'Anyị na onyeisiala ga-enwe ọgbakọ ọzọ n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa' Ken Nnamani
Nwafọ Igbo ọzọ bụ Goddy Uwazuruike na-ekwu na akụkọ nke ya na "obi adịghị m mma na ya bụ ọgbakọ ha mere".
N'onu ya, "Ihe na-ewuzị n'ala Igbo ugbua bụ ị na-aga n'ụzọ ejide gị tukpuo n'ụgbọala sị na ị bụ onye Ipob". Ihe ndị Igbo na-achọ bụ na ndị a bịara ịzọgbụ ndị mmadụ n'ukwu n'ala Igbo bịa lawa ozugbo ozugb".
Ihe Ken Nnamani sọ na ya bụ ọgbakọ zara
Onye si na ya bụ ọgbakọ bụ Ken Nnamani bụ onye bụbu Onyeisi ụlọ omeiwu Sinetị site n'afọ 2005 ruo afọ 2007 sị na ya bụ ọgbakọ bụ ka ebelata aka na otu esi egb mmadụ n'ala Igbo.
Nnamani sị na ọ ka mma ịkpupu ndị a na-enyo enyo ụlọikpe karịa igbu ha.
O kwukwara na-ekwesiri ijide ndị ọchịehi na-ebu egbe agagharị ma maa ha ikpe dịka iwu kwesiri.
BBC Jụrụ ya ka ọ bụ na Onyeisiala amaghị na a na-emegbu ndị Igbo dịka ha na-eti na mkpu kemgbe.
Nnamani zara na ọ bụrụladị na onyeisiala amaghị ihe ndị a, na ha na ha nwere ọgbakọ ọzọ n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Jụụn bụ be ha ga-anọ kọwatara ya ihe niile bụ iwe ndị Igbo.
Ọ sị, "na ya bụ ọgbakọ ka anyị ga-edepụtara ya ihe niile anyị kpọrọ mmegbu ndị Igbo na-eti mkpu ya ebe ọ ga-edo ya anya".
Ọ sị na ọbụghị eziokwu na ọ bụ naanị ndị agha si Abuja bịa ya bụ ọgbakọ na-ekwukwa na ndị nkịtị nọkwa na ya.
Ọ sị maka ọrụ nchekwa n'ala Igbo na ihe ga-enyeaka bụ ịgba ama sita naka ndị mmadụ na-ọbụghị ikpote ndị agha ka ga na-abịa eyi ndị mmadụ egwu.
O kwukwere na ya na onwe ya kwusiri ike na ndị uweojii nke steeti na ọ bụghị ndị nche obodo.
Gbasara ebubo na ana akpụrụ ụmụ ntorobia Igbo na-egbu, Nnamani sị na ya ga-enyi ya ọnụ na ya bụ ọgbakọ ha ga-agba n'ụbọchị iri na itoolu nke ọnwa Juuna.
Nnamani siri na ha kwuru na ọgbakọ a nke gara aga na "'restructuring' ụzọ aga esi mee ka nsogbu a dị na Naịjirịa belata". Ọ sị na o buru na ahazigharịa Naijiria na ọ ga-enyeaka ndị ọbụla ị na-agbara onwe ha mbọ".
Ọ ji ohere a rịọ ndị Igbo ka ha nwee ndidi ma kwere na otu Naịjirịa maka ọ ga-akara ndị Igbo mma, "maka na dị Igbo juru ebe niile na-agba mbọ".