo abali asatọ ma were aka ike meruchaa ya ahụ nke kpatara ahụike ji datuo.
Gee ntị n'ime akụkọ a.