Awgu road accident: Ndị ihe mberede okporoụzọ metụtara ekuputela okwu maka ya

Mgbe e biputara ya

Wenezde 28th October bụ ụbọchị ndị Awgu n'Enugwu steeti agaghị echefu ọsịsọ.

Ọ bụ n'ehihe ụbọchị ahụ ka ụgbọala 608 bu ụmụakwụkwọ Presentation nursery and primary school dị n'Awgu ala n'ụlọ ha, na ụgbọala a na-akpọ "Low bed" eji ebu 'bulldozer' kụkọrọ isi n'ebe a na-akpọ Nkwo dị nso ụlọọrụ okpuruọchịchị ha.

Anyammiri na iru uju juru ezinaụlọ ndị ihe mberede a metụtara anya mgba BBC garuru ebe ahụ ịjụta etu ihe si mee.

Gee ihe ha kwuru n'uju.