IPOB: IPOB asaala ndị na-ere ịyabasị, "Nye anyị akara ọbaego unu"
Onye na-ekwuchitere ndị otu Ipob bụ Emma Powerful asaala ndị na-ere Ịyabasị machiri ire iyabasị n'ọwụwa anyanwụ maka ha kwuru na nkwa Nnamdi Kanu kwere ha na Ipob ga-akwụghachi ha iyabasị ha emebiri izuụka gara aga erubeghị ha aka.
Powerful kwuru na ha ga-akwụ ndị an-ere ịyabasị ụgwọ iyabasị ha niile emebiri.
Lee etu mkparịta ụka Emma Powerfulk na BBC Igbo siri gaa
Anyị jụrụ ya maka ihe ndị ugwu na-ere iyabasị na-ekwu na Nnmadị Kanu si na ọ ga-akwụhachi ha ego iyabasị ha e mebiri na mgbasa ozi ya?
Emma Powerful zara sị, "Eee, anyị ka nọ kwa na ya bụ okwu, anyị na-eche ka ha weta ego olee ihe niile emebiri."
O kwuru sị, "onye ọbụla mere ụdịri ihe a esoghị n'ihe anyị . . . ịwakpo ahịa maọbụ ụgbọala mmadụ bụ nri na ihe ndị ọzọ ndị mmadụ esoghị na ọchuchọ anyị, enweghị ihe ha mere anyị ya mere na ọnweghị ihe anyị ga-eme ha".
Ode akwụkwọ ndị ugwu na-ere iyabasị sị na ha enwetabeghị ya bụ ego
Emma Powerful kwuru sị, " Anyị ekpebiela na-anyị ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha emebiri, ha weta ihe a ga-eji kwụọ ha ya bụ ụgwọ ka anyị kwụọ ya. Ị mara ha biko gwa ndị nwe ya bụ ngwa ahịa ka ha kwuo etu ha chọrọ ka akwụọ ha ya bụ ụgwọ".
Ajụrụ ya maka ibu ndị ọzọ a na-ebo ndị IPOB ebubo imebi?
Emma Powerful zara sị, " Amaghị m maka ndị ọzọ, ọ bụ nke a ekwetere na ọ bụ ndị ọjọọ nọ n'ime ihe a na-eme kpara ya bụ arụ. Eziokwu, amaghị maọbụ ndị IPOB mere ya kama anyị na-akwụ ya bụ ụgwọ maka ụbọchị ahụ bụ ụbọchị udo eji nabata ụbọchị "Onye nọrọ n'ụlọ" iri atọ na otu nke ọnwa Mee.
O kọwara ka onye ọbụla hapụ iche na Ipob na-akwụ ya bụ ụgwọ maka na ọbụ maka Ipob kpara ya bụ arụ.
O kwu kwara sị, "nke a bụ iji gosi ndị mmadụ na anyị abụghị otu ọjọọ".
Onion traders: 'Anyị ahụbeghị ego Nnamdi Kanu kwuru ọ ga-akwụ anyị maka yabasi anyị a bụsara n'Imo'
Otu jikọrọ ndị Ugwu awụsa na-akọ ma na -ere ahịa yabasị a kpọrọ 'Onion Producers and Marketers Association of Nigeria' (OPMAN) ekpebiela na ha ga-akwụsị ibute yabasị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Odebeego otu ahụ bụ Ibrahim Haruna gwara BBC Igbo ụbọchị Tọzde na nke a bụ n'ihi na ndị otu Ipob zusara yabasị juru ụgbọala 'trailer' abụọ nke ego ya ruru nde naira iri abụọ ụbọchị ụka gara aga.
O kwuru na ndị otu ha nọ n'Ugwu Awụsa kpebiri ịkwụsị ibunye ha ahịa dịka onye ndụ otu Ipob bụ Nnamdi Kanu emejupụtaghị nkwa o kwere ịkwụ ndị emebiri ahịa ha ụgwọ ya.
Cheta na Nnamdi Kanu nọrọ n'ozi ọ gbasara n'abalị 31 nke ọnwa Mee, afọ 2021(31/5/2021) katọọ ndị wakporo ndị Ugwu bụ ịyabasị, ma kwe nkwa ịkwụ ha ụgwọ ya n'uju.
Gee ihe ndị a niile n'ihe onyonyo a: