You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ahụhụ ndị keke sị ha na-ata n'iji ịntanet akwụ ụtụisi keke n'Abia State
Ndị na-akwọ ọgbatumtum keke n'Abia Steetị akọwala ihe ha na-ahụ n'iji ịntanetị akwụ ụtụisi keke dịka gọọmentị Abia si nye iwu.
Ha kọwara na atụmatụ iji ịntanet akwụ ụtụisi keke dị mma mana ọghọm bụ na mgbe ụfọdụ aha gị agaghị apụta n'ịtanetị ma ị kwụchaa ụgwọ.
Nke a na-eme ka ndị ọtawaike na-ahụ maka ịkwụ ụgwọ a ji anwụchi keke ha ma mee ka ha kwụọ puku narị atọ.
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ kọmishọna mgbasaozi nke Abia Steeti, o kwuru na ọ ga-azaghachị n'oge na-adịghị anya.
Dịka akụkọ a na-apụta a ka na-ele anya ọsịsa n'aka gọọmentị Abia Steetị.
Cheta na gọọmentị nyere ndị ọkwọ ọgbatumtum keke niile ụbọchị abụọ idebanye aha ha n'otu ga-ejikọta ha ọnụ ma ọ bụghị ya ntaram ahụhụ ga-adịrị onye ahụ.