Nnamdi Kanu: Ihe Ipob sara Asari Dokubo maka ebubo ọhụrụ o boro onyeisi ha

Mgbe e biputara ya

"O nweghị mgbe ndị mmadụ ga-eji were Asari Dokubo tunyere Nnamdi Kanu."

Nke a bụ okwu si n'ọnụ Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru Ipob pụta.

Powerful kwuru nke a mgbe Ipob na-asa ebubo Dokubo boro Nnamdi Kanu na o na-eduhie ndị Igbo , ma jiri aghụghọ na-anara ha ego.

Powerful kwuru, " Onye ọbụla chọrọ ikweta ihe Dokubo kwuru, ya gaa n'ihu."

Anyị agaghị ekwe ka Dokubo megharịa anyị anya n'ihe anyị na-achọ.

Gere ihe o kwuru n'uju n'onyonyo a dị n'elu.

Asari Dokubo bụ onyeisi Biafra de Factor Customary Government kwuru na onye ndụ IPOB bụ Nnamdi Kanu abụghị onye na-anabata ihe ọma mmadụ mere ya.

O kwukwara na Nnamdi ebutela ịkpaoke n'etiti ya na ndị niile chọrọ itinye aka kwalite atụmatụ na ọganihu Biafra, ọ katọkwara agwa ahụ.

O kwu kwara na Nnamdi jị okwu ndị Igbo akpata ego, na onweghi aka ọrụ ọzọ o nwere.

Ọ dọrọ ndị Igbo aka na nti ma kwuo na Nnamdi abughi ezigbo onye ndu, na o bụ onye nachọ ọdịmma onwe onye nanị.

N'okwu ya, o sị na ndị Igbo kwesiri itụgharị uche na etu ha sị eso Nnamdi Kanu makana ọ naghị agwa ha eziokwu.

N'ọnụ ya, "ọ bụrụ na Kanu nyere m nde naịra iri abụọ, eji m akwụkwọ alakụba an̄ụ iyi ka Allah gbuo m"

O kwuru na ọ na-ewute ya na ndị Igbo na-adọnyere onye dịka Kanu ukwu.

Ọ sị na Kanu ga-eji aka ya gbuo onwe ya ma na-adọ ya ka na ntị na ọ ga-akwatụ ya makana ihe ọ na-eme agaghị eweta Biafra maoli.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: