Awka Dancing Traffic Controller: Achọrọ m ka ndị mmadụ na-enwe obi ụtọ, ka ụzọ na-aga ngwangwa' - Ifedioramma Chizoba
Mgbe e biputara ya
Ifedioramma Chizoba bụ onye ọrụ nhazi okporo ụzọ n'Aroma Junction dị n'Awka, Anambara steeti.
Ihe e ji mara ya bụ ịgba egwu n'ụzọ pụrụ iche dịka ọ na-ahazi okporo ụzọ iji mee ka ụgbọala na-aga werewere.
Ifediora kọọrọ BBC Igbo ihe kpatara o ji enwe obi aṅụrị oge ọbụla ọ na-arụ ọrụ ya, n'agbanyeghị na ụgwọ ọnwa a na-akwụ ya pere mpe.
O kwuru na ihe a na-akwụ ya kwa ọnwa bụ puku naịrịa iri abụọ (N20,000).
Ifediora bụ onye Isuofia, mana o bi n'Okpuno Awka, ọ lụọla nwaanyị ma mụọ ụmụ anọ.
Arịrịọ Ifediora na-arịọ gọọmentị Anamra steeti bụ ka e tinye ha bụ ndị 'Anambra State Traffic Agency' n'ime otu 'civil service' nke steeti ahụ.
Ndị mere akụkọ a bụ Chiemela Mgbeahuru na Chukwunaeme Obiejesi.