You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Insecurity in Nigeria: Ịchịgharị ehi so bute nsogbu nchekwa na Naịjirịa - Nnolim Nnaji
Onye nnọchite anya ọgbọnta vootu Nkanu West n'ụlọomeiwu nta bụ Nnolim Nnaji ekwuola na ịchị ehi na-agagharị n'ọhịa so n'ihe butere ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa na Naịjirịa.
Nnoli sị na ịzụ ụmụanụ n'otu ogige nke Bekee kpọrọ 'Ranching' bụ ebe ụwa nọ ugbua.
Mana o kwukwara na onye chọrọ ime ya bụ 'ranching' ga-eji ego ọ ga-eji zụọ ala.
Nnaji gara n'ihu kwuo na ọgbaaghara niile na-eme na Naịjirịa bụ n'ihi enweghi ọrụ.
Ọ sị "ajọmmụọ na-ewere ọnọdụ n'obi onye ọbụla na-enweghi aka ọrụ".
Nnaji sịkwa na ya kwesiri ike na "izu ka mma na nne ji".
Nke ahụ pụtara na ọ kwadoro ọchịchị dị n'oke n'oke nke Bekee kpọrọ "region".
Ọ sị na e bupu ibu gọọmentị etiti bunyere onwe ya na ihe ga-aka mma.
Gee ọkpụrụkpụ ihe o kwuru n'uju.