School Resumption Day: Ndị n'ọchị ndị n'akwa dịka ụlọakwụkwọ ga-eme ọzọ na 18 Jenuwarị

Mgbe e biputara ya

Na-agbanyeghị na ọnụọgụgụ ndị na-ebute nje coronavirus na Naịjirịa na-agbali elu, gọọmentị etiti ekwechirila na ụlọakwụkwọ ga-emeperịrịrị n'ụbọchị Mọnde na-abịa abịa.

Ọtụtụ na-ekwu na mkpebi a ekwesịghị ekwesị n'ihi na onweghị ihe etinyere iji gbochie mfesa ọrịa a.

Mana ụfọdụ na-ekwukwa na o kwesịrị ekwesị ka e mepee akwụkwọ n'ihi na o teela ụmụakwụkwọ nọ n'ụlọ.

BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị nne na nna ajụjụ ọnụ iji mata ihe ha chere.

Lee ya n'ihe onyonyoo dị n'elu.

Onye mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara.