Ndị be anyị napụrụ anyị ala di anyị oge di anyị nwụchara - Ụmụnwaanyị ajadu
Mgbe e biputara ya
N'obodo Ukehe di n'Enugwu steeti, ụmụnwaanyị ajadu atọ na-eti mkpu na ndị obodo ha gbawara ha aka ala dịka di ha nwụchara.
Ha kwuru na tupu a chụọ ha n'ala ahụ kpam kpam, ndị obodo na-ana ha nha dị icheiche.
Ha kwukwara na ndị obo gbuchara osisi niile dị n'ala ahụ nke na-enye ha ego ha ji akwado ndụ ha.
BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnu ndị na-achị obodo mana onweghi onye chọrọ ikwu okwu banyere ihe a.
Ministri na-ahụ maka ọdịmma ụmụnwaanyị n'Enugwu steeti tinyekwara ọnụ n'ihe a na-eme mana ihe na-ebe ka na-ebe.
Ndị mere akụkọ a bụ Chris Okereke na Chiemela Mgbeahuru.

