South East Attacks: Etu ndị oji egbe si wakpoo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ojoto ma gbuo Inspector Peter
Mgbe e biputara ya
Otu onye obodo Ojoto nke dị n'Anambra steeti, akọorọla BBC Igbo etu ndị omekome siri wakpoo ụlọọrụ ndị uweojii nọ ebe ahụ.
Ọ sị na ndị oji egbe a gburu otu onye 'Inspector' n'ehihie ụbọchị Wenesde.
Ọ gaara n'ihu kwuo na na ndị oji egbe ahụ agbaghị ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ na mwakpo ahụ dịka ndị uweojii gbochiri ha.
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ Ikenga Tochukwu na-ekuru ndị uweojii, ọ zaghị ekwentị ya tupu akụkọ a na-apụta.
Kirie ya n'uju:


